Okwuosa Akọwaala Mkpa Ọ Dị Inweta Nkwàdo Gọọmenti Tupu A Rụba Ụlọ

Jan 27, 2021 - 21:43
 0
Okwuosa Akọwaala Mkpa Ọ Dị Inweta Nkwàdo Gọọmenti Tupu A Rụba Ụlọ

Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-adị mma ịma ọkwa mmiri tupuu ozuzo ya, maka na mgaramara na-ekpèkarị azụ.

Ka ọ dị taa, a kpọkuola ma dụọ ndị na-arụ ụlọ ka ha gbaa mbọ hụ na ha kpọtụụrụ gọọmentị ma nwèta nkwàdo na ikike site n'aka ụlọọrụ kwesiri ekwesi tupu ha amalite ime nke ahụ, iji gbanahị ịkwa mgaramara n'ikpeazụ.

Ndụmọdụ a bụ nke e nyere site n'ọnụ onyeisi ụlọọrụ 'Awka Capital Territory Development Authority' (ACTDA), bụ Maazị Amaechi Okwuosa, n'okwu ọ gwara onye nta akụkọ anyị n'isi ụlọọrụ ya dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke o sitere na ya wee katọọ ma gbarụọ ihu banyere etu ụfọdụ ndị mmadụ siri kachie ntị gaa n'ihu na-arụnyési ihe n'okpuru eriri ọkụ nakwa n'ebe ndị ọzọ iwu akwadoghị, na mpaghara ebe dị iche iche n'Ọka, n'agbanyeghị na gọọmentị akụtuola ụfọdụ ihe ndị ahụ n'oge gara aga, iji chụsịa ndị dị etu ahụ.

Dịka o siri kwuo, onye ọbụla na-ezùbe ịrụ ụlọ n'ime mpaghara obodo iri abụọ na anọ dị n'okpuru nlekọta ụlọọrụ ACTDA ga-ewèta akwụkwọ eserese atụmatụ ụlọ ahụ na akwụkwọ ndị ọzọ dị mkpà, ma kpọtụrụ ụlọọrụ ahụ iji nyochaa akwụkwọ ndị ahụ, nyochaa ebe ahụ a ga-arụ ụlọ ahụ nakwa ihe ndị ọzọ kwesiri na ha ga-enyòcha banyere nke ahụ, tupuu ha edebànye ya n'akwụkwọ ma nyekwa ya nkwàdo ikike ịga n'ihu, ma ọ bụrụ na ihe ha hụrụ jùrù ha afọ.

Ọ katọrọ etu ụfọdụ ndị mmadụ si amilite ịrụ ụlọ n'ebughị ụzọ nweta akwụkwọ eserese atụmatụ ụlọ ha chọrọ ịrụ, ma kọwaa ya dịka ihe égwù na ihe izè ndụ, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị na-eme ihe dị etu ahụ ka ha wepu aka na ya n'ihi na gọọmentị agaghị eleghara ụdị ajọ ọrụ dị etu ahụ anya ma ha hụ ya.

O mere ka a mara na usoro itinye akwụkwọ na inweta nkwàdo na ikike site n'aka ụlọọrụ ACTDA anaghị ewèzị ọtụtụ oge ugbua, ma kwuo na ọ naghị ewèkarịzị otu izuụka ma ọ bụrụ na onye ahụ nwere akwụkwọ niile dị mkpa a chọrọ n'aka ya. O kwukwara na mmadụ nwekwàrà ike isi n'usoro nzikọrịta ozi ịntaneetị ha bụ https://actda.ng/  wee mee itinye akwụkwọ na ndebanye aha ugbua maka ụlọ ọ chọrọ ịrụ, kama na ha bụ ndị ọrụ ACTDA ga-agarịrị n'ebe ahụ a na-arụ ya bụ ụlọ, ka ha wee jiri anya ha hụ ma mara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.  

Dịka ọ na-ekwu na ezi ọrụ ụlọọrụ ACTDA na-arụ enyela aka ibelata ọnụọgụgụ ụlọ ọdịda n'Ọka (Awka) nà mpaghara ebe ndị ọzọ (okpuru ọchịchị isii) dị n'okpuru nlekọta ụlọọrụ ahụ, Maazị Okwuosa kátọkwàrà akaọrụ ụfọdụ ndị mmadụ ndị anaghị agbaso usoro ndebanye ahụ n'ozuzuoke, ma kwuo na ụlọọrụ ahụ agaghị anabata maọbụ leghàrà nke ahụ anya chaachaa.

Ọ kọwara na ótù n'ime ihe o jiri dị mkpà na onye ọbụla chọrọ ịrụ ụlọ na mpaghara ebe dị n'okpuru nlekọta ACTDA ga-akpọtụrụrịrị ụlọọrụ ahụ bụ n'ihi na ụfọdụ èsèrèsè atụmatụ ụlọ nà akwụkwọ ndị ọzọ dị mkpa nwèrè ike dị mma ma dịkwa etu kwesiri ekwesi, mana ebe a ga-arụ ụlọ ahụ adịchaghị mma ka o siri kwesi, ọkachasị ọ bụrụ ebe dị nso n'akụkụ okporoụzọ àwàrá-àwàrà, ebe dị nso n'ọwà mmiri maọbụ n'ebe eriri ọkụ gara, n'ihi na e nwere ohèrè ala e kwesiri ịhapụ tupu a rụba ụlọ n'ụdị ebe ahụ, bụ nke onye na-arụ ụlọ nwèrè ike ọ gaghị ama, ma ọ bụrụ ka ọ kpọtụrụghị ụlọọrụ ahụ maka nnyòcha na ndụmọdụ; o wee rụọ ụlọ n'ebe ekwesighị ekwesi, nke ga-eme ka a kụtuo ya bụ ụlọ n'oge ikpeazụ, n'agbànyèghị ogoogo a rụdobere ya.

Ọ gbakwasàrà ụkwụ n'ihe ndị a wee kpọkuo ma dụọ Ndị Anambra ọdụ, ọkachasị ndị na-arụ ụlọ na mpaghara ebe dị n'okpuru nlekọta ụlọọrụ ACTDA ka ha na-akpọtụrụ ụlọọrụ ahụ tupu ha amalite ịrụ ụlọ ọbụla, iji gbanahị ịkwa mgaramara n'oge ikpeazụ, ya na iji nyere gọọmentị aka n'ịkwụsị ụlọ ọdịda na ajọ ọdachi ndị ọzọ na-adapụtakarị site n'ịrụ ụlọ etu ekwesighị ekwesi maọbụ n'enwetaghị nkwàdo na ikike gọọmenti.

Dịka ọ na-ekwupụta na ụlọọrụ ACTDA wàtàrà ọgọdọ ma dịkwa ezi njikere inwòghàrị na idozi Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra ka ọ bụrụ eji ama atụ, Maazị Okwuosa, onye bụkwa Ọkaiwu, kpọpụtasịrị ihe dị iche iche ụlọọrụ ahụ mepụtagoro banyere nke ahụ, ma kọwakwa na ọrụ na-agawanye n'ihu aka-ọkụ aka-ọkụ n'ogige ebe ahụ a na-arụ 'Awka Millennium City', bụ ebe ya na ndị òtù ọrụ ya bàgidere njem nleta na nsonso a iji mara ka ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.

O mere ka a mara na a rụchaa ya bụ ogige 'Awka Millennium City' ahụ nakwa ogige ụlọ ebe obibi ndị ọzọ a na-arụ na steeti ahụ, nke gụnyere ogige 'Anambra Luxury Place Estate' dị na Nkwelle-Ezunaka, na ọ ga-adị ka ndị nke a na-ahụ na mba ofèsi, dịka o siri metụta inwe ihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka ma dịkwa mma obibi.

O kwuru na ụlọ ndị ahụ ga-adị ọnụala n'ụdị ndị nọ n'ogoogo obibi ndụ dị iche iche ga-enwe ike ibinwu na ya, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ nye aka n'ibelata nsogbu enweghị ebe obibi n'ime steeti ahụ, nke so n'otù n'ime mkpebi ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ na nkwà o kwere ụmụafọ steeti ahụ na ndị bi n'ime ya.

'Awka Capital Development Authority' (ACTDA) bụ ụlọọrụ ọ dị n'aka ịkwàlite nchawàpụta nke Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa ụlọọrụ na-ahụ maka nlekọta na mgbazi ewumewu nà mmepe n'ime mpaghara okpuru ọchịchị isii dị n'okpuru nlekọta ya, nke gụnyere Anaocha, 'Awka North', 'Awka South', Dunukofia, Njikoka na 'Orumba North'.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.