A Dụọla Ndị Anambra Ka Ha Na-akụ Osisi Oge Niile

A Dụọla Ndị Anambra Ka Ha Na-akụ Osisi Oge Niile

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra ka ha na-akụ osisi na gburugburu ha oge niile, n'ihi ọtụtụ uru dị icheiche nke ahụ na-eweta.

Oku a bụ nke a kpọrọ oge ndị òtù Rotary Club, mpaghara GRA Awka, na ndị òtù a maara dịka Green Environment and Climate Change Initiative, bagidere n'atumatụ ịkụ osisi karịrị iri atọ n'ọnụọgụgụ n'isi ụlọọrụ ụlọ mgbasaozi Anambra Broadcasting Service dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi òtù Rotary Club, mpaghara GRA Awka, bụ Rotarian Elvis Amadi,  kọwàrà na ịkụ osisi ahụ bụ otu n'ime ụzọ ha si atụnye ụtụ n'ịkwàlite ọdịmma gburugburu, iji kwalite ikuku ndụ, ma belatakwa nsogbu gburugburu, dịka nsogbu mbize. 

Dịka ọ na-akọwapụ̀ta mkpà ọ dị mmadụ, ezinụlọ na ụlọọrụ ọbụla ịkụ osisi na gburugburu ya, Rotarian Amadi gara n'ihu kọwaa na atụmatụ ahụ ga-enyekwa aka n'ịkwàlite ezi mmekọrịta na njikọaka n'etiti ha na ndị ABS; ọbụladị dịka o kelèkwàra onyeisi ụlọ mgbasaozi ABS maka inabata ha ịbịa kụọ osisi ahụ.

Na ntụnye nke ya, onye hibere otu ‘Green Environment and Climate Change Initiative’, bụ Nwaada Mmachukwu Obimdike, mere ka a mara na na ihe égwù na nsogbu gburugburu dị icheiche dị n'ala Nigeria ugbua dị ọtụtụ, ma kpọkuo ụmụafọ Nigeria ka kwụsị igbutusi osisi aghara-aghara ma malite ịkụ osisi aghara-aghara ugbua, ọbụladị ma n'ụlọakwụkwọ, n'ụlọụka, ugbo, ụlọọgwụ, ụlọọrụ ha, na gburugburu ebe ndị ọzọ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onyeisi ụlọọrụ ABS, bụ Sir Chido Obidiegwu kọwàrà atụmatụ ahụ dịka nke magburu onwe ya na nke dabara adaba; ma kwukwa na nke ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche ịkwàlite mmezupụ̀ta ebumnobi na mbọ ahụ ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo na-agba ịkụ osisi karịrị nde abụọ n'ọnụọgụgụ na steeti ahụ n'ime ahọ a; ọbụladị dịka o kelèkwàra ndị òtù ahụ maka ọmarịcha atụmatụ ahụ, nàkwà osisi ahụ ha kụrụ n'ụlọọrụ ABS.

Ya bụ mmemme ịkụ osisi dọtàkwàrà ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n'ụlọọrụ ABS, nke gụnyere onyeisi ụlọ mgbasaozi ahụ n'oge gara aga bụ Maazị Amobi Adirika; onyeisi ngalaba akụkọ ụwa na okwu a kpụ n'ọnụ, Maazị Gab Okpalaeze, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

Ịkụnye ụfọdụ osisi na gburugburu ụlọ mgbasaozi ABS so n'ihe pụtakarịchara ìhè na mmemme ahụ.