2023: Nwunye Zack Orji Ekwupụ̀tala Nkwado Ya Nye Obi, Ebe Dị Ya Na-akwàdo Tinubu

2023: Nwunye Zack Orji Ekwupụ̀tala Nkwado Ya Nye Obi, Ebe Dị Ya Na-akwàdo Tinubu

 

Nkechi Ikenwoke

Otu onye a ma ama n'ime ejije Nọliwuudu, bụ Ngozi Orji ekwuola hohaa na ọ bụ Maazi Peter Obi nke ji aha otu ndọrọndọrọ Labour Party azọ ọkwa onyeisiala Nigeria ka ya kwụ n'azụ na nhọpụta ahụ a ga-eme n'ahọ na-abịa abịa.

Oriakụ Orji kwuru nke a ka o kirichara ihe onyoonyo ịntanetị ebe di ya bụ Maazị Zack Orji kwuru na ya na-akwado Bola Tinubu nke All Progressive Congress (APC).

Oriakụ Orji kwupụtàrà nkwado ya nye Obi n'akara Instagram ya ụbọchị ụka, bụkwa ebe o wepụtara foto onwe ya na Obi, dịka o gachara njem ileta onyeisi ụka ‘Revival Church Assembly’, bụ Onyeamụma Anselm Madubuko.

N'okwu ya, Ngozi kọwara na ya di “Obidient” ebe ndi ọzọ sokwa ya na-ekwuputa nkwado ha nye ya bụ nwa amadi chịbụrụ steeti Anambra.

Ọ sị, “Ọ bụ nnukwu oge dị egwu n'ụbọchị taa mgbe onyeamụma anyị Anselm Madubuko gosiri Maazị Peter Obi. Ekene dịrị Chineke maka ọbibịa gị taa. Anyị dị OBIdient.”