Onye Nigeria Na-Arịa Korona Atàála Onye Nọọsụ Arụ Na China

Apr 9, 2020 - 06:08
Jan 21, 2021 - 06:10
 0
Onye Nigeria Na-Arịa Korona Atàála Onye Nọọsụ Arụ Na China

By Izunna Okafor

Otu nwaafọ Nigeria na-arịa ọrịa korona na mba China ataala onye nọọsụ mba China na-elekọta ya arụ, dịka ọ na-agbakàrị àlà isi ebe a na-elekọta ya gbapụ.

Ya bụ nwa amadi, bụ Maazị Patrick Chika Okonkwonwoye ka e kwuru na ọ dị ahọ iri anọ na asaa, ma bụrụkwa onye nọgoro n'ogige ebe nlekọ ahụike ahụ kemgbe abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị, oge e lelechaara ya ahụ wee chọpụta na ọ bu ọrịa korona n'eziokwu.

Akụkọ kọkwara na ya bụ nwoke tìrì nwaanyị nọọsụ ahụ ihe n'abalị mbụ nke ọnwa Epure oge o gbochiri ya ịpụ na wọọdụ nke ya n'ogige ebe ahụ a na-elekọta ya dị na Guangzhou, na mpaghara ndịda anyanwụ China.

Dịka ozi e nwetara site n'aka ndị uwe ojii siri kwuo; ihe butere ịtà arụ ụbọchị ahụ bụ na nọọsụ ahụ, bụ Nwaada Wang Hong gakwuru ya bụ nwoke ahụ wee gwa ya ka e mee ya mnwàle ọbara ya, mana ọ gbakụtara ya azụ, wee bilie ka ọ pụọ na wọọdụ nke ya n'ogige nlekọta ahụ; nọọsụ ahụ wee kwechiri.

Nke a mezịrị ha abụọ jiri malite ịba mba, wee ruzie oge nwa amadi ahụ dakpòrò ya bụ nọọsụ, ma were eze gwa ya ihe nkịta pụrụ ime nchì. Arụ ahụ ọ takasịrị nwaanyị ahụ bòrò ya apa n'ebe dị iche iche, nke gụnyere ihu, olu na úkwù ya, tinyekwuoro na ya bụ nọkwazị n'ajọ ọnọdụ ibute ọrịa dị iche iche ugbua, tinyere ọrịa korona, maka na ọ bụ naanị ákwà nchekwa ahụike ka o yi oge ahụ.

Ka o sila dị, ndị uwe ojii mba ahụ ka tọrọ nke ahụ ma kwuo na ha agaghị anagide maọbụ leghara ya anya, n'ihi na nke megidere iwu ha. A ka na-elabara ya bụ okwu anya ugbua, ebe e jidekwara nwa amadi ahụ ji eze alụ ọgụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.