A Mala Ụmụnne Abụọ Ikpe Ọnwụ Maka Izu Ohi Blackberry

Sep 14, 2022 - 08:43
 0
A Mala Ụmụnne Abụọ Ikpe Ọnwụ Maka Izu Ohi Blackberry

Izunna Okafor dere akụkọ a


Anyammiri gbàrà ka osimiri n'otu ụlọikpe dị na steeti Lagos, dịka a mara ụmụnne abụọ ikpe ọnwụ maka izu ohi.

Ụmụnne abụọ ahụ, bụ Genesis Ezebong na Micheal Ezebong, nàkwà otu onye ọzọ bụ Ikade Moses ka e kwuru na ha gara ohi dara ụda na mpaghara Palm Groove nke steeti Lagos.

Ndị ahụ bụ ndị a kpụgharịbụrụ ụlọikpe n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Disemba ahọ 2022, ebe malitere ikpe ha ikpe n'abalị iri na otu nke ọnwa Jenụwarị ahọ a, kpegide ya wee ruo mgbe a kabiri ya bụ ikpe site n'aka Justice Oluwatoyin Taiwo.

Dịka akụkọ siri kọọ, ụmụnne abụọ ahụ na onye òtù ha jiri mma, shọveel na akụrụngwa ihe ndị ọzọ wee wakpo ụlọ otu nwoke bụ David, ní na mpaghara 222 Ikorodu Road, Palm Groove, Lagos, n'abalị iri na atọ nke ọnwa Jenụwarị ahọ 2019, wee ga zukọsịa ihe ya, nke gụnyèrè ekwentị Blackberry, Compact Laptop, Apple laptop, mgbanaka na mgbanolu ya e jiri ọla edo wee mee, akpụkpọ ụkwụ ya, tinyéré ekwentị abụọ ọzọ bụ ekwentị otu nwoke ọzọ bụ Titilope Akeredolu.

Ka e mèchààrà nwụchikọọ ma kpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, onye na-ekpegide ha, bụ Omowumi Bajulaye kpọtakwara ụfọdụ ndị bịara gbaa akaebe na mmadụ atọ ahụ mèrè ihe ahụ n'eziokwu, tinyekwuoro na e nwetesiri ihe ndị ahụ ha zuru ezu n'aka ha, bụkwazị nke Ọkaikpe Taiwo gbàdòrò ụkwụ wee nye nkabi ikpe ahụ, ebe ndị ahụ n'onwe ha enweghịzị ike ịgọ agụ̀gọ̀ na ha emeghị ihe ahụ.

Nke bụ mkpu akwa wee pụọ n'ụlọikpe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484