Ọkụ Agbaala Ụlọ Abụọ Gwoogwoo n'Awka

Jan 28, 2021 - 04:37
 0
Ọkụ Agbaala Ụlọ Abụọ Gwoogwoo n'Awka

Izunna Okafor


Mkpu akwa dàrà nsonso a n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra dịka ọkụ ọgbụgba dabidoro ma gbarikọọ ụlọ abụọ na ihe dị iche iche dị n'ime ha.

Ọkụ ọgbụgba ahụ bụ nke dapụtara n'ogige ụlọ obibi 'Nwakpadolu Estate' dị n'Agụ-Awka, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka South' 

N'okwu ha dị iche iche banyere ajọ ọdachi ahụ, ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere kọwara ma mee ka a mara na ọkụ ọgbụgba ahụ dapụtara n'ihi nsogbu sitere n'ọkụ latiriiki, ma bụrụkwa nke malitere n'ime mpaghara ụlọ ebe ndị bi na ya agbanyụsịghị ọkụ ha agbanyụ were pụọ; ya bụ ọkụ wee si ebe ahụ nwubàá n'ebe ndị ọzọ, wee gbarikọọ ọtụtụ ihe dị iche iche ha jiri biri.

Ha bụ ndị ọnọmgbeomere gara n'ihu kwuo na ọ bụ oge ha nụrụ isi anwụrụ ọkụ, wee hụkwa ka o si n'ụlọ ahụ asụpụtasị ka ha jiri mara na ya bụ ụlọ nọ n'ọkụ; nke mezịrị ka ha kpọba òkù ma zisàsịba ozi, ndị mmadụ wee gbata ọsọ ma nyebe aka n'ụdị nke ha, wee ruo mgbe ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ bịaruru n'ebe ahụ.

Ha kọwara na ọ bụ mgbataọsọ ahụ ndị mmadụ gbatara na ọrụ ndị nsọnyụ ọkụ ahụ mere e jiri gbanyụọ ya bụ ọkụ ma gbochie ya ịgbatù maọbụ ịgbarikọ ụlọ ahụ kpamkpam.

N'okwu nke ya, onye na-elekọta ụlọ ahụ, bụ Oriakụ Victoria Chidi-Akim kọwara ya bụ ọkụ ọgbụgba dịka ajọ ihe ọdachi bịara n'ogè ihe isi ike na oge ọnọdụ akụnụba na ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ jọgburu onwe ya.

Dịka ọ na-eme ka a mara na otu onye n'ime ndị ahụ ọkụ ahụ gbara ụlọ ha bụ nwaanyị ajadụ onye di ya nwụrụ na nsonso a, Oriakụ Chidi-Akim kpọkuru ma rịọ gọọmenti steeti Anambra na ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ ka ha gbatara ndị ahụ ajọ ọnọdụ ahụ metụtara ọsọ enyemaka n'ihi na ha amaghị ka a ga-esi kwọọ ya bụ onye ukwu gbara.

O jikwazịrị ohere ahụ we chetara ndị mmadụ na ụgụrụ na ọkọchị ka dịkwa, nke mezịrị ka ihe niile kpọsịkwa nkụ ma na-aghọrọkwa ọkụ ugbua, ọbụladị dịka ọ dụrụ ha ọdụ ka ha na-akpachapụ anya etu ha si ebi, ma na-agbanyụsịkwa ọkụ ha na ihe niile dị n'ime ụlọ ha tupu ha apụọ, maka na a naghị aka àkà were eje nta agwọ; kama ọ bụ agwọ gbapụta, a chụba ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.