Oriakụ Obianọ Enyela Ndị Iju Mmiri Chụpụrụ Nkwàdo

Oct 21, 2020 - 23:02
Jan 28, 2021 - 23:03
 0
Oriakụ Obianọ Enyela Ndị Iju Mmiri Chụpụrụ Nkwàdo

Izunna Okafor

Nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ nọrọ na nsonso a wee jiri ihe enyemaka dị iche iche wee kwàdo ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ be ha n'ime okpuru ọchịchị ime obodo dị iche iche na steeti ahụ.
Ibunye na ikesà ihe enyemaka ahụ bụ nke Oriakụ Obianọ mere site n'okpuru atụmatụ òtù ọrụ obi ebere ya, bụ 'Caring Family Enhancement

Initiative, CAFE', ma bụrụkwa nke e mere n'ogìgè ụlọikwuu ebe ahụ ndị iju mmiri chụpụrụ be ha nọ, ma n'okpuru ọchịchị Ọgbaru ma na 'Onitsha North' 

Ihe dị iche iche e buyere ndị ahụ gụnyèrè nri, ọgwụ, ákwà, àkwà, ihe e ji akwàlite adịmocha, nakwa ihe ndị ọzọ e ji akwàlite ọnọdụ obibindụ.

N'okwu ya oge ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n'aka ògìgè ahụ, Oriakụ Obianọ mèrè ka a mara na gọọmenti steeti ahụ kpebìrì ịgbasi mbọ ike ịhụ na ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ na be ha nwèrè ezi ọnọdụ obibindụ bụ ịgbà n'ogìgè ebe ahụ ha nọ ugbua ezere iju mmiri ahụ, ma kwe nkwà na ọ gaghị ada mbà inye ha nkwàdo.

Ọ gbarụrụ ihu bànyere iju mmiri ahụ na mkpamkpa dị iche iche o megoro na mpaghara ebe ahụ nakwa etu o sigoro tinye ụmụ mmadụ n'ọnọdụ ịkwa àrịrị. O kwuzịrị na ọ bụ ihe ahụ ndị ahụ na-agabiga mere o jiri sị ka ọ bịa leta ha, ka ọ marakwa ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisioche okpuru ọchịchị Ogbaru, bụ Maazị Arinze Awogu kèlèrè Oriakụ Obianọ maka mgbataọsọ ya, nakwa nkwàdo gọọmenti steeti ahụ na-enye, ma kpee ka Chineke gaa n'ihu ịgba ha ume na ịgọzi ha mmaji kwuru mmaji. 


O kwuru na mmadụ ruru ótù puku, narị isii na iri atọ na ótù n'ọnụọgụgụ nọ n'ụlọikwuu nke dị n'Ọssọmala ugbua ezere ndụ ha n'ihi iju mmiri, ebe mmadụ ruru otu puku, narị asaa na iri atọ na ise n'ọnụọgụgụ nọ n'ụlọikwuu nke Atanị; mmadụ ruru narị iteghete na iri asaa na asatọ nọkwazị n'ụlọikwuu nke dị n'Odekpe. O kelekwazịrị gọọmenti steeti ahụ maka ibido n'oge wee kwadobere ha ọnọdụ na ebe obibi ahụ ha nọ ugbua, tinyekwara nkwàdo ndị ọzọ gọọmenti na-enye ha bụ ndị bi ebe ahụ ugbua nakwa ndị ọzọ iju mmiri chụpụrụ na be ha na mpaghara ebe dị iche iche.

Ndị ọzọ dị iche iche kwuru okwu na njem nleta na nkwàdo ahụ gụnyèrè Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Okpala; Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụaka na ndị nne, bụ Oriakụ Ndidi Mezue, tinyéré ụfọdụ ndị dị iche iche bi n'ụfọdụ ụlọikwuu ahụ a gara ụbọchị ahụ, bụ ndị kelere Oriakụ Obianọ maka mgbataọsọ ya ma dụọ ya ọdụ ka o jisie ike n'ọrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.