Anambra @ 31: Ihe Agbanweela Nke Ukwuu

Anambra @ 31: Ihe Agbanweela Nke Ukwuu

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ agadi nwaanyị rị́á ugwu rị́á ugwu, o leghachi anya ebe o si malite, ebe ọ kwụ nà ebe ọ na-eje, wee mara ka ije siri gbata kwụrụ.

Ka ọ dị taa, Anambra na-emerùbe emume ncheta ọgbụgba ahọ iri atọ na otu e jiri kee ya. Ọ dị ncheta na ọ bụ n'Anambra Ochie e kere n'ahọ 1976 ka e siri mechaa kepụtá Anambra Ọhụrụ n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọgọstụ ahọ 1991.

Ka Anambra na-eme ọgbụgba ahọ iri atọ na otu taa, ọ dị mkpa ileba anya n'etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ dịka o siri metụta n'ụnyaahụ̀, taa na echi nke steeti ahụ. Ya bụ, ileba anya n'ihe ndị gbanwègòrò kemgbe ahụ e kepụ̀tara ya bụ steeti wee ruo taa, dịka ọ dị na ngalaba dị icheiche.


Usoro E Si Ewe n'Ọrụ n'Anambra Agbanweela

Banyere etu e si enye maọbụ ewe ndị mmadụ n'ọrụ oyibo n'Anambra, ihe adịghịzịkwa etu ọ dị na mbụ. N'oge mbụ, ọ bụ ihe doro anya na a na-elekarị anya n'ihu were enye ọrụ, ma e wezuga asambodo dị icheiche onye ahụ nwere, maka na ohere mmadụ inwete ọrụ gọọmenti oge ahụ na-adaberekarị n'onye onye ahụ mà, maọbụ onye ma onye onye ahụ mà. Mana ka oge na-aga, ihe ndị ahụ ji nwayọ na-agbanwè, gbanwegide, wee ruo etu ọ dị taa. 

Ka ọ dị taa n'Anambra, a na-emezịkwa ihe niile banyere iwè n'ọrụ oyibo n'usoro ọgbaraọhụrụ dijitalụ, malite na mbido ruo na njedobe, nke na a na-elekwasizị anya na ntozuoke onye ahụ ugbua karịa site n'onye ma onye maọbụ ónyé ónyé mà. Iwè n'ọrụ nkụzi ahụ e mere na nsonso a bụ ihe ịgba aka ebe.


 Mmepe Obodo:

Banyere ọnọdụ mmepe, nke bụ eziokwu bụ na Anambra adịghịzịkwa etu ọ dị mgbe e kere ya, maka na nwaanyị a lụrụ ọhụrụ anaghị adịzị ka ọ dị ma ọ rịgoro rịtuo.

Gọọmenti dị icheiche chịgoro Anambra gbara ọbara ole ike ha hà iji mee ka ya bụ steeti chawapụ, bụkwa nke ọchịchị nọ ugbua ka na-emekwa. Ọbụladị Awka bụ isi obodo steeti Anambra sokwa ekete òkè mmepe nke ya, n'agbànyeghị na e ruchabeghị ebe a na-eje. Ime obodo niile dị n'Anambra taa nwegbàdòkwara ihe akaebe, dịka ọrụ mmepe gọọmenti jupụtàrà na ha, wee na-egosi na ihe adịghịzị ka ọ dị na mbụ. 

Anambra enweghịbụ ọdụ ụgbọelu, mana ugbua, Anambra enweela ọdụ ụgbọelu mba ụwa, nwee ọtụtụ okporoụzọ ọhụrụ, nwekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji akwalite ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ.

Ọtụtụ ụmụafọ Anambra atụnyekwala ụtụ pụrụ iche n'ịkwàlite mmepe obodo site n'inyere gọọmenti aka n'ime ihe ụfọdụ, dịka ịrụ okporoụzọ n'ime-ime obodo; site n'ewumewu ụlọ obibi, ụlọọrụ, ọdụ ahịa, na ụlọ mmepụta ngwaahịa; site n'itinyesi ọkụ okporoụzọ, na site n'ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ. Ihe ndị a enyela aka n'ụzọ pụrụ iche ime ka Anambra chawapụ.


Oge Nke Deri Nwamama na Eddy Nawgu Agaala:

Ajọ ọnọdụ nchekwa so n'otu n'ime ihe na-echebụ steeti Anambra nnukwu aka mgba n'oge mbụ, ọkachasị dịka o siri metụta ịtọrọ mmadụ, izu ohi, igbu ọchụ na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ụfọdụ n'ime ndị omekome kpara ike oge ahụ gụ̀nyèrè Chiejina, Okwudili Ndiwe (Derico Nwamama); Edward Okeke (Eddy Nawgu), na ọtụtụ ndị ọzọ.

Arụrụala ndị omekome a mezịrị ọtụtụ ụmụafọ steeti Anambra ji gbapụ oge ahụ, ga biri na steeti ndị ọzọ ebe e nwere ọnọdụ nchekwa katụ mma. O mèkwàrà ka ọtụtụ ndị Anambra bi na mba ọzọ na-atụ egwu ịbàtà be nna n'Anambra oge mmemme Ekeresimesi, mmemme Ista, mmemme iri ji ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị Anambra oge ahụ na-anọzị na mba ndị ọzọ eme mmemme ịlụ nwaanyị maọbụ ụdị mmemme oriri na ọṅụṅụ ndị ọzọ, karịa ịbàtà Anambra, n'ihi égwù.

Ka ọ dị taa, ihe ndị ahụ abụrụla ihe gara aga, maka na ezi ọnọdụ nchekwa mèchààrà laghachi n'Anambra. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị omekome ndị ọzọ a maara dịka ‘Unknown Gunmen’ mèchààrà selìté isi ọzọ na nsonso a n'ime steeti ahụ ma yikwa ụmụ mmadụ egwu n'ụdị dị icheiche; mana aka ebiela ha n'ala ugbua, nke na gọọmenti achụọla ha ọsọ ụkwụ eru ala, ma mekwa ka udo na nchekwa tọrọ àtọ̀ laghachi ọzọ, dịka ọ dị na steeti ahụ taa. Taa Anambra enweela ezi ọnọdụ nchekwa.

Oge Ndọrọndọrọ Ọchịchị Tigbuo Zọgbuo Agaala:

Usoro ndọrọndọrọ ọchịchị tigbuo zọgbuo abụrụla akụkọ ochie n'Anambra. Dịka ọ dị n'oge mbụ, ntụliaka nhọpụta ọchịchị Anambra na-abụkarị nke ọgbaaghara na tigbuo zọgbuo na-ejupụ̀ta na ya, ma bụrụkwa nke ikpe kwùrú ikpe na-esikwa na ya apụta oge ọbụla e mechara ya, bụkwazị nke na-akpanye ụlọikpe, ndị ọkaiwu na ndị ọkaikpe ego n'ụba.

Ọ bụ tigbuo zọgbuo, ọgbaaghara, na ikpe kwuru ikpe jupụtàrà na nhọpụta ọchịchị Anambra oge ahụ mere ka steeti ahụ bụrụ steeti mbụ ebe e nwere nwaanyị mbụ bụrụ gọvanọ n'ala Nigeria, bụ Oriakụ Virginia Etiaba (n'ihi nchụtù n'ọkwa na mkpọghachi); mee ka Anambra bụrụ steeti mbụ ebe e nwere gọvanọ mbụ n'ala Nigeria chịrị naanị ọnwa atọ, bụ Maazị Andy Uba; ma bụrụkwa steeti mbụ ebe e bidoro ime nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ n'oge dị iche n'oge steeti ndị ọzọ n'ala Nigeria ji eme nke ha, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere ka Anambra bụrụ steeti e ji ama n'ihe gbasara ọgbaaghara na-esi n'ígwù okwe ndọrọndọrọ ọchịchị apụta.

Ọ dị ncheta na a na-enwekarịkwa ọtụtụ nkwafu ọbara na tigbuo zọgbuo n'oge mbụ ma e mebe ntụliaka n'Anambra n'oge mbụ. 

Ọ bụ Anambra bụ steeti mbụ n'ala Nigeria ebe ndị ntọ tọọrọ̀ gọvanọ nọ n'ọkwa ọchịchị (Maazị Chris Ngige, onye a tọọrọ n'ahọ 2003); ma bụrụkwa steeti mbụ n'ala Nigeria ebe ndị omekome gbara Òbí Gọọmenti (Government House) ọkụ; tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-asụ ntị wuru-wuru mere nà ọgbaaghara ndị ọzọ dapụtara n'oge ahụ na ngalaba igwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime steeti ahụ.

Kaosiladị, ihe ndị ahụ abụrụla akụkọ mgbe ochie na ihe gbanwere agbanwe, nke na a naghị ahụtazịkwa ihe dị etu ahụ ugbua ma e mebe nhọpụta ọchịchị, nke na-egosi na Anambra etoola. Nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ na nhọpụta ọchịchị ndị ọzọ e megoro na steeti ahụ na nsonso a bụkwa nnukwu ihe ịgba akaebe banyere nke ahụ.

E Jighịzị Ókpìrì Anakọ Ụtụ Isi n'Anambra:

N'usoro ịna ụtụ isi n'Anambra, ihe agbanwekwala. N'oge gara aga, ọ bụ okpiri osisi ka e ji achụgharị ndị mmadụ iji nata ha ụtụ isi, bụkwa nke ndị ntorobịa anya na-apụ̀ ọkụ na-eme.

Ọ bụ n'oge dị ka oge ahụ ka ndị ọnaụtụ ahụ jidere otu onye otiegwu ọdịnala a ma ama, bụ Maazị Perikoma Okoye n'Onịtsha oge o si njem alọta, wee chọọ iyi ya égwù nà iji ike anapụta ya ego ha sị na ọ bụ ụtụ isi. Kaosiladị, Perikoma gosiri ha na e jighị nkume elete isi kara aka, nke na oge ha buliri ya elu wee bugide ya ruo n'ebe isi ụlọọrụ ha dị, o kweghịzị ha mbutù, wee ruo mgbe ha nyechara ya ihe niile o kwuru na a ga-enye ya, tupu ọ rịtuo.

Ọtụtụ n'ime ha na-eme ihe a oge ahụ nà-ebugharị onwe ha dịka ndị ọrụ gọọmenti, mana ọ bụ n'akpa ha ka ha na-egbunye. Ha wee si n'ụzọ dị etu ahụ na-eyi ụmụ mmadụ égwù, ma na-ezufusi ego gọọmenti.

Ka ọ dị taa, ihe dị etu ahụ adịghịzịkwa n'Anambra, maka na gọọmenti enwogharịala usoro e si anakọ ụtụ isi. 

Ọbụladị ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ bụ ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo emeela ka a na-akwụzị ụtụ isi na ụtụ ndị ọzọ a na-akwụ gọọmenti site n'usoro ọgbaraọhụrụ dijitalụ (n'aka ụlọ ọba ego e weputara maka nke ahụ), nke bụ na a naghị akwụnyezịkwa mmadụ ọbụla ụtụ isi n'aka n'Anambra ugbua. Ọ machìkwara ihe ọbụla bụ ọrụ ndị Agbero (nke ọtụtụ maara dịka Agboro) na steeti ahụ. Ihe ndị a niile enyegokwa aka gbochie ụzọ dị icheiche ndị mmadụ si ezufusi ego gọọmenti, ma nye aka kwàlité ego gọọmenti steeti ahụ na-enwete site n'ụtụ isi.

Egwuregwu:

Anambra na-agawanyekwa n'ihu n'ihe gbasara egwuregwu. Mgbe e kepụ̀tara Anambra, e nwere naanị otu egwu bọọlụ olenole na steeti ahụ; ma e nweghịkwa ámá egwuregwu bọọlụ ọbụla na steeti ahụ oge ahụ. 

Mana ugbua, e nweela ọtụtụ otu egwu bọọlụ ugbua n'Anambra, nke gụnyere Gabros International Football Club (nke Maazị Gabriel Chukwuma), Ifeanyi Ubah FC (nke Maazị Ifeanyi Ubah); Aspire Football Club Adazi-Ani (nke Dọkịta Emeka Okeke); Udoji FC (nke Maazị Oscar Udoji); Goddosky International Football Club (nke Maazị Godwin Eloka Agbasimelo), na ọtụtụ ndị ọzọ.

E nwekwala ọtụtụ ama egwuregwu bọọlụ na steeti Anambra taa, ma nke gọọmenti nwe ma nke ndị nnọrọonwe; nke gụnyere Rojenny Stadium, Oba (nke Maazị Rommy Ezeonwuka); Awka City Stadium; Gabros Stadium, Nnewi; Ifeanyi Ubah Stadium, Nnewi; Neros Stadium, Nanka (nke Maazị Poly Emenike); tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Ọtụtụ ndị Anambra na-emekwa ihe na-ada ụda n'asọmpi egwuregwu dị icheiche n'ogoogo mba ụwa taa, ma na-enwetekwa nturuùgò.

Etu a ka Anambra sikwara nwete agamnihu dị icheiche na ngalaba niile nke steeti ahụ. Ka ọnọdụ steeti ahụ dị taa bụ ihe akaebe na ihe adịghịzị ka ọ dị ụnyaahụ.

Banyere echi, olileanya jupụtàrà na ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ, nke Ọ̀kàmmụta Chukwuma Soludo nọ n'isi ya ga-ejigide ya bụ ọkụ ka ọ ghara ịnyụ, ma rụkwasịkwuo n'elu nke a rụgoro arụ, bụkwa nke ọ malitegoro ime. 

A na-esi n'ísì ahụrụ mara ụtọ ndị. Anambra adịghịzị etu ọ dị ụnyaahụ, Anambra dị mma taa, Anambra ga-aka mma echi.