Akụkọ Ntọala Nigeria n'Ọgbụgba Afọ Iri Isii na Abụọ Ya

Akụkọ Ntọala Nigeria n'Ọgbụgba Afọ Iri Isii na Abụọ Ya


Izunna Okafor dere akụkọ a


Nwa puru eze abụghịzị nwata, maka na ọ na-abụ ihe gbàá afọ, ọ gbanye mgbọrọgwụ.

N'abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ a ka ala Nigeria merùberè mmemme ncheta ọgbụgba afọ iri isii na abụọ o jiri nwere onwe ya pụọ n'aka ọchịchị ndị ọcha, n'afọ 1960.

Ala Nigeria, dịka akụkọ ntọala ya siri dị, bụ ala dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Africa, ma bụrụkwa nke ndị bi n'ime ya bibụ ichèiche, wee ruo mgbe ndị ọcha bàtàrà n'afọ 1901 ịchị ndị bi na mpaghara ahụ. Tupu oge ahụ, ndị ahụ na-azagasị aha dị icheiche, nọọrọ onwe ha ma nwekwa ndị ọchịchị nke ha, wee ruo mgbe ahụ ndị ọcha bịara. Ndị ọcha kèkọtàra ebe ahụ niile ka ọ dịzie mpaghara abụọ —mpaghara mgbago ugwu na mpaghara ndịdà anyanwụ. 

Ka o ruru n'afọ 1914, ha chịkọrọ mpaghara abụọ ahụ ọnụ ka ha bụrụzie otu mbà; ha wee kpọọ aha ya 'Nigeria'. Nke a bụ nke e mere site n'aka Gọvanọ mbụ chịrị ala ahụ, bụ Maazị Lord Lugard. 

Ka nke ahụ gachara, ụfọdụ ndị ọzọ jiri ọkwa ọchịchị ahụ bụcha ndị ọcha, wee ruo oge ala Nigeria nwèère onwe ya pụọ n'aka ọchịchị ndị ọcha. Ndị ahụ gụnyèrè: Maazị Lord Lugard (onye nọrọ n'ọkwa bido n'afọ 1914 ruo afọ 1919); Maazị Hugh Clifford (bido n'afọ 1919 ruo afọ 1925); Maazị Graeme Thomson (bido n'afọ 1925 ruo afọ 1931); Maazị Donald Cameron (bido n'afọ 1931 ruo afọ 1935); Maazị Bernard Bourdillon (bido n'afọ 1935 ruo afọ 1940); Maazị John Evelyn Shuckburgh (bido n'afọ 1940 ruo afọ 1942); Maazị Alan Burns (bido n'ahọ 1942 ruo afọ 1943); Maazị Arthur Richards (bido n'afọ 1943 ruo afọ 1948); Maazị John Macpherson (bido n'afọ 1948 ruo afọ 1955); na Maazị James Wilson Robertson (bido n'afọ 1955 ruo afọ 1960).

Ka o ruru n'afọ 1960, ndị ọcha nyefèzịrị ọchịchị n'aka ụmụafọ Nigeria; e wee kwuwaa n'ala Nigeria enwerela onwe ya pụọ n'aka ọchịchị ndị ọcha; e wee kpọọ ya ụbọchị Indipenda, nke pụtara ụbọchị nnwereonwe Nigeria. Ka e nyefere ọchịchị n'aka ụmụafọ Nigeria, onye mbụ jiri jiri ọkwa dịka onyeisi ala Nigeria bụ Dọkịta Nnamdị Azikiwe, bụ onye ọchịchị ya bịara na njedobe n'agọ 1966. N'agbata oge ahụ ọ nọ n'ọkwa, Maazị Abubakar Tafawa Balewa jiri ọkwa dịka Onoowu (Prime Minister), ebe Ezenwaanyị Elizabeth nke mba England nọ dịka Eze oge ahụ, mana Ezenwaanyị Elizabeth sepụrụ aka n'ihe gbasaara ọchịchị Nigeria n'afọ 1963.

N'abalị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị n'afọ 1966, ndị ọrụ agha ala Nigeria wụbàtàrà n'ike, wee chụtuo ndị nọ n'ọnwa, ma wegharazie ọkwa ọchịchị. Ka nke ahụ gachara, Maazị Johnson Aguiyi-Ironsi bàtàrà n'ọkwa dịka onyeisi ala n'usoro ọchịchị ndị agha. Mana, ka o ruru n'abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Julaị afọ ahụ (1966), ndị agha ala Nigeria wakpòkwàrà ma tụọ ka égbé ọzọ, chụtuo Maazị Ironsi n'ọkwa ọchịchị; Maazị Yakubu Gowon wee weghara ọkwa, ma chịgidezie ruo n'abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Julaị afọ 1975, bụ oge ndị agha wụchakwara ọzọ, wee wepu ya n'ọkwa.

Malite n'oge ahụ, ndị ọzọ chịgoro ala Nigeria (ma n'oge ọchịchị ndị agha ma n'ọge ọchịchị ndị nkịtị) gụnyèrè: Maazị Murtala Mohammed (Julaị 29, 1975 ruo Febụwarị 13 1976); Olusegun Obasanjo (Febụwarị 13 1976 ruo Ọktoba 1, 1979); Shehu Shagari (Ọktoba 1, 1979 ruo Disemba 31, 1983). 

Ọ bụ n'oge nke Shagari a ka ọchịchị siri n'aka ndị agha batakwa n'aka ndị nkịtị ọzọ. Mana, ndị agha mechakwara wegharakwa ọkwa ọchịchị, nke mere ka Muhammadu Buhari bata n'ọkwa ọchịchị (malite na Disemba 31, 1983 ruo Ọgọstụ 27, 1985); Ibrahim Babangida (Ọgọstụ 27, 1985 ruo Ọgọstụ 26, 1993); Ernest Shonekan (Ọgọstụ 26, 1993 ruo Nọvemba 17, 1993); Sani Abacha (Nọvemba 17, 1993 ruo Juunu 8, 1998); Abdulsalami Abubakar (Juunu 8, 1998 ruo Mee 29, 1999).

Ka nke a gachara, ndị nkịtị batakwara n'ọkwa ọzọ n'abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Mee. Nigeria wee malitezie mgbe ahụ nọgide n'ọchịchị ndị nkịtị (bụ ọchịchị onye kwuo uche ya) wee ruo taa. Ndị nkịtị jigoro ọkwa ọchịchị dịka onyeisi ala kemgbe ụbọchị ahụ ruo taa gụnyere: Olusegun Obasanjo (Mee 29, 1999 ruo Mee 29, 2007); Umaru Musa Yar'Adua (Mee 29, 2007 ruo Mee 5, 2010); Goodluck Jonathan (Mee 5, 2010 ruo Mee 29, 2015); Muhammadu Buhari (Mee 29, 2015 wee ruo taa).

Dịka ala Nigeria na ụmụafọ ya na-echeta ma na-emerùbe ọgbụgba ahọ iri isii na abụọ ha jiri nwere onwe ha, ọ dị mkpa na ụmụafọ Nigeria, ọkachasị ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ga-atụle uche ọzọ n'etu ya bụ ije si aga kemgbe ahụ nà otu ọnọdụ ala Nigeria siri gbata kwụrụ ugbua. 

Ọ dị mma ịtụle uche mara ma Nigeria ọ bụ naanị okenye ahọ isii n'ọnụ, ka ọ bụkwa okenye n'ihe gbaasaa ọnọdụ mmepe na ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ obodo ahụ. Ọ dị mma ịtụle ma Nigeria ọ kara dị mma n'oge ọchịchị ndị ọcha, ka ọ kara dị mma ugbua ọchịchị dị n'aka ụmụafọ Nigeria. 

Ọ dịkwa mkpà ịtụle banyere ebe ya bụ mmiri siri gbarụọ, ebe e metere ya nke ọma, na e metechaghị ya, na ebe e meteghị ya kpamkpam. Ọ dịkwazị mkpà ịtụle uche banyere ihe a ga-eme ya bụ àbàlà wee sụta ya nri, nà otu a ga-esi kwọọ ya bụ onye ukwu wara, maka na o si taa dị mma, ọ dịbara gboo.