A Dụọla Ndị Anambra lụ Ka Ha Sonyesie Ike n'Agụmọnụ Izugbe Afọ 2023

A Dụọla Ndị Anambra lụ Ka Ha Sonyesie Ike n'Agụmọnụ Izugbe Afọ 2023

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo akpọkuola ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nchịkọ̀ba agụmọnụ (census) n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ National Population Commission (NPC) ka ha mee agụmọnụ Izugbe ahụ a ga-eme n'ala Nigeria n'afọ na-abịa abịa n'usoro ghe anya oghe na n'ụzọ kacha mma.

Gọvanọ Soludo kpọrọ òkù a n'ọgbakọ otu ụbọchị a chịkọ̀bara n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ maka ịkparịta ụka na itinye okwu ọnụ banyere agụmọnụ ahụ a ga-eme n'afọ 2023.

Ya ọgbakọ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị sitere ụlọọrụ ‘National Population Commission (NPC)’, na ndị e ji okwu ha agba izu n'ọchịchị steeti ahụ, tinyere ndị eze ọdịnala na ndị ndu obodo na otu dị icheiche na steeti ahụ.

Ka ọ na-agwa ọhaneze bịara mmemme ahụ okwu, Gọvanọ Soludo kọwàrà agụmọnụ dịka ihe dị oké mkpa bakwa oké uru na mmepe obodo ọbụla, n'ihi na ọ bụ site na ya ka gọọmenti pụrụ isi mara ọnụọgụgụ mmadụ ole ọ ga-ebu n'obi maọbụ na-elegara anya oge ọbụla ọ na-atụ̀ atụmatụ.

Ọ dụkwazịrị ndị ndu obodo dị icheiche dị na steeti ahụ ka ha gbaa mbọ buru ozi ahụ bàá n'ime obodo ha dị icheiche ma mee ka ndị be ha sonyesie ike n'agụmọnụ ahụ, ma nyekwa aka hụ na agụmọnụ afọ 2023 ahụ gara nke ọma.

Na mbụ n'okwu ya, onye ji ọkwa dịka ‘Federal Commissioner’ nke ‘National Population Commission’, Maazị Chidi Ezeoke kọwàrà mkpà ọ dị ka ndị mmadụ kwụsị ime oke ngaghari, oke nkwụgharị na oke njem n'oge ahụ a ga-eme agụmọnụ ahụ, ka e wee gụtachaa onye ọbụla nke ọma ma nwete ọnụọgụgụ bụ ezi okwu n'obodo ọbụla nà ná mpaghara ọbụla.

O kwuru na ọ bụkwa ọrụ dịịrị ndị ọrụ nchekwa ịhụ na e belatara ndị mmadụ ime oke njem n'ime oge ahụ a ga-agụ ya bụ ọnụ; ma rịọkwazie ndị eze ọdịnala na e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ ka ha nyekwa aka kọwaara ndị obodo ha ihe ha kwesiri ịma banyere ya bụ agụmọnụ, iji sonyesie ike na ya.

Ọ gakwazị̀rị̀ n'ihu kelee Gọvanọ maka ya bụ ọmarịcha mmemme, okwu ndụmọdụ ya nà nkwàdó ọ na-enye ụlọọrụ NPC, ọkachasị site n'iwepụ̀ta ala n'Enugwu-Agidi, ebe a ga-arụ ngalaba ụlọọrụ NPC n'ime steeti ahụ.