Òtù Ọrụ Obiebere Arụọrọla Ụlọakwụkwọ Odekpe Oche Ụmụakwụkwọ n'Efu

Jul 26, 2021 - 06:16
 0
Òtù Ọrụ Obiebere Arụọrọla Ụlọakwụkwọ Odekpe Oche Ụmụakwụkwọ n'Efu

Izunna Okafor dere akụkọ a


N'ịga n'ihu n'ezi ọrụ ya n'ịkwàlitè mmepe obodo, òtù ọrụ obiebere a maara dịka 'Okai Nweze Foundation' arụọrọla ma bunye ụmụakwụkwọ na-agụ n'ụlọakwụkwọ 'Odekpe Central School' ọtụtụ oche agụmakwụkwọ na oche ụmụakwụkwọ ji anọ ọdụ, n'efù.

Òtù ahụ, bụ otu nnọrọonwe, mèrè mmemme nyefè oche ọhụrụ ahụ na nsonso a n'ụlọakwụkwọ ahụ dị n'Odekpe, n'okpuru ọchịchị Ọgbaru, na steeti Anambra, bụkwa mmemme dọtara ọtụtụ ndị selitere isi nà ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba na-ahụ maka ihe gbasaara agụmakwụkwọ na steeti ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-enyefè ndịisi ụlọakwụkwọ ahụ oche ahụ, onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi òtù ahụ, bụ Helen Adaeze Obah Osonowo kọwàrà na ọ bụ n'ahọ ise gara aga ka e hibere ya bụ òtù, ma kọwaa na ebumnobi e jiri hibe ya gụnyèrè iji nyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka ma nyekwa aka gbòó nsogbu dị iche iche na-echere ndị mmadụ, ọkachasị dịka o siri metụta nsogbu énwëghị ihe oriri, ebe obibi, agụmakwụkwọ na ihe ndị ọzọ dị oke mkpà na ndụ mmadụ.

Ọ gakwazịrị n'ihu mee ka a mara na onyinye oche ahụ ha nyere ụlọakwụkwọ ahụ bụ otu n'ime ụzọ dị iche iche ha si atụnye ụtụ n'ịkwàlìtè ọnọdụ agụmakwụkwọ na mmepe obodo.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Universal Basic Education Board (ASUBEB)', bụ Maazị Patrick Ugbaja, nke ọ bụ Oriakụ Uche Okeke nọchitere anya ya, nà odeakwụkwọ ngalaba agụmakwụkwọ na mpaghara Ogbaru (Ogbaru Education Zone) bụ Maazị Chike Uzor kèlèrè òtù ahụ maka ezigbo onyinye ahụ na ọrụ ọma ndị ọzọ ha na-arụ n'ịkwàlìtè agụmakwụkwọ, ma kwuo na nke ahụ dabàrà adabà n'ebumnobi ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ nwere inwoghàrị ọnọdụ agụmakwụkwọ steeti ahụ. 

Ha kpọkukwàzịrị òtù dị iche iche na ndị ọzọ bụ ndị akajiakụ ka ha ñòmie ụdị ọmarịcha omume ahụ site n'ịtụnyekwa ụtụ nke ha n'ịkwàlite ọnọdụ agụmakwụkwọ ka ọ nọrọ n'ogoogo dị elu nke ukwuu.

Na ntụnye nke ha, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Ọkaiwu Innocent Nwanosike nà nne onye ahụ nyere onyinye ahụ, bụ Oriakụ Aghasinweze Obah kwupụtàrà obi ụtọ ha maka iji anya ha hụ mmemme ahụ, ma kọwaa ya bụ nwaanyị ahụ dịka ezigbo onye ọrụ obiebere na-agbasò ma na-eñòmi nzọụkwụ nna ya lagoro mmụọ, bụ Maazị Chukwulo Obah. Ha dụkwàrà ndị mmadụ ọdụ ka ha bido inye aka na ịtụnye ụtụ n'ịkwàlitè ọnọdụ agụmakwụkwọ.

Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Oriakụ Elizabeth Obiora kèlèrè òtù ahụ na nwaada ahụ nyere ha onyinye afọ ofufo ahụ, ma kwezie nkwà itinye oche niile ahụ n'ọrụ ma lekọtakwa ha etu o siri kwesi ekwesi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484