A chịkọ̀barala Ụmụakwụkwọ Anambra Asọmpi Ajụọazaa Sayensị n'Awka

A chịkọ̀barala Ụmụakwụkwọ Anambra Asọmpi Ajụọazaa Sayensị n'Awka


Izunna Okafor dere akụkọ a

Àgbà nke ahọ 2022 nke asọmpi ajụọazaa ihe ọmụmụ Sayensị maka ụmụakwụkwọ steeti Anambra abịala na njedobe n'Awka n'ụzọ pụrụ iche.

Ya bụ asọmpi bụ nke a na-achịkọ̀ba site na njikọaka òtù a maara dịka ‘Dr. Chinedu Umeadi Foundation’, na ụlọọrụ ‘Post Primary School Service Commission (PPSSC) Awka’, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ na nsonso a n'ogige ụlọezumezu isi ụlọọrụ ‘Anambra State Universal Basic Education Board (ASUBEB)’ dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onye ji ọkwa ‘Director, Science and Technology Department, PPSSC Awka’, bụ Lady Ebele Okudo kọwàrà na ótù n'ime ebumnobi mmemme ahụ bụ iji kpalie ụmụakwụkwọ nọ na ngalaba ihe ọmụmụ Sayensị maọbụ ndị nwere mmasị na ya, ka ha wee ghọta ma nwee ike isonyesi ike na mgbanwe dị icheiche na-ewere ọnọdụ na ngalaba ahụ, ma bụrụkwa ndị ga-agbanyesi mgbọrọgwụ ike na ngalaba ahụ, mekwa nke ọma n'agụmakwụkwọ ha.

Ọ kọwàkwàrà na nke ahụ dabara nke ọma n'ezi agbambọ ahụ ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ na-agba n'ịkwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ na mmụta na steeti ahụ, ya na ime ka ụmụakwụkwọ steeti ahụ bụrụ ndị e ji ama atụ n'ogoogo mba ụwa.
 
Ọ jikwara ohere ahụ we kpọkuo ndịisi ụlọakwụkwọ dị icheiche dị na steeti ahụ ka ha gba mbọ hụ na ngalaba ICT ha na akụrụngwa ndị ọzọ e ji eme ihe gbasaara sayensị na teknụzụ; ma gwakwa ha mee ka ụmụakwụkwọ ahụ mara nke ọma banyere ọmụmụ akwụkwọ n'usoro dijital.
 
N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ PPSSC n'Anambra, bụ Oriakụ Ndidi Orarusi kwupụ̀tàrà afọojuju ya banyere etu ya bụ asọmpi nke ahọ a siri gaa, ma kwukwa na ụmụakwụkwọ ahụ mere ya bụ asọmpi site n'usoro kọmputa bụ CBT, bụkwa nke dabara adaba n'ebumnobi ọchịchị Soludo na òtù ahụ so akwàdó asọmpi ahụ, bụ ‘Dr. Chinedu Umeadi Foundation'.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, onyeisioche mmemme ahụ ma bụrụkwa Ọkaokwu Steeti Anambra n'oge mbụ, bụ Ọkaiwu Dom Obieke, na onyeisi ụlọọrụ ASUBEB, bụ Oriakụ Ogochukwu Obi kọwàrà mkpà ọ dị ka onye ọbụla jikọọ aka ma tụnye ụtụ nke ya n'ịkwàdò agụmakwụkwọ, n'ihi na akwụkwọ na mmụta bụ nnukwu ihe dị mkpa ma bụrụkwa nke chọrọ nkwàdó onye ọbụla.

Onyeisi ụlọọrụ ‘Dr. Chinedu Umeadi Foundation’, bụ Sir Ikem Onwuadi nyèrè nkọwa banyere òtù ahụ, ihe dị icheiche ọ na-eme, na ụzọ dị icheiche o sigoro tụnye ụtụ n'ịkwàlìtè ọdịmma na ọnọdụ obibindụ ọhaneze, ma kwuo na ha nwekwara ohere agụmakwụkwọ n'efu maka ụmụakwụkwọ mere nke ọma n'ule e ji abanye mahadum, tinyere ihe ndị ọzọ ha nà-eme na ngalaba dị icheiche.

A nọrọ n'asọmpi ahụ nwete ọtụtụ ụmụakwụkwọ tuuru ugo n'ogoogo J.S. na n'ogoogo S.S. site na mpaghara agụmakwụkwọ isii e nwèrè na steeti Anambra. 

Nwaada Favor Nmesoma Ezenwune nke ụlọakwụkwọ ‘Loretto Special Science School, Adazi’ bụkwazị onye tuuru ugo dịka ọkaibe n'asọmpi niile ahụ, ma bụrụkwa onye jiri aha ụmụakwụkwọ ndị ọzọ wee kelee ndị nà òtù dị icheiche tụnyere ụtụ maọbụ nye aka n'ótù ụzọ maọbụ nke ọzọ n'ịchịkọbà asọmpi ahụ, ma kpee ka Chineke gọzie ma kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji.