Otu Onye Anwụọla Dịka Ndị Mmanwụ Wakpòrò Ndị Ụka Alakụba n'Osun

Jun 29, 2021 - 03:45
Jun 29, 2021 - 20:19
 0
Otu Onye Anwụọla Dịka Ndị Mmanwụ Wakpòrò Ndị Ụka Alakụba n'Osun

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlaga sị na ọ bụrụ na ya apịaghị ụtarị, ụmụaka anaghị ama na ọ bụ mmanwụ.

N'ịgbaso nke a, mmanwụ nọrọ na nsonso a wee ndị okpukperechi ụka alakụba (bụ ndị Muslim) ebe ha nọ n'ụlọụka n'Osogbo bụ isi obodo steeti Osun ụbọchị ụka gara aga, gbuo mmadụ ma bibisiekwa ọtụtụ ihe n'ebe ahụ. 

Mwakpò ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka alakụba 'Kamorudeen Central Mosque' dị na Oluode Aranyin, n'Osogbo, ma bụrụkwa nke malitere oge o jiri ọkara gata elekere abụọ nke ehihie ụbọchị ụka ahụ oge ndị alakụba ahụ nọ n'ụlọụka ahụ wee na-ekpe ekpere maka ọnọdụ ala Nigeria.

Dịka akụkọ siri kọọ, otu onye nwụrụ, ebe mmadụ ruru iri na abụọ n'ọnụọgụgụ, nke gụnyere ụfọdụ ụmụaka erubeghị ahọ iri na asaa, nwetere mmerụahụ site na mgbọ égbè a gbara n'ebe ahụ oge ya bụ nsogbu dapụtara; ma bụrụkwazie ndị nọ n'ụlọọgwụ sị iche iche ugbua anara ọgwụgwọ.

Otu nwata nwoke gbara ahọ iri na abụọ, bụ Abduljeleel Ali nwètèrè àpà mgbọ égbè n'obi; nwata nwoke ọzọ, bụ Adebayo Awolesin gbara ahọ iri na ise nwètèkwàrà àpà mgbọ nke ya n'aka, ebe Taofeeq Fatai na Maliq Abdukabir nwetekwara mmerụahụ mgbọ égbè nke ha ma bụrụkwazie ndị nọ n'ụlọọgwụ ugbua anara ọgwụgwọ.

E bibìkwàrà ugegbe ụgbọala 'Camry' na nke ụlọụka alakụba ahụ oge ahụ ya bụ nkwàtụ dapụtara.

Akụkọ kọrọ na òtù jikọtara ndị alakụba ahụ a maara dịka 'Kamorudeen Islamic Society of Nigeria' chịkọbara ọgbakọ ekpere pụrụ iche iji kpee ekpere banyere ọnọdụ ala Nigeria, bụkwa nke ọtụtụ ndị òtù ahụ n'ime steeti ahụ sonyere na ya. Ọ bụzị dịka ya bụ ọgbakọ ekpere na-aga n'ihu ka ndị mmanwụ ahụ wakporo ha, ha wee kwàtụọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ oge a na-agba ya ajụjụọnụ n'ụlọọgwụ ebe ọ na-anara ọgwụgwọ, otu onye n'ime ndị ihe ahụ metụtara, bụ Maazị Isiaka Ajagbe gbárá ahọ iri atọ na asaa kọrọ akụkọ na ọ bụ Maazị Kayode Esuleke nọ n'isi ọgbakọ ekpere ahụ ma na-edebe ụka oge ya bụ ihe dapụtara. 

O kwuru na ọ bụ oge ya bụ ọgbakọ ekpere na-aga n'ihu ka ndị mmanwụ ahụ gafechaara ebe ahụ, wee laghachi azụ n'ebe ahụ ọzọ, wee wakpo ha, bido tụba ha okwute, wee ruo mgbe a malitezịrị ịgba égbè

Ọ sị na ha nọọrọ onwe ha na-emere onwe ha ekpere, ndị mmanwụ ahụ wee bịa wakpo ha, site n'ibu ụzọ tụba ha okwute, wee bidokwa gbaba ha égbè, bụzị nke e sitere na ya wee gbagbuo otu onye n'ebe ahụ, ma nyekwa ọtụtụ ndị mmadụ mmerụahụ.

Dịka ọ na-akọwa etu ndị mmanwụ ahụ ndị uweeoji nà-èché nche siri wee tụọ n'ebe ahụ, Onye Imam nke ụka alakụba ahụ, bụ Kazeem Yunus, kwùrù na ndị mmanwụ ahụ gbara onyeisi ha, bụ Maazị Moshood Salawudeen égbè n'isi, ma o kubizịrị ume, nwụọ n'ụzọ, oge e bu ya aga ụlọọgwụ maka inye ya ọgwụgwọ.

O mèkwàzịrị ka a mara na ndị òtù ha ruru iri na abụọ n'ọnụọgụgụ nwètàrà àpà mgbọ ma nọrọkwazie n'ụlọọgwụ 'Osun State General Hospital, Asubiaro', 'Osogbo Central Hospital' na 'UNIOSUN Central Hospital' ugbua were na-anara ọgwụgwọ, ebe a dọnyekwazịrị ozu onye nke ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ 'UNIOSUN Teaching Hospital' na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484