Òtù UN Enyela Obianọ, Ọkpala Nkwanyeùgwù

Sep 17, 2021 - 23:39
 0
Òtù UN Enyela Obianọ, Ọkpala Nkwanyeùgwù

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ka ọ dị taa, ndị òtù mba ụwa 'United Nations' (bụ UN n'aha ịchàfụ) achọọla aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ mma site n'inye ya nkwanyeùgwù dịkà Ọkàibe na Mmepe Tọrọ Àtọ (Champion of Sustainable Development).

Ịchọ mma a bụ nke e mere site n'aka onye ọrụ UN na-ahụ maka ihe metụtara mmadụ n'ala Nigeria, bụ Maazị Edward Kallon, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbia. Maazị Kallon dùkwàrà ndị ọrụ òtù mba ụwa dị icheiche, nke gụnyere òtù WHO, òtù EU wee bịa ya bụ mmemme.

N'okwu ya n'ebe ahụ, o mere ka a mara na nkwanyeùgwù ahụ bụ maka ezi ọrụ mmepe na ọrụ nnwògharị dị icheiche Gọvanọ Obianọ na-arụ na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ, nke gụnyere ngalaba ahụike, ngalaba akụnụba, ngalaba ọrụ ugbo, ngalaba nchekwa, ngalaba ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ, na ngalaba ndị ọzọ.

O kpupuuru Gọvanọ Obianọ okpu maka iji akụrụngwa ọgbaraọhụrụ bụ ịgbà wee na-ebuso mpụ, arụrụala, ntọ, ohi na ndị omekoome ndị ọzọ agha ma na-achụkwa ha ọsọ ụkwụ eruala na steeti ahụ; kọwaa na ya bụ Gọvanọ agbaala mbọ dị iche iche n'ijikọta mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ọnụ n'ihe gbasaara mmepe; ọbụladị dịka o kwupụtara mmasị òtù UN nwere ịkwalitekwu njikọaka ọnụ ya na steeti ahụ.

O tòkwàrà Gọvanọ Obiano maka agadaga ọrụ mmepe gbara ọkpụrụkpụ ọ rụgoro na nsonso a na steeti ahụ, nke gụnyere ọdụ ụgbọelu Anambra na ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ ọ rụgoro. Ọ rịọkwazịrị Gọvanọ ahụ ka ọ gba mbọ tinye amụma iwu kwesiri ekwesi n'ọrụ, maka ichekwaba ihe dị icheiche ọ na-arụ na steeti ahụ, na ihe ndị ojiegoachụego rụnyere na steeti ahụ, tupu ọ rịtuo n'ọkwa.

O kwere nkwà na òtù UN ga-eji usoro MIDAS (Migration Data Systems) wee kwàdó ọdụ ụgbọelu ahụ; kpọpụtasịa uru dị icheiche ọdụ ụgbọelu ahụ ga-ewèta na steeti ahụ nà nà steeti ndị ọzọ gbara ya gburugburu.

Ọ kpọpụtasịkwara ihe ndị ọzọ Gọvanọ ahụ mepụtasịrị na ngalaba dị icheiche, ọkachasị dịka o siri metụta mmepe ime-ime obodo, nà ngalaba ndị ọzọ, ma gwa ya ka o jisie ike n'ọrụ.

Na nzaghachi, Gọvanọ Obianọ kelere ndị òtù ahụ maka ịchọ mma ahụ, mee ka a mara na isi sekpụ ntị n'ọrụ mmepe niile ahụ ọchịchị ya rụgoro na steeti ahụ bụ iji nwògharịa ngalaba niile nke steeti ahụ ma mee ka ọ bụrụ ejiamaatụ n'ihe gbasaara ezi ọnọdụ mmepe, ọnọdụ akụnụba, ọnọdụ ahụike, na n'ezi ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ. 
Ọ kọwàkwàzịrị na ihe niile ahụ na-abịa na mmezu n'ozuzuoke, ma kwezie nkwà na onye ga-anọchi anya ya ma ọ chịchaa, rituo n'ọkwa ga-amalitekwa ebe ya onwe ya kwụsịrị n'ọrụ mmepe ahụ.

Ndị òtù UN nọkwàzịrị na mmemme ahụ wee chọkwa Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Okpala, nà onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Health Insurance Agency (ASHIA)', bụ Dọkịta Simeon Onyemaechi mma n'otu oge ahụ, maka ezi ọrụ ha na ngalaba ahụike steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484