Ụlọelu Òkpùkpù Abụọ Adaala Na Nnewi, Mebisie Ihe

Sep 3, 2021 - 22:13
 0
Ụlọelu Òkpùkpù Abụọ Adaala Na Nnewi, Mebisie Ihe


Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu nwaanyị, bụ Oriakụ Gladys Ojukwu gbanahịrị ọnwụ ya n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị Tuzdee, dịka otu nnukwu ụlọelu nwere òkpùkpù abụọ dị n'akụkụ ụlọ ya dàrà na Nnewi, dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi North' nke steeti Anambra.

Ya bụ ụlọ ka e kwuru na a ka na-arụ ya arụ, ma bụrụkwa ụlọ otu nwoke, bụ Maazị Benjamin Okeke, onye e kwuru na ya na di nwaanyị ahụ ụlọ ahụ chọrọ itigbu, bụ Maazị Clement Ojukwu enwebụọla okwu maka ya.

Oge ọ na-akọwa ka ya bụ ihe siri mee, Maazị Ojukwu kwuru na ya hapụrụ ụlọ ya oge o jiri nkeji iri na ise gata elekere asaa nke ụtụtụ, mana ya nwetara òkù ekwentị site n'aka otu onye agbataobi ya, Maazị Samuel Ejizu, onye gwara ya na ụlọ ahụ a na-arụ ọhụrụ n'akụkụ be ya adaala, ma gwakwa ya na nwunye ya nọbụ n'ụsekwu esi nri tupu ya bụ ụlọ daa, nke mere o jiri dị mkpa na ọ laghachiri azụ n'ụlọ, iji mara ka nwunye ya sirri nọrọ, nà etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.

O kwuru na ọ gwazịkwara ya bụ nwoke kpọrọ ya ka o duru ndị mmadụ gaa be ya mara ka ọnọdụ nwunye ya siri dị; ma sịkwazie na obi tọrọ ya ụtọ mgbe nwunye kpọrọ ya n'ime nkeji ise o jiri zacha ekwentị onye agbataobi ahụ. Ọ sị na nwunye ya kọkwàzịịrị ya ka ya bụ ihe siri mee.

Maazị Ojukwu gakwara n'ihu kọwaa  na ya na nwoke nwe ụlọ ahụ agaala ụlọikpe banyere ya bụ ụlọ, n'ihi na ọ bụghị naanị na ụlọ ahụ dị nso nke ukwuu n'ụlọ nke ya, kama na onye nwe ya rụụrụ ya gafèé ebe ókè siri dị, n'agbanyeghị aka ọ dọrọ ya na ntị na ndụmọdụ o nyere ya banyere nke ahụ. O kwuru na ọ bụ n'okwu ahụ ka ha ka nọ, ihe ahụ wee mee.

Mbọ niile a gbara iji nweta ọnụ okwu nwoke ahụ nwe ụlọ ahụ dara ada, bụ Maazị Okeke, amịtàghị mkpụrụ, n'ihi na o nwebeghị onye hụrụ ya anya maọbụ nụ olu ya na gburugburu ụlọ kemgbe ya bụ ihe   mechara.

Ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere na-ekwukwa na ha ka na-eleghasị anya n'ebe ahụ ya bụ ụlọ dara, iji mara ma o nwèrè onye so arụ ọrụ ebe ahụ ụlọ ahụ dadoro n'elu; ọbụladị dịka ụfọdụ ndị ma nke ekwe na-akụ n'ewumewu ụlọ kwukwazịrị na agbasòghị usoro na ogoogo kwesiri ekwesi were arụ ya bụ ọrụ, nke mezịrị o jiri daa.

Nwaanyị ahụ n'onwe ya, bụ Oriakụ Ojukwu kelere Chukwu maka ịzọpụta ya, ma kpọkuo ndị na-arụ ụlọ ka ha na-agbaso ogoogo na usoro kwesiri ekwesi, jirikwa akụrụngwa kwesiri ekwesi wee na-arụ ụlọ, ma kwụsịkwa iji ndụ ụmụ mmadụ egwu egwu, maka na ụwa bụ ofu mbịa.

Ihe dị icheiche ụlọ ọdịda ahụ mebisiri be Maazị Ojukwu gụnyere ogige ụlọ ígwè ọkụ ya na ígwè ọkụ dịgasị n'ime ebe ahụ, ọgbatumtum atọ, efere, igwe njụoyi ya, ihe o ji esi nri na nke e ji eghe ihe oghighe, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ o mebisiri, ọkachasị n'ụsọekwu ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484