Òtù 'The Siere Foundation' Achịkọbala Asompi Ịkpọ Ụbọ n'Anambra

Dec 16, 2020 - 16:51
Jan 30, 2021 - 16:52
 0
Òtù 'The Siere Foundation' Achịkọbala Asompi Ịkpọ Ụbọ n'Anambra

Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka òtù nnọrọonwe a maara dịka 'The Siere Foundation' chịkọbàra ma hazie mmemme asọmpi onye kacha akpọ ụbọ na steeti Anambra, bụ àgbà nke mbụ ya a na-eme ụdị ihe ahụ n'ime steeti ahụ.

Ya bụ mmemme asọmpi wééré ọnọdụ n'Awka bụ nke a kpọrọ 'Kedụ Ka Ị Si Mara Akpọ Ụbọ? (Nchọgharị Maka Onye Kachasị Mara Akpọ Ụbọ n'Anambra 2020', ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche, tinyéré ọtụtụ ndị na-eme mmadụ obi añụrị, bụ ndị sitekwara ebe dị iche iche wee bịa isònyè na ya bụ mmemme.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onye chịkọbàrà ya ma bụrụkwa onyeisi òtù 'The Siere Foundation' bụ Ọkaiwu Anthony Kelechi Agbasiere kwùrù na ebumnobi asọmpi ahụ na mmemme ahụ bụ iji kwàdo ndị ntorobịa, ma chọpụtakwa ọnatarachi zoro ezo ha nwèrè, sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ kwàlite ọdịmma ndị ntorobịa na mmepe obodo.

Ọkaiwu Agbasiere, onye bụkwa onye ọrụ obi ebere ma bụrụkwa onye ọrụ ikpe na-ewu èwù na mba ụwà kèlèrè ndị dị iche iche tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, iji hụ na ya bụ mmemme gara nke ọma, ma kwezie nkwà na ọ ga na-emezị ya bụ mmemme na asọmpi kwà ahọ ọbụla, ma gbasàwanyekwuo ya, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche mmemme na asọmpi dị etu ahụ na-ewèta na ndụ ndị ntorobịa na na mmepe obodo.

N'okwu ya oge a na-enye ya onyinye nkwanyeugwù na mmemme ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka àlà na steeti Anambra, bụ Maazị Bonaventure Enemali kọrọ akụkọ banyere ihe dị iche iche o mepụtara na usoro dị iche iche o siri kwàdo ndị ntorobịa oge ọ nọ n'ọkwa dịka Kọmishọna na-ahụ maka ndị ntorobịa na steeti ahụ, ma kelezie nwa amadi ahụ chịkọbara mmemme ahụ maka ya bụ ọmarịcha atụmatụ, bụ nke ọ kọwàrà dịka nke magburu onwe ya.

N'okwu ha n'otu n'otu, ndị ọzọ e nyèkwàrà onyinye nkwanyeugwu na mmemme ahụ, nke gụnyere onyeisi ụlọọrụ GSS, bụ Maazị Chukwudị Ezenwa, na onyeisi ogige Oma Event Centre na X-Fit, bụ Maazị Ndubuisi Onwuakpa, mere ka a mara na ọ bụ ihe dị oke mkpà ịkwàdo ndị ntorobịa n'ihi ọtụtụ ụzọ dị iche iche nke ahụ ga-esi kwàlite mmepe na ọganihu obodo.

Ha kèlère Agbasiere bụ onye haziri asọmpi ahụ, ma kpọkuo ya ka o jisie ike, maka na nke ahụ ga-amịta ezi mkpụrụ n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche.

E wezùga asọmpi ịkpọ ụbọ ahụ e mere, bụ nke Alex Ugwu tuuru ugo na ya wee nweta ego nrita dị otu narị puku naịra (N100,000); a nọkwara na mmemme ahụ wee gbaa egwu, mee ihe ngosi dị iche iche, ma mekwa soro m chịa, site n'aka òtù na ndị mmadụ dị iche iche, nke gụnyere Humble Smith, Chief Imo, Prince Neche, Yanbaba, tinyéré ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.