ACTDA akọwaala mkpa ọ dị inweta nkwàdo gọọmenti tupu a rụba ụlọ

Jan 30, 2023 - 15:39
 0
ACTDA akọwaala mkpa ọ dị inweta nkwàdo gọọmenti tupu a rụba ụlọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-adị mma ịma ọkwa mmiri tupuu ozuzo ya, maka na mgaramara na-ekpèkarị azụ.

Ka ọ dị taa, a kpọkuola ma dụọ ndị na-arụ ụlọ ka ha gbaa mbọ hụ na ha kpọtụụrụ gọọmentị ma nwèta nkwàdo na ikike site n'aka ụlọọrụ kwesiri ekwesi tupu ha amalite ime nke ahụ, iji gbanahị ịkwa mgarammara n'ikpeazụ.

Ndụmọdụ a bụ nke e nyere site n'ọnụ onyeisi ụlọọrụ 'Awka Capital Territory Development Authority' (ACTDA), bụ Maazị Ossy Onuko, n'okwu ọ gwara onye nta akụkọ anyị n'isi ụlọọrụ ya dị n'Awka) bụ isi obodo steeti Anambra. Ọ katọrọ ma gbarụọ ihu banyere otu ụfọdụ ndị mmadụ siri kachie ntị gaa n'ihu na-arụnyési ihe n'okpuru eriri ọkụ nakwa n'ebe ndị ọzọ iwu akwadoghị, na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, ọkachasị n'Awka na gburugburu ya, n'agbanyeghị na gọọmentị akụtusiela ụfọdụ ihe ndị ahụ n'oge gara aga, iji chụsịa ndị na-eme ihe dị otu ahụ ma mekwa ka ndị ọzọ mụrụ akọ.

Dịka o siri kwuo, onye ọbụla na-ezùbe ịrụ ụlọ n'ime mpaghara obodo iri abụọ na anọ dị n'okpuru nlekọta ụlọọrụ ACTDA gà-éwèta akwụkwọ eserese atụmatụ ụlọ ahụ nà akwụkwọ ndị ọzọ dị mkpà, ma kpọtụrụ ụlọọrụ ahụ iji nyochaa akwụkwọ ndị ahụ, nyochaa ebe ahụ a ga-arụ ụlọ ahụ nakwa ihe ndị ọzọ kwesiri na ha ga-enyòcha banyere nke ahụ, tupuu ha edebànye ya n'akwụkwọ ma nyekwa ya nkwàdo ikike ịga n'ihu, ma ọ bụrụ na ihe ha hụrụ jùrù ha afọ.

Ọ katọrọ otu ụfọdụ ndị mmadụ si amilite ịrụ ụlọ n'ebughị ụzọ nweta akwụkwọ eserese atụmatụ ụlọ ha chọrọ ịrụ, ma kọwaa ya dịka ihe égwù na ihe izè ndụ, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị na-eme ihe dị otu ahụ ka ha wepu aka na ya n'ihi na gọọmentị agaghị eleghara ụdị ajọ ọrụ dị etu ahụ anya ma ha hụ ya.

O mere ka a mara na usoro itinye akwụkwọ na inweta nkwàdo na ikike site n'aka ụlọọrụ ACTDA anaghị ewèzị ọtụtụ oge ugbua, ma kwuo na ọ naghị ewèkarịzị otu izuụka ma ọ bụrụ na onye ahụ nwere akwụkwọ niile dị mkpa a chọrọ n'aka ya. O kwukwara na mmadụ nwekwàrà ike isi n'usoro nzikọrịta ozi ịntaneetị ha bụ https://actda.ng/ wee mee ihe gbasara itinye akwụkwọ na ndebanye aha ugbua maka ụlọ ọ chọrọ ịrụ, kama na ha bụ ndị ọrụ ACTDA ga-agarịrị n'ebe ahụ a na-arụ ya bụ ụlọ, ka ha wee jiri anya ha hụ ma mara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.  

Dịka ọ na-ekwu na ezi ọrụ ụlọọrụ ACTDA na-arụ enyela aka ibelata ọnụọgụgụ ụlọ ọdịda na steeti ahụ, Maazị Onuko kátọkwàrà akaọrụ ụfọdụ ndị mmadụ ndị anaghị agbaso usoro ndebanye ahụ n'ozuzuoke, ma kwuo na ụlọọrụ ahụ agaghị anabata maọbụ leghàrà nke ahụ anya chaachaa.

Ọ kọwara na ótù n'ime ihe o jiri dị mkpà na onye ọbụla chọrọ ịrụ ụlọ na mpaghara ebe dị n'okpuru nlekọta ACTDA ga-akpọtụrụrịrị ụlọọrụ ahụ bụ n'ihi na ụfọdụ èsèrèsè atụmatụ ụlọ nà akwụkwọ ndị ọzọ dị mkpa nwèrè ike dị mma ma dịkwa etu kwesiri ekwesi, mana ebe a ga-arụ ụlọ ahụ agaghị adịcha mma ka o siri kwesi, ọkachasị ọ bụrụ ebe dị nso n'akụkụ okporoụzọ àwàrá-àwàrà, ebe dị nso n'ọwà mmiri maọbụ n'okpuru ebe eriri ọkụ gara. 

Ọ sị na e nwere ohèrè ala e kwesiri ịhapụ tupu a rụba ụlọ n'ụdị ebe ahụ, bụ nke onye na-arụ ụlọ nwèrè ike ọ gaghị ama ma ọ bụrụ ka ọ kpọtụrụghị ụlọọrụ ACTDA maka nnyòcha na ndụmọdụ; onye ahụ ewee rụọ ụlọ n'ebe ekwesighị ekwesi, nke ga-eme ka a kụtuo ya bụ ụlọ n'oge ikpeazụ, n'agbànyèghị ogoogo a rụdobere ya.

Maazị Onuko gbadòrò ụkwụ n'ihe ndị a wee kpọkuo ma dụọ Ndị Anambra ọdụ, ọkachasị ndị na-arụ ụlọ na mpaghara ebe dị n'okpuru nlekọta ụlọọrụ ACTDA ka ha na-akpọtụrụ ụlọọrụ ahụ tupu ha amalite ịrụ ụlọ ọbụla, iji gbanahị ịkwa mgaramara n'oge ikpeazụ, ya na iji nyere gọọmentị aka n'ịkwụsị ụlọ ọdịda na ajọ ọdachi ndị ọzọ na-adapụtakarị site n'ịrụ ụlọ etu ekwesighị ekwesi maọbụ n'enwetaghị nkwàdo na ikike gọọmenti.

Dịka ọ na-ekwupụta na ụlọọrụ ACTDA wàtàrà ọgọdọ ma dịkwa ezi njikere inwòghàrị na idozi Awka bụ isi obodo steeti Anambra ka ọ bụrụ eji ama atụ, Maazị Onuko kpọpụtasịrị ihe dị icheiche ụlọọrụ ahụ mepụtagoro banyere nke ahụ na nsonso, ma kọwakwa kpọkuo ndị Anambra ka ha gaa n'ihu inye ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo ezi nkwàdó zuru okè.

Ọ dọ̀kwàrà ndị na-azụ maọbụ na-ere ahịa n'akụkụ okporoụzọ dị icheiche na steeti ahụ aka ntị ka ha kwụsị ime nke ahụ, n'ihi na onye ọbụla ụlọọrụ ahụ nwètèrè ka ọ na-eme ihe dị otu ahụ ọzọ bụ ga-abụ onye a ga-eji usoro iwu wee nyụchaa anya.

11/1/23

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484