ACORA akaala ụka owuwe ihe ubi na ịtụ mmamma afọ 2022

Izunna Okafor dere akụkọ a
Ọ na-adị mma mmadụ gụrụ gụrụ gụrụ, o kelee ihe na-ejere ya ozi na ihe ọ na-ejere ozi.
N'ịgbasò nke a, ndị ụka 'Anglican Church of Redemption' dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra nọrọ ụbọchị ụka gara aga wee jiri ọñụ na ite egwu ọñụ wee bịa n'ihu Chineke ịtụrụ Ya mmamma maka onyinye ndụ, ezi ahụike na ihe ndị ọzọ O jirii gọzie ha.
Ya bụ ụka owuwe ihe ubi bụ mmemme omenafọ ụlọụka ahụ na-eme, ma bụrụkwa nke ha ji achịkọta ụka ịtụ mmamma ndị ọzọ dịkwa ka ya a na-eme n'afọ ọbụla.
N'okwuchukwu ya n'ofufenro ahụ nke afọ a, nke isiokwu ya bụ ‘Iwuru Chineke’ (Building for the Lord) Ụkọchukwu Paul Umeokoli, nke ụlọụka St. Thomas Anglican Church, Ebenebe, onye bụkwa Ashdikin nke Awba-Ofemili Ashdikinri, kọwàrà iwuru Chineke ụlọ dịka nnukwu ohere ọma, nke na ọ bụghị onye ọbụla nwèrè ya; ma dụọ ndị ụka ka ha jiri ya bụ oh ere kpọrọ ihe oge ọbụla ọ bịara ha.
Ka ọ na-akọwa mkpa ọ dị mmadụ inye Chineke ekele oge niile màkà mmesoọma ya niile, nchekwa ya na ngọzi Ya n'ime oge ọjọọ a agụụ na nkwafu ọbara jupụtàrà n'obodo; ya bụ ụkọchukwu gbàdòrò ụkwụ n'Akwụkwọ Nsọ (Ihe E Mere n'Ụbọchị Ndị Eze Nke Mbụ 29:1-9, na Ndị Filipia 1:20) wee kpọpụtasịa ụfọdụ ihe dị icheiche a na-atụ anya n'aka onye na-ewuru Chineke ụlọ na onye na-enye Chineke ihe.
Ọ dụkwazịrị ndị ụka ọdụ ka ha jiri obi ha niile wee na-emere Chineke ihe n'ụzọ ọ ga-enye aha nsọ Ya otuto; ọbụna dịka ọ gwara ha ka ha gba mbọ hụ na ha wùkwààrà Chineke ụlọ n'ime obi ha, tupu wubere ya nke a na-ahụ anya, ka O wee nabata onyinye ha.
N'okwu ha n'otu n'otu, onyeisioche òtù ọrụ haziri maka onyinye ahụ, bụ Maazị Henry Opara kèlèrè onyeisi nchụaja n'ụlọụka ahụ, bụ Venerebụụ Obiora Alokwu; osote ya bụ Ụkọchukwu Lucky Onebunne na ndị ụlọụka ahụ niile maka inye ha ohere na nkwàdó ije ozi ahụ ma jekwa ya n'ụzọ kwsiri ekwesi.
O kelèkwàra Chineke maka otu ya bụ mmemme siri gaa nke ọma na n'ụzọ dara ụda, ma kelekwa ndị ọzọ dị icheiche nyere aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ ịhụ na ya bụ oke ụbọchị gara nke ọma karịa ka a tụrụ anya. O kpekwara ka Chineke gọzie ma kwụghachi onye ọbụla sonyere n'onyinye ahụ mmaji kwuru mmaji.
A nọrọ ụbọchị ahụ wee nwee onyinye na ịtụ mmamma site n'aka ndị òtù na ndị ezinụlọ dị icheiche dị n'ụlọụka ahụ, bụkwa nke ha jiri oke ọñụ na ite egwu ọñụ wee mee.
A nọkwara na mmemme ahụ wee bụọ abụ pụrụ iche na abụ otuto dị icheiche site n'aka ndị ọbụabụ ụlọụka ahụ, kpee usoro ekpere dị icheiche, waa achịcha bekee, gbàá ọnya ego, ma gbanwèsikwa ihe dị icheiche e jiri bịa onyinye ụbọchị ahụ n'ego maka nkwàlite oziọma.
What's Your Reaction?






