2023: INEC ekwenwòólá nkwà ịchịkọ̀bà ntụliaka ghe anya oghe

Dec 3, 2022 - 10:36
 0
2023: INEC ekwenwòólá nkwà ịchịkọ̀bà ntụliaka ghe anya oghe

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Dịka ụbọchị na-akpụdòbe n'ike n'ike maka ntụliaka izugbe ahụ a ga-eme n'afọ na-abịa abịa n'ala Nigeria; ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ịhazi nhọpụta ọchịchị n'ala Nigeria bụ ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission (INEC)’ ekwupụtala na ya dị ezi njikere ịhụ na e mere ya bụ ntụliaka n'ụzọ ghe anya oghe.

Onyeisi ụlọọrụ ahụ n'ime steeti Anambra, bụ Dọkịta Queen-Elizabeth Agwu, bụ ya kwupụtara nke a oge ọ gara kpọtụrụ eze ọdịnala Awka, bụ Igwe Gibson Nwosu n'obi ya dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Njem mkpọtụrụ ahụ bụ nke Dọkịta Agwu duru ụfọdụ ndị selitere isi n'ụlọọrụ INEC n'ime steeti ahụ wee gaa.

N'okwu ya n'ebe ahụ, ya bụ onyeisi ụlọọrụ INEC e wetere ọhụrụ n'Anambra kọwàrà na ebumnobi njem mkpọtụrụ ahụ bụ maka nkọwa na ịmara onye bụ onye, ya ịrịọ ngọzi na nkwàdó eze ọdịnala ahụ maka nhọpụta ọchịchị ahụ a ga-eme n'afọ ọzọ.

Ọ kọwàrà na ụlọọrụ INEC dị ezi njikere ịhụ na e nweghị ihe ọbụla ga-adọghàchi aka elekere azụ n'ịchịkọ̀bà nhọpụta ọchịchị ghe anya oghe ma gakwa siriri-werere n'afọ 2023. O mekwara ka a mara na usoro ọhụrụ ahụ e wepụtara maka ime ya bụ nhọpụta, bụ usoro ‘Bimodal Voter Accreditation System (BVAS)’ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche belata ohere igwù ojoro na ntụliaka izugbe ahụ.

Dịka ọ na-agwa ndị na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha hụta ya bụ ntụliaka dịka ihe nwanne na nwanne, ọ gwàkwàrà ha ka ha zeere ihe ọbụla nwere ike ibute tigbuo zọ̀gbuo n'oge ya bụ nhọpụta.

Dọkịta Agwu dụkwàrà ndị ntorobịa ọdụ ka ha hie asaa n'anya, ma gharakwa ikwe ka mmadụ ọbụla duhie ha maọbụ jiri ha kwara ngwaọrụ iweta nsogbu, ogbaaghara maọbụ ala adịghị mma n'obodo, ọkachasị n'ime oge nhọpụta ọchịchị a, bụkwa mgbe ọtụtụ ndị mmadụ ji atụfù ndụ ha n'ihe enweghị isi na ọdụ.

Na mmechi okwu ya, ọ gwara onye ọbụla tozuru okè isonye n'ịtụ akwụkwọ ka ọ gba mbọ pụta gaa tụọ akwụkwọ ụbọchị ahụ a ga-eme ya bụ ntụ̀liaka; ọbụna dịka o mere ka a mara na a ga-amalite ịkesa akwụkwọ ikike ahụ e ji atụ akwụkwọ n'oge adịghị anya, maka ndị debanyere aha n'akwụkwọ maka inweta nke ahụ.

Na nzaghachi, eze ọdịnala Awka, bụ Igwe Nwosu kèlèrè Dọkịta Agwu nà ndị ọrụ ya maka njem mkpọtụrụ ahụ, bụ nke ọ kọwàrà dịka nke magburu onwe ya. O kwèkwàzị̀rị̀ nkwà na ya ga-enye ụlọọrụ ahụ nkwàdó zuru okè iji hụ na o mere nke ọma n'ọrụ ya, ọkachasị dịka o siri metụta ịchịkọ̀bà nhọpụta izugbe a na-abịa abịa.

Ụfọdụ ndị ichie n'obi eze ahụ sonyèkwàrà n'ịnabata ndị ahụ oge ha bịara ya bụ njem mkpọtụrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484