Ágwụ̀ na Ịrụ̀ Agwụ̀ n'Ala Igbo

May 18, 2022 - 15:35
 0
Ágwụ̀ na Ịrụ̀ Agwụ̀ n'Ala Igbo
Ndị na-arụ agwụ
Izunna Okafor dere edemede a
Ụgwọ chi onye ụwa ji ya bụ ịgbara ọgụ n'ọha mmadụ na n'ọha mmụọ. Nke a bụ maka na chi onye na nkwenye onye na-edu onye. Ọ bụkwa ihe onye na-akpọku bụ chi ya.
Ka ọ dị taa n'ala Igbo, ọ na-abụ oge ụfọdụ, mmadụ na ibe ya kwukarịa okwu, ọ sị ya na ọ dị ka agwụ ọ na-akpa ya. Mana nke kacha nke ma bụrụkwa eziokwu bụ na ọtụtụ n'ime ndị na-ekwu ihe a na-ekwu ya maka na ha nụrụ ya n'ọnụ ndị ọzọ; ọtụtụ n'ime ha amaghị ihe bụ agwụ na ihe bụ agwụ ịkpa mmadụ. Tupu mmadụ ọbụla aghọta ihe bụ agwụ ịkpa mmadụ, onye ahụ ga-ebu ụzọ ghọta ihe bụ agwụ, maka na a naghị esi ofe ọgbọnọ n'ejighị ọgbọnọ. Nke a ka o jiri dị mkpa ịkọwa ihe bụ agwụ.
Gịnị bụ agwụ?
Agwụ bụ otu n'ime ihe dị iche iche ndị Igbo kwenyere na ya, ma bụrụkwa nkwenye dịbara gboo, wee ruo taa. Ọzọ bụkwa na agwụ bụ mmụọ, maka na ihe ọbụla mmadụ ahụghị anya maọbụ metụ ya aka bụ mmụọ. Ọ dịkwa mkpa ịkọwa na agwụ abụghị ịgwọ ọgwụ, n'agbanyeghị na agwụ bụ mmụọ.
Dịka nkwenye ndịigbo siri dị, Agwụ bụ mmụọ na-edu onye (bụ nke ụfọdụ na-akpọ 'Guardian Angel' na bekee, n'agbanyeghị na e wetụrụ ihe olenaole dị iche). Agwụ bụkwa mmụọ na-agbazi omume onye ọbụla. Ihe nke a pụtara bụ na onye ọbụla nwèrè agwụ nke ya, bụ mmụọ na-edu, ma na-agbazikwa omume ya na ihe na-eme na ndụ ya oge ụfọdụ, dịka nkwenye ndị Igbo siri dị.
Agwụ nwere ụzọ abụọ o si akpa ike maọbụ egosipụta onwe ya na ndụ mmadụ. Oge ụfọdụ, ọ na-abụkwa o gosipụtachaa onwe ya n'otu ụzọ, o gosipụtaba n'ụzọ nke ọzọ. Nke mbụ n'ime ụzọ abụọ a bụ na agwụ nwere ike igosipụta onwe ya n'ụzọ ọma. Ihe nke a pụtara bụ na agwụ nwere ike ime ka ihe mmadụ na-eme na-agara ya siriri-werere, mekwa ka mmadụ na-enwe chi ọma maọbụ ihu ọma na ọganihu. Agwụ nwekwara ike ime ka mmadụ nwee ezi nchekwa na 'ọdụụla', nke na-eme na ebe ndị ọzọ gachaara tọkịrị, na onye ahụ nwere ike ịpụta ebe ahụ gafèéré onwe ya n'enweghị ihe ọbụla mere ya; maọbụ mekwa na mmadụ nwere ike ịnọgide n'otu ebe, mana ngwangwa o si ebe ahụ pụọ, ihe ọdachi emee n'ebe ahụ.
Agwụ nwekwara ike ime ka mmadụ bụrụ 'ọgwọ nnụ ọrịa', n'agaghị ụlọakwụkwọ ọbụla maọbụ nwee ọzụzụ maka mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ; nkè bụ na onye ahụ bàá ọhịa kpata akwụkwọ maọabụ ahịhịa ọbụla nye onye ọrịa, onye ahụ enwere onwe ya. Agwụ nwèkwàrà ike ime ka mmadụ nwee ọnụ mmụọ, nke na onye ahụ kpeere mmadụ ekpere, kwubie okwu, maọbụa kwupụta ihe ọbụla n'ọnụ ya, ọ màlite ime ozigbo ma bịakwa na mmezu dịka onye ahụ siri kwuo ya. 
Ọ bụ ike a ka ọtụtụ na-ejizị ike a wee bàta n'ụlọụka ma na-emekwa ọtụtụ ihe ịrịbaama (miracles), ebe ọtụtụ na-eji nke ha bụrụ ndị amụma, oke dibịa, dibịa mmiri, maọbụ dibịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ ma na-emekwa ihe ukwu dị iche iche. Ọ bụ n'ihi ya ka ọtụtụ jiri kwete na dibịa na-ama mmadụ ama, na a naghị amụ ya amụ amụ.
Ihe ndị a niile bụcha ụzọ ọma agwụ si egosipụta onwe ya na ndụ mmadụ. I nwékwara ike kpọọ ya ụzọ ọma agwụ si arụrụ mmadụ ọrụ, maọbụ si eji mmadụ arụ ọrụ.
N'aka nke ọzọ, e nwekwara ụzọ nke abụọ agwụ si egosipụta onwe ya na ndụ mmadụ. Agaghị m akpọ nke a ụzọ ọjọọ, mana nkọwa ya ga-eme ka ị ghọta ya nke ọma. 
Agwụ nwèrè ike igosipụta onwe ya na ndụ mmadụ site n'ịkpasàsị onye ahụ anya, ime ka mmadụ na-akpa aghara, ime onye ahụ aka nkụchasị, ime onye ahụ 'ọba n'aka ọba n'ọnụ' (from mouth to hand), ime onye ahụ ka ego ghara ịdị na-adị ya n'aka, maọbụkwanụ iwètara onye ahụ ndaghachiazụ n'ụdị dị iche iche. Agwụ nwere ike ime mmadụ o ruo n'ebe ibè ya pụtara gaa, ọ tọkịrị.
Agwụ nwere ike ime ka mmadụ na-adabà na nsogbu na mgbe na mgbe, mee ka ihe ọdachi maọbụ ọnwụnwa dị iche iche na-adakwàsị mmadụ, na-emekwa ka ihe ihere na ihe mmebọ na-abịakwasị, nke na e nwere ike a nọgide na mmemme maọbụ n'ebe ndị mmadụ juru, onye ahụ emewakaị otu ihe 'obodo bịa lelee'. Agwụ nwekwara ike ime mmadụ 'omebere ma chi ekweghị ya, onye ụta atala ya'.
Nke kacha njọ n'ihe niile a bụ na agwụ nwèrè ike ime mmadụ ọ na-átà ghaghagha, mee na ya na onye ọzọ agaghị emekọnwu ihe n'enweghị nsogbu ọbụla; maọbụkwanụ o mee onye ahụ ọ na-eme ka onye ara oge ụfọdụ; mana anya dị ya mma. Ọ pụrụ ime mmadụ ọ na-ahụ ihe enweghị isi mmadụ nkịtị anaghị ahụ, maọbụ mee ka ndị mmadụ na-asọ onye ahụ ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ pụrụ iwètàrà onye ahụ, nke nwere ike ime ka mmadụ jụọ onye ahụ 'Nwoke m, i jìzịkwà anya gị?", "Dianyị, kedụzị?", maọbụ "Nna, agwụ ọ nà-àkpá gị?", maọbụ ụfọdụ ajụjụ ndị ọzọ dị añaa, dịka ihe onye ahụ na-eme siri dị.
Mgbe ihe ndị a maọbụ ihe ndị ọzọ yiri ha màlitere mebe na ndụ mmadụ, ezigbo onye Igbo ñụjuru mmiri ara afọ ga-asị 'Mba' ka ọ ga jụọ èsè. Ihe a na-akpọ nke a n'ala Igbo bụ Ịgba Afa, maọbụ Ịgba Afa Agwụ. Ị ga-akpọ ya Ịgba Afa Agwụ ma ọ bụrụ na onye ahụ ma na ọ bụ agwụ na-eme ya ma chọzie ịgba afa iji chọpụta ụdị agwụ ọ bụ maọbụ ihe a ga-eme banyere ya.
Ọ bụrụ na onwe ahụ amaghị ihe na-eme ya cháá-cháá, o wee ga gbaa afa, a gwa ya na ọ bụ agwụ na-akpa ya maọbụ na eme ya ihe ahụ; ihe ọzọ onye ahụ ga-ajụ bụ 'Gịnị ka a ga-eme banyere nke a?".
Kaosiladị, dịka nkwenye ndị Igbo siri dị, ụsà/asịsà ajụjụ a adịghị abụọ. Naanị ụsa e nwere nye nke ahụ bụ na onye ahụ ga-eme ihe a na-akpọ 'Ịrụ Agwụ'.
Mana ọ bụrụ na onye ahụ amaghị, wee jụọ, e wee gwa ya na ọ bụ ịrụ agwụ bụ mmechakọrọ ya, ihe ọzọ dị mkpa onye ahụ ga-emezị bụ na ọ ga-agbakwa afa ọzọ, iji chọpụta ụdị agwụ ọ bụ. Ihe nke a jiri dị mkpa bụ na ọ bụ mmadụ chọpụta ụdị agwụ na-enye ya nsogbu, o wee mara etu a ga-esi wee rụọ ya bụ agwụ. Agwụ na-awa n'afa, mana ọzọ (ichi ọzọ) anaghị awa n'áfá.
Ihe onye nwere uche ga-ajụzị bụ, Gịnị bụ ịrụ agwụ?
Tupuu akọwaa m ihe Ịrụ Agwụ pụtàrà, etu e si eme ya, ihe e ji eme ya, na onye ọ dịịrị ịrụ agwụ ahụ; ọ dị mkpa ịkọwa na agwụ dị naanị  ótù; ọ bụ ezie na e nwezịrị ụzọ dị iche iche e si arụ ya. Ọ dị ka mmadụ ịma mmọnwụ n'ala Igbo. Iji maa atụ: onye mara mmọnwụ n'obodo m bụ Ebenator dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' nke steeti Anambra amazuola mmọnwụ n'ala Igbo n'iile, nke bụ na onye ahụ etozuola òké ma nwekwazie ike iti mmọnwụ na mpaghara ebe ọbụla n'ala Igbo; maka na ala bụ otu. Ihe nke a pụtara bụ na onye rụrụ agwụ arụọla agwụ, maka na agwụ bụ agwụ; agwụ dịkwà ótù.
Kaosiladị, a bịa n'ala Igbo, e nwere agwụ ikwunne, nwee agwụ ụmụnna, ma nwekwazie agwụ ezinụlọ. Nke a apụtaghị na agwụ ndị a dị iche iche; agwụ bụ otu, dịka m siri kọwaa na mbụ. Mana ndịiche dị ebe ahụ dàbèèrè n'etu e si arụ ya bụ agwụ, onye ọ dịịrị ịrụ ya, na ihe e ji arụ ya.
Ịrụ agwụ bụ omenala a na-emere onye agwụ na-akpa, bụ onye agwụ mara, onye agwụ na-enye nsogbu, maọbụ onye agwụ na-egosipụta na ndụ ya, ọkachasị onye ọ na-egosipụta na ndụ ya n'ụdị dị añaa. Chetekwa na ekwuru m na mbụ na e nwere ụzọ abụọ agwụ si egosipụta na ndụ mmadụ. Ịrụ agwụ bụ omenala a na-emere onye agwụ na-egosipụta na ndụ ya n'ụdị nke abụọ n'ime ụzọ abụọ ahụ m gwara gị na mbụ, maka na mkpà dibịa a naghị akpà onye ahụ dị.
Ịrụ agwụ nọ ọdụ ka ịkpàchi mmụọ ọjọọ na-akpa ike ọjọọ na ndụ mmadụ maọbụ na-enye mmadụ nsogbu, ka ọ kwụsị ịkpa ike ọjọọ. Ọmụmaatụ kachara dị mma iji kọwaa ịrụ agwụ bụ mmadụ bịa ebe idè mmiri na-enye nsogbu n'ụlọ ya, ọ kpọọ ndị ma anya ya, ha akpàchie idè mmiri ahụ inye nsogbu n'ụlọ ya, rụọrọ ya ụzọ ọ ga-esi na-aga, ma gwa onye ahụ ihe ọ ga na-eme iji wee na-echukwa ya, ka o wee na-aga etu ahụ ọ chọrọ ka o si na-aga.
A bịa n'ịrụ agwụ n'ala Igbo, onye ọ dịịrị ịrụ agwụ dàbèèrè n'ụdị agwụ a na-arụrụ mmadụ, dịka dibịa gbara afa agwụ ahụ siri kwuo. Ihe e ji arụ agwụ dàbèrèkwàrà n'ụdị agwụ a na-arụ, maka na o nwere ike ndị a jiri otu okeọkpa na ji atọ na-arụ agwụ, ndị ọzọ ejiri okeọkpa abụọ maọbụ atọ wee na-arụ nke ha.
Ọ bụrụ na ọ bụ agwụ ikwunne ka dibịa gbara n'afa na ọ bụ ya na-enye onye ahụ nsogbu, ị mara na ọ bụ nnaochie onye ahụ (onye si n'ebe onye ahụ mụrụ nwadiala) ga-arụrụ ya agwụ;  ọ bụrụ na ọ bụ agwụ ụmụnna na-enye ya nsogbu, ị mara na ọ bụ onyeisi agwụ n'ụmụnna onye ahụ ga-arụrụ ya agwụ; mana ọ bụrụ na ọ bụ agwụ ezịnụlọ, ị mara na ọ bụ onyeisi agwụ n'ezinụlọ onye ahụ ga-arụrụ ya agwụ. Onyeisi agwụ bụ onye buru ụzọ rụọ agwụ n'ime ndị ka nọ ndụ n'ụmụnna maọbụ n'ezinụlọ ahụ. Ọ bụghị iwu na onye ahụ ga-abụ okenye; o nwere ike bụrụ nwata.
Ụbọchị ahụ a na-arụrụ onye ahụ agwụ kpọmkwem, opekatampe, ótù nnaochie ya rụrụ agwụ ga-anọrịrị ya, maka akaebe, na ịnọchite anya ndị ikwunne. Ụbọchị ahụ, onye ahụ a na-arụrụ agwụ ga-atụ aka ma wepụta ebe ọ ga-eji mere ihu agwụ. Ọ bụ n'ebe ahụ ka a ga-anọ wee dọtuo anyanwụ na ezeelu; dọtuo, ma rụọrọ ya agwụ. 
Chetekwa na agwụ nwere ike ịma nwoke maọbụ nwaanyị; okenye maọbụ nwata. Ọ bụrụ na onye ahụ bụ nwoke, ebe ahụ onye ahụ ga-eji mere ihu agwụ ga-adịrịrị n'ala obi ya. 
Kaosiladị, ọ bụrụ na e dubèghị onye ahụ obi maọbụ nye ya ala obi, onye ahụ nwèrè ike iji ebe dị nso n'akụkụ ihu agwụ nke nna ya wee mere ihu agwụ nke ya. Mana ọ bụrụ na e mechazie duo ya obi, o nwere ike ibugharịzị ihu agwụ ya buga ya n'ebe ala obi ya dị, bụkwa nke o nwere ike iji obere mmemme wee mechàkọlọta, site n'iji okeọkpa, ọjị, na ihe ndị ọzọ, dàbere n'ole ike aka ya hà.
Edemede a ga-agwụ echi...
© Izunna Okafor, 2022

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484