Olofu Awụchaala n'Anambra Dịka Onyeisi Ndị Uweojii Ọhụrụ Steeti Ahụ

Sep 16, 2021 - 21:52
 0
Olofu Awụchaala n'Anambra Dịka Onyeisi Ndị Uweojii Ọhụrụ Steeti Ahụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Igbo sị na ọ na-adị mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ.

N'ịgbasò nke a, CP Tony Olofu awụchaala ma malite ọrụ na steeti Anambra dịka onyeisi ọhụrụ nke ndị uweojii na steeti ahụ, ma bụrụkwa onyeisi nke iri abụọ na iteghete steeti ahụ nwègoro, dịka onye jibụ ọkwa ahụ bụzị onye nke e buliri n'ọkwa dị elu ma wegazie ya n'ebe ọzọ.

N'okwu ya na mmemme mkparịtaụka mbụ ya na ndị nta akụkọ steeti Anambra nwere n'isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ dị n'Amawbia, CP Olofu kelere Chineke maka ebere ya na ndụ ya, ma kelekwa onyeisi ndị oweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Alkali Baba Usman, psc (+), fdc, NPM maka ịhụta ya dịka onye tozuru òkè ịbụ onyeisi ndị uweojii steeti Anambra.

Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe a gwagoro ya kacha echere ọnọdụ nchekwa aka mgba na steeti ahụ, nke gụnyere ohi, ịtọrọ mmadụ, otu nzuzo, ịma aka akpà, nsogbu ịzọ ókè ala, nsogbu ịzọ ọchịchị obodo, nsogbu ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo, iwakpò ndị ọrụ gọọmenti, ndị ọrụ nchekwa na ndị mmadụ nkịtị aka ha dị ọcha, steeti ahụ ga-aga n'ihu ịrụsi ọrụ ike n'agha ahụ a na-ebu megide mpụ na arụrụala n'ime steeti ahụ. 

Ọ kọwakwara na a gwakwala ya banyere nkwàdo dị icheiche Gọvanọ steeti ahụ, bụ Willie Obianọ na-enye ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ dị icheiche na steeti ahụ, ma kelee ya bụ Gọvanọ maka ezi ọrụ nkwàdo ahụ, kwe nkwà na ya na ọchịchị steeti ahụ ga-aga n'ihu ijikọ aka n'ọrụ.

O kwuru na ọ ga-amàlite ebe onye nke pụrụ apụ rụdobere, ma welitekwuorị aka n'ọrụ ime ka steeti ahụ gaa n'ihu ịnọ n'ọnọdụ ịbụ steeti kachara nwee ezi nchekwa n'ala Nigeria.

O kwuru na ọchịchị ya ga-etutekwa atụmatụ nchekwa bụ, ma busie agha ike megide nsogbu otu nzuzo, izu ohi, ntọrị mmadụ, na ịna ego n'ụzọ iwu akwadòghị na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ.

Ọ kpọkuzịrị ndị omekoome na ndị ọzọ na-ewèta àlà adịghị mma na steeti ahụ ka ha sepụ aka n'arụrụala maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ na steeti ahụ, n'ihi na ọnọdụ ga-akawanyere ha njọ na steeti ahụ ugbua.

CP Olofu gbarụkwàrà ihu megide mgbasaozi ụgha na ibugharị akụkọ abụghị eziokwu n'ime steeti ahụ, bụ nke ọ kọwara dịka nke nwere ike ibute ọgbaaghara n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị na-eme ihe dị etu ahụ ka ha sepu aka na ya, maọbụ dị njikere ịgba egwu ọbụla iwu ga-akụrụ ha ma e jide ha.

Dịka ọ na-adọ ndị uweojii steeti ahụ aka na ntị ka ha dị uchu n'ọrụ ha ma rụọ ya n'usoro iwu kwàdoro site n'ịsọpụrụ ikike dịịrị mmadụ, ya bụ onyeisi ndị uweojii rịọkwazịrị njikọaka ọhaneze, ndị nta akụkọ na ụlọọrụ dị iche iche na steeti ahụ, iji nyere ha aka n'ọrụ inye steeti ahụ ezi nchekwa. 

O nyekwara ndụmọdụ ka onye ọbụla nwere ozi ọbụla ga-enyere ndị uweojii aka n'ọrụ nchekwa maọbụkwanụ onye ọbụla ọnọdụ ọjọọ maọbụ ihe meberede ọbụla dabìdòrò kpọtụrụ ha bụ ndị uweojii ozigbo site n'akara ekwentị 112 maọbụ 07039194332 ka e wee gbatara ya ọsọ enyemaka aka-ọkụ aka-ọkụ.

Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Toochukwu siri kọwaa, CP Tony Olofu, onye a mụrụ n'ahọ 1963, bụ onyeisi ụweojii nke iri atọ na otu e zitegoro na steeti Anambra; ma bụrụkwa onye jigoro ọkwa n'ogoogo dị icheiche na mpaghara ebe dị icheiche n'ala Nigeria. Ọ bụ onye sitere okpuruọchị Apa, nke steeti Benue.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484