2023: Ka Tinubu Siri Turu Ugo, Nweta Asambodo

Mar 3, 2023 - 16:20
 0
2023: Ka Tinubu Siri Turu Ugo, Nweta Asambodo

 

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission (INEC)’ ekwuwaala ma nye nwa amadi ahụ ji aha otu ndọrọndọrọ ‘All Progressive Congress (APC)’ bụ Maazị Ahmed Bola Tinubu, dịka onye tuuru ugo na nhọpụta izugbe ahụ e mere n'ala Nigeria ụbọchị Satọdee gara aga.

Onyeisi ụlọọrụ INEC, bụ Ọkammụta Mahmood Yakubu bụ ya kwupụtàrà nke e a n'Abuja n'isi ụtụtụ ụbọchị Wenezdee, abalị mbụ nke ọnwa Maachị, ka ọ kpọpụtachara mpụtara otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche nwetere n'ime steeti dị icheiche n'ala Nigeria.

Dịka o siri kọwaa, Maazị Tinubu nwètèrè vootu dị ndè asatọ, narị puku asa na iri itoolu na anọ, narị asaa na iri abụọ na isii (8,794,726) n'ọnụọgụgụ; ebe nwa amadi ahụ jiri aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘People's Democratic Party (PDP)’ wee zọọ ọkwa ahụ, bụ Atiku Abubakar nwètèrè vootu dị ndè isii, narị puku iteghete na iri asatọ na anọ, nà narị ise na na iri abụọ (6,984,520) n'ọnụọgụgụ, wee gbaa onye nke abụọ.

O mekwazịrị ka a mara na onye nke ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘Labour Party (LP)’ wee zọọ ọkwa ahụ, bụ Maazị Peter Obi nwètèrè vootu dị ndè isii, otu narị puku na otu, na narị ise na iri atọ na atọ n'ọnụọgụgụ, wee gbaa onye nke atọ; ebe onye òtù ‘New Nigerian People's Party (NNPP), bụ Maazị Rabbiu Kwankwaso gbàrà onye nke anọ.

Dịka iwu na-achị ala Nigeria siri kọwaa, onye ọbụla ga-eturu ugo dịka Onyeisiala Nigeria ga-enweterịrị pasenti iri abụọ na ise n'ime (opekata mpe) steeti iri abụọ na anọ n'ime steeti iri atọ na isii dị n'ala Nigeria, tinyere isi obodo Nigeria bụ FCT, Abuja.

N'ịgbasò nke a, Onyeisi INEC, bụ Ọkammụta Yakubu mèrè ka a mara na Tinubu nwètèrè pasenti iri abụọ na ise n'ime vootu niile a tụrụ n'ime steeti iri atọ. Dịka o siri kọwaa, Tinubu nwètèrè mmeri na steeti Rivers, Borno, Jigawa, Zamfara, Benue, Kogi, Kwara, Niger, Osun, Ekiti, Ondo, Oyo and Ogun states; Atiku won in Katsina, Kebbi, Sokoto, Kaduna, Gombe, Yobe, Bauchi, Adamawa na Taraba; ebe Atiku Abubakar nwètèrè mmeri na steeti Katsina, Kebbi, Sokoto, Kaduna, Gombe, Yobe, Bauchi, Adamawa Taraba, Osun, Akwa Ibom and Bayelsa states. Ọ sịkwazị̀ na Peter Obi nwètèrè mmeri na steeti Edo, Cross River, Delta, Lagos, FCT, Plateau, Imo, Ebonyi, Nasarawa, Anambra, Abia na Enugu; ebe Rabbiu Kwankwaso nwètèrè mmeri naanị n'ime steeti Kano.

Ọkammụta Yakubu nọ̀kwazị̀rị̀ nọ̀zị̀kwàrà otu ụbọchị Wenezdee ahụ wee nye Tinubu na onye òtù ya bụ Kashim Shettima asambodo na-egosi na ọ bụ ha tuuru ugo na nhọpụta ọchịchị ahụ, n'agbànyèghị̀ ihe dị icheiche ndị mmadụ na-ekwu banyere etu ya bụ nhọpụta izugbe siri gaa.

Ọ dị ncheta na ndị òtù ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche, nke gụnyere ‘Labour Party (LP)’, ‘People's Democratic Party (PDP)’, na ‘African Democractic Congress (ADC)’ nọrọ ụbọchị Tuzdee wee kwuo hoohaa na ha anabataghị mpụ̀tàrà nhọpụta ọchịchị ahụ ahụ a na-akpọpụ̀tasị site n'aka INEC, n'ihi ọtụtụ ihe dị icheiche adịchaghị ka ha siri kwesi na nhọpụta ahụ eme, etu e siri mee ya, na usoro e si edeputasị mpụ̀tàrà ya bụ nhọpụta.

Ha kwuru n'ebe o doro anya na mago-mago na ojoro jupụtàrà n'usoro e siri mee nhọpụta ọchịchị ahụ, ọkachasị dịka o siri metụta etu e si ewepụta mpụ̀tàrà ya.

Ụlọọrụ INEC kwùrù mgbe a na-akwado nhọpụta ọchịchị izugbe ahụ na ọ bụ site n'akụrụngwa ‘Biometric Verification and Accreditation System (BVAS)’ ka mpụ̀tàrà nhọpụta ọchịchị ahụ ga-esi na-agba ma na-edebanye onwe ha na amasaịba (website) INEC ngwangwa a na-atụ akwụkwọ, bụkwazị ebe a ga-esi wee na-akpọpụ̀tasị ha maọbụ ebe ọhaneze nwèrè ike ịga gụọ mpụ̀tàrà ahụ n'onwe ha.

Kaosiladị, ya bụ nkwà e kwere nwaanyị n'elu àkwà abịaghịzị na mmezu etu e siri kwuo ya, n'ihi na ọ bụzị aka ka ndị ọrụ INEC jiri wee deputasịa mpụ̀tàrà nhọpụta ọchịchị ahụ, bụkwazị nke ọtụtụ ndị mmadụ na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche na-ekwu ma na-ekwusi ya ike, sị na ọ bụghịzị ihe a tụrụ ka a na-akpọpụ̀ta.

N'ihi nke ahụ, ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ kpọ̀rọ̀ òkù ka INEC kwụsị ịkpọpụ̀tà mpụtara ahụ n'ihi na ọ bụghị ihe ụmụafọ Nigeria tụrụ n'awkwụkwọ ka a na-akpọputara ha. Ha kpọ̀kwàzị̀rị̀ òkù ka e mmegharị nhọpụta ọchịchị ahụ n'ụzọ ghe anya oghe nà n'ụzọ ụmụafọ Nigeria tụrụ anya.

N'iji kwàdó ebubo ahụ ha na-ebo nà e nwèrè wuru-wuru n'etu e si ahazi, na-edeputasị ma na-akpọpụ̀tasị mpụ̀tàrà nhọpụta ọchịchị ahụ, ndị otu ndọrọndọrọ ahụ kwùrù na mpụtara nke INEC kpọpụtara maka steeti Bauchi na steeti Gombe bụ otu ihe, nke bụ na otu ihe otu ndọrọndọrọ niile nwètèrè na Gombe ka ha nwetekwara na steeti Bauchi, e tinyeghị etinye, e wepughị ewepu.

Ha mekwara ka a mara na ọ bụ otu mpụtara na ọnụọgụgụ vootu e nwetara na mpaghara obodo Onyeisiala Muhammadu Buhari mgbe e mere nhọpụta izugbe afọ 2019 ka e nwetekwara n'ebe ahụ na nhọpụta izugbe nke afọ a; e tinyeghị etinye, e wepughị ewepu.

Ọ bụzị ihe ndị a na ihe ndị ọzọ dị otu ahụ méré ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị a dị icheiche ji akpọ òkù ka e lebàgharịa anya n'ihe INEC na-apịkọ, ma na-akpọkwa òkù ka e mmegharịa nhọpụta ọchịchị ahụ, iji hụ na ọ bụ onye ụmụafọ Nigeria họpụ̀tara ga-achị ha, na ọ bụghị onye INEC họpụ̀tara. Ha kpọkwara òkù ka Onyeisi INEC rịtuo n'ọkwa.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu n'okwu ahụ a kpụ̀ n'ọnụ ugbua, ụfọdụ ndị chịbụrụ ala Nigeria n'oge mbụ, Maazị Olusegun Obasanjo na Maazị Abdulsalam Abubakar kwùrù hoohaa na ihe ha na-ahụta anaghị agacha etu a tụrụ anya, ọkachasị dịka o siri metụta ihe ụlọọrụ INEC ji mpụ̀tàrà ntụ̀liaka akwụkwọ ụmụafọ Nigeria tụrụ atụ were eme. Ha tinyekwàrà ọnụ n'ihe gbasara etu INEC siri gharị̀pụ ụmụafọ Nigeria site n'esighị n'usoro BVAS wee tinye ma nabata mpụtara nhọpụta ọchịchị ahụ, dịka o kwèrè na nkwà oge a na-akwado nhọpụta ọchịchị ahụ.

Kaosiladị, nnukwu mmadụ abụọ a kpọrọ òkù ka a gbaso udo ma jiri amamihe wee soro ya bụ ihe, ọbụna dịka ha dụrụ INEC ọdụ ka o jiri asaa n'anya ma mee ihe ziri ezi tupu ihe emebie, maọbụ tupu ọ ghọ ahịa.

N'akụkụ nke ya, INEC nyèrè nkọwa banyere mkpesa niile ahụ ndị mmadụ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche nyere, ma kwuo na ọ haziri nhọpụta ọchịchị ahụ n'ụzọ ghe anya oghe.

Banyere BVAS, Ọkammụta Yakubu kọwàrà na ya bụ akụrụngwa nwèrè nsogbu ụbọchị ahụ a na-atụ akwụkwọ kpọmkwem, bụzị nke mere na mpụtara nhọpụta ọchịchị ahụ ejighị aka ya na-abanye na websaịtị, ha wee jiri aka na-edeputasị ya.

Ụlọọrụ ahụ gakwazị̀rị̀ n'ihu na-akpọpụ̀tasị mpụ̀tàrà nhọpụta ọchịchị ahụ e jiri aka wee dee, wee ruo mgbe ọ kpọpụ̀tàchara ha niile, we kwuwaa na ọ bụ Tinubu tuuru ugo. 

Yakubu gbàkwàzị̀rị̀ isi akwara na ya ga-akpọcha mpụ̀tàrà ahụ e jiri aka wee dee. O kwukwàrà na e nwèrè usoro iwu kwàdòrò mmadụ pụrụ isi chọọ ikpe nkwụmọtọ ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọ hụtara agachaghị ka o siri kwesi na nhọpụta ọchịchị izugbe ahụ e mere, bụ ụlọikpe.

Ka ọ dị ugbua, ya bụ mmiri dọ̀ọ̀rọ̀ adọ́rọ́, o nwebeghị onye ma ebe ọ ga-ehuga.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484