A Họpụtala Onye Ntaakụkọ Izunna Okafor Maka Nkwanyeùgwù Ọzọ n'Awka

A Họpụtala Onye Ntaakụkọ Izunna Okafor Maka Nkwanyeùgwù Ọzọ n'Awka

Chinwendu Uzoatu


Ndị na-ahazi ihe mmemme Anambra Media/Movie Excellence Awards akpọpụ̀tala onye ntaakụkọ ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation, ANPC’ (ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light Newspaper, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra), bụ Izunna Okafor dịka otu n'ime ndị tuuru ugo a ga-enye nkwanyeùgwù n'asọmpi ahụ nke afọ 2022.

Onyeisi otu na-ahazi asọmpi ahụ, bụ ‘Association of Digital Media Core Advocates (ADMCA)’, bụ Maazị Harris Chuma-Odili mere ka a mara nke a n'ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ n'Awka bụ isi obodo Steeti Anambra na nsonso a, bụkwa ebe o deputasị̀rị̀ aha ndị dị icheiche tuuru ugo nà ndị a ga-enye nkwanyeùgwù pụrụ iche na mmemme ahụ.

Dị ka o si kwuo, asọmpi ahụ na mmemme ahụ bụ nke e bidoro n'ahọ 2019, ma bụrụkwa nke a na-eme kwà afọ ọbụla, iji kwanyere ndị ntaakụkọ na-eme nke ọma ùgwù, gbàkwá ha ume ma dị ugbu a na mbipụta nke anọ ya. Ọ gara n’ihu kwuo na mmemme ahụ nke afọ  a gà-ewere ọnọdụ n'ụlọnkwariakụ Mable Arch Hotel, Awka, na Septemba 25, malite n’elekere ise nke mgbede.

Maazị Chuma-Odili, onye na-eme ihe nkiri ama ama na onye na-akwàlite omenala, kwùrù na ndị ahụ tuuru ugo na ndị a ga-enye nkwanyeùgwù na mmemme ahụ nke ahọ a bụ ndị a sara anya mmiri wee họpụta, dịka ọrụ ha na ihe ha mepụtara siri dị.

E wezụga Izunna Okafor, onye a ga-enye nkwanyeùgwù dịka Ọkaibe n'Ideputa Edemede n'Asụsụ Ọdịnala (Outstanding Indigenous Language Media Content Creator of the Year 2022); ndị ọzọ tuuru ugo nà ndị a ga-enye nkwanyeùgwù nà mmemme ahụ gụnyèrè onye omebe iwu gọọmenti etiti, Maazi Chris Azubogu, onye a ga-enye nkwanyeùgwù dịka ‘Best Media-Friendly Lawmaker of the Year’; Soludo TV, ndị a ga-enye nkwanyeùgwù ‘Special Recognition Award’; Benneth Nwankwo, onye a ga-enye nkwanyeùgwù ‘Outstanding Movie Maker 2022’; ABS FM Radio Awka, ndị a ga-enye nkwanyeùgwù ‘Best Radio Station 2022’; Dọkịta. Agbili Martin Agbili, onye a ga-enye nkwanyeùgwù ‘Special Recognition Award’; na TEET Dept. AIRS, ndị a ga-enye nkwanyeùgwù ‘Best Online Media Team 2022’.

Ndị ọzọ a ga-enye nkwanyeùgwù nà nkwanyeùgwù a ga-enye ha gụnyèrè: Ọkaiwu N. Akpudo, ‘Special Recognition Award’; Ikeanyionwu Love Nma, ‘Outstanding Social Media Influencer’; Ada Enugwu-Agidi, ‘Outstanding Social Media Influencer’; Emeka McPherson Ernest Maduka, ‘Upcoming Actor of the Year 2022’; Comr. Onwuzulike John Udemezue, ‘Best Journalist 2022’; Obi Dike, ‘Special Recognition Award’; na Ohamadike TV, ‘Best Online News Agency 2022’.

Ndị ọzọ gụnyèrè: Jenny Dion Nwanegbo, ‘Special Recognition Award’; Amb. Clemson Cornell Nnonyelu, ‘Special Recognition Award’; Oby Okafor, ‘Special Recognition Award’; Amaka Obi, ‘Special Recognition Award’; Arc. Uganeme Emeka, ’Special Recognition Award’; Maduafor Chidiebere, ‘Special Recognition Award’; na Innocent Nduanya, ‘Special Recognition Award’.

Cheta na ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation eturubụọla ugo n'asọmpi ‘Anambra Media Excellence Award’ mgbe gara aga dịka 'Best Print Medium of the Year’ n'afọ 2020; ebe onye ntaakụkọ ya ahụ bụ Izunna Okafor, nwetakwara nturuùgò n'oge gara aga dịka ‘Best News Reporter of the Year’ n'afọ 2021, bụ onye ntaakụkọ kacha eme nke ọma n'asọmpi ‘Anambra Media Excellence Award’ ahụ nke afọ 2021.

Okafor, onye bụkwa onye edemede na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na-ede n'asụsụ Bekee, bụrụ onye tuuru ugo dịka onye kacha ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo n'ala Nigeria, n'asọmpi Nigeria Writers Award 2015, ma bụrụkwa onye nwetegoro ihe nrite na nturuùgòonye mkpokọta ọnụọgụgụ ya dị iri atọ na ise (35).

N'ụlọọrụ ntaakụkọ Anambra Newspapers and Printing Corporation, ọ na-ede n'asụsụ Igbo na n'asụsụ Bekee, ma bụrụkwa onyeisi nhazi akwụkwọ akụkọ Ka Ọ Dị Taa, bụ naanị akwụkwọ akụkọ asụsụ Igbo dị ugbua na mpaghara ụwa niile gbaa gburugburu, nke nwetagokwara ọtụtụ ihe nrite na nkwanyeùgwù. Ihe ndị a niile so n'ihe na-agba akaebe banyere ntozuoke Izunna Okafor na nkwanyeùgwù ọhụrụ ahụ AMEA na-enye ya ugbua dịka onye mgbasaozi kachasị ede edemede n'asụsụ Igbo.