Onyisioche kọmitii Ụlọ-omeiwu Rep n’ahụ maka nyocha nrụrụaka na NDDC arịtuola n’oche ya

Jul 21, 2020 - 17:18
Jan 26, 2021 - 17:18
 0
Onyisioche kọmitii Ụlọ-omeiwu Rep n’ahụ maka nyocha nrụrụaka na NDDC arịtuola n’oche ya

By Chidimma Nwogu, VON

Onyisioche Kọmitii Ụlọomeiwu Rep na-ahụ maka nyocha nrụrụaka n’aga n’ụlọọrụ Niger Delta Development Commission (NDDC) bụ Mazị Olubumi Tunji-Ojo arịtuola n’ọkwa ya.

Ihe kpalitere nke a bụ ebubo eboro ya n’aka ya so na nrụrụaka anaeme na NDDC. 

Mazị Tunji-Ojo rituru n’ọkwa ya ụnyaahụ bụ Mọnde na Abuja, na nyocha anaeme maka ego ruru ijeri iri anọ emefuru n’ụzọ na-ezighiezi n’ụlọọrụ NDDC. 

Tupu ya arịtuo n’ọkwa onyisioche kọmitii, Tunji-Ojo kwuru na dịka onye omeiwu Ụlọomeiwu Gọọmenti-Etiti , na ya kwụbara aka ya ọtọ n’ịgara ọhaneze ozi mgbeniile. 

Na Tọzdee izuụka garaaga, ‘Interim Management Committee’ nke NDDC hapụrụ nyocha Ụlọomeiwu naeme pụọ maka ebubo ha boro Tunji-Ojo maka nrụrụaka n’ụlọọrụ NDDC. 

Onye bụzi onyisioche nyochaa na-aganihu ugbu a bụ Mazị Thomas Ereyitomi, onye bụbuuru osote onyisioche kọmitii ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.