Alor Eriela Ji Ọhụrụ

Alor Eriela Ji Ọhụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a 

A kọwaala n'ebe o doro anya na mmemme iri ji ọhụrụ n'ala Igbo abụghị ikpere arụsị, dịka ụfọdụ si eche.

Eze ọdịnala obodo Alor dị n'okpuruọchịchị ime obodo Idemili nke steeti Anambra, bụ Igwe Chinedu Elibe Okonkwo (Ezediohamma nke atọ) kwupụtara nke a na mmemme iri ji ọhụrụ obodo ahụ nke ahọ 2022.

Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'obi eze ọdịnala obodo ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ụmụafọ Alor na ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị icheiche wee bịa
 
Igwe Okonkwo, oge ọ na-awa ji kpọmkwem na mmemme ahụ, mèrè ka a mara na mmemme iri ji ọhụrụ bụ nnukwu mmemme n'ala Igbo, ma bụrụkwa mmemme e ji akwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kọrọ n'ugbo, dịka omenala Igbo siri dị.

O kwuru na ọ bụ nke adabàghị adaba chaachaa, bụ echiche ahụ ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na ihe ụfọdụ na-ekwu oge ụfọdụ na iri ji ọhụrụ bụ ihe ikpere arụsị maọbụ ihe ọgọ mmụọ, ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị na-eche ụdị echiche dị etu ahụ ka ha kwụsị ya, n'ihi na o nweghị ihe ọbụla jikọọrọ iri ji ọhụrụ na ikpere arụsị, maọbụ nwee ka ha abụọ si bụrụ otu ihe.

O kelere Chineke maka ichekwaba na idu ụmụafọ obodo ahụ n'ogologo oge niile nke ọrụ ugbo, ha wee kọọ, ma dịkwa ndụ wetekwa ihe ubi n'uju. O tòkwàrà Chukwu maka nchekwa Ya na ngọzị Ya n'isi obodo ahụ na ụmụafọ ya, ha wee na-apụ, na-abata, ma na-agawanye n'ihu, na-emekwa nke ọma n'ihe dị icheiche ha na-eme.

Ka Igwe Okonkwo mechara omenala ịwa ji ahụ, ya bụ mmemme kpògharazịrị ọkụ n'ozuzuoke, dịka a malitezịrị ịgba egwu na ime ihe ngosi ndị ọzọ dị icheiche site n'aka ndị òtù ụmụnwaanyị na òtù ndị ọzọ dị icheiche pụtara ìhè na mmemme ahụ. 

Mmemme ahụ, nke Igwe Okonkwo, ndị ichie ya, na ndị eze ọdịnala ndị ọzọ bị́árá nọnyere ya jìrì egwu Ị̀gbà Eze wee bata na ya, bụ̀kwà nke a nọrọ na ya wee tụọrọ eze ọdịnala mmamma site n'aka ndị otu dị icheiche.

Ya bụ oke mmemme dọtàkwàrà ọtụtụ ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti, ma bụrụkwa mmemme iri ji ọhụrụ nke asatọ Igwe Okonkwo megoro kemgbe o jiri banye n'ocheeze dịka eze ọdịnala obodo ahụ.

A nọkwazịrị na mmemme ahụ tie mmanwụ, gbaa egwu ọdịnala ma mekwa ihe ngosi dị icheiche. A nọ̀kwàrà na ya kpaa ma kpee ekpere maka ọdịmma obodo ahụ; rie erimeri dị icheiche, ọkachasị ji ọhụrụ a hụrụ ahụ, nke e jiri mmanụ akwụ ọhụrụ, ụkpaka na ụtazị mara abụba wee hazie, tinyere mmanya ngwọ jụrụ oyi e jiri wee gbanyere ya ụgbọ nwamkpi; nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya n'ezie.