A nwụchiela nwoke Nigeria na mba ofesi maka ọgwụike

Jan 30, 2023 - 15:02
 0
A nwụchiela nwoke Nigeria na mba ofesi maka ọgwụike

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu nwoke bụ nwaafọ ala Nigeria, bụ Maazị Nnamdi Augustine Samuel àbụ́rụ́la onye a nwụchikọrọ na mba ofesi maka itinye aka n'ihe gbasara ibu na ịtụ mgbere ọgwụike dị icheiche.

Ya bụ nwoke bụ onye e jidere n'ime izuụka a ma bụrụkwa onye e nwetere ọgwụike gburu ego ruru nde naịra iri na asatọ (₦18m) n'aka ya.

Ọgwụike dị icheiche e nwetegasịrị n'aka ya gụnyèrè mephedrone ike arọ ya ruru gram 61g, ọgwụike methamphetamine (bụ mkpụrụ mmiri) arọ ya ruru gram otu narị gram na iri ise na anọ (154g of methamphetamine), tinyéré ihe ndị ọzọ.

Dịka akụkọ siri kọọ, nwoke ahụ (gbara afọ iri atọ na isii) bụ onye a nwụchikọrọ na mpaghara ụzọ Dockyard dị na Mumbai nke mba India site n'aka òtù ndị uweojii a maara dịka ‘Mumbai Police Anti-Narcotics Cell’.

N'okwu ya banyere njide ahụ e jidere nwoke ahụ, Osote Onyeisi ndị uweojii ‘Mumbai Police Anti-Narcotics Cell’ bụ Maazị Prakash Jadhav kwùrù na e jidebụọla nwoke ahụ mgbe gara aga n'afọ 2018 maka itinye aka na mwakpo a wakpòrò ndị uweojii.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ nwoke bịara na mba India n'ime afọ olenole gara aga ma bụrụkwa onye e jidegokwara ya na mmadụ asaa ndị ọzọ bụ ụmụafọ ala Nigeria n'ebe ahụ n'oge gara aga ka ha bu ọtụtụ ngwaahịa dị icheiche iwu akwadòghị.

O kwukwàrà na a ka na-eme nnyocha ugbua banyere ya bụ nwoke na ihe o mere, ma kwuo na a ga-akpụpụ̀ ya ụlọikpe ngwangwa e mèchàrà nnyocha banyere okwu ya.

19/12/22

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484