Umu-Igbo ji onwe ha n'ala!

Jan 5, 2013 - 06:00
Jan 22, 2021 - 05:31
 0
Umu-Igbo ji onwe ha n'ala!

Abraham Madu, USA

Igbo bụ Igbo na-atụ ilu sị na ọ bụghị otuu akị-ilu na-ada na ntị ka ọ na-atọ n’ọnụ,HO! HA! Nke a na-akọwa na onye ihe dị mkpa na-eji ire ụtọ, ire ọma were na-arịọ ka e nyere ya aka gboo mkpa dakwasịrị ya.

Mgbe ọ hụrụ n’ego abatala na ya bụ elulo ị nyere aka tụpụta, ọ chọba ka o rie ya nanị ya. Na-agbanyeghị na ị so tụpụta elụlọ ego ahụ jirị pụta, ọ chọzịrị iri nanị ya.

Agwa dị otu a bụ ajọ agwa ụmụ-Igbo nile kwesiri ịkwụsị site tata. Onye erila dachie ụzọ. Onye anyụchila nsị ụzọ,ka ọ ghara izuta ijiji.

Onye iriri oke nke gị rikwa oke nke ya,obi agaghị adị ya mma. Ị gaghịkwa ahụ ihu na anya ị ga-eji rịọ ya ka o nyere gị aka gboo mkpa ọzọ ga-adakwasị gị. Maka na anụ gbalahụ gị tata, echi ka bụ kwa nta. Mkpa anaghị agwụ agwụ. Mmadụ bụ Chi mmadụ ibe ya n’elu-ụwa nke a.

Kama ihe ọma mụ mere mmadụ ibe mụ ga-egbu mụ, ya gbue onye mụ mere ya. Onye sị na ihe ọma adịghị ya mma, buru ọkụkọ ụzọ laba ụra,kpọm kwem!

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.