Okigbo Ojoto

Aug 30, 2021 - 22:59
Aug 31, 2021 - 00:12
 0
Okigbo Ojoto

Izunna Okafor dere abụ a


Chaị
Ọnwụ emeela ụwa ihe
Isi dara n'akaghị aka
Ọ bụ gịnị ka a na-ekwu?
Okigbo Ojoto alaala mmụọ
Ezi nwa idoto ejebe obodo afụdobe.
Chaị, ihe mere n'Ojoto
Mmiri Idoto ebegbuo onwe ya n'akwa
Ọ bụzịkwà Idoto ka a na-akwọrọ, ka ọ bụ anyammiri ya?
Ịhụnanya nne na nwa.

Ọ bụ ezie na ihe a emeghị taa
Mana anyammiri ya ka dị ụwa n'anya taa
Maka na ọ na-abụ ụzụ tụọ n'ili dike
Ọha mmụọ na ọha mmadụ anụ ísì ozu ya.
Ọ bụ gịnị ka a na-ekwubedị ihe a?

Oke osisi Ojoto adaala
Ụmụ nnụnụ wee fesàá
Okpuru ọtọsị adaala òwù
Ụkpaka Ojoto na-ebezịkwa akwa
Onye ga-agụgụ ya obi?
Chaị! Ihe ọnwụ mere.

Okigbo Ojoto, odogwu nwoke
Agụ mere ìrè na ihe ukwu tupu ọ laa mmụọ
Ọ bụ akwụkwọ i dere ede?
Nke ụwa agaghị agụcha agụcha
Ọ bụ nzọụkwụ dimkpa gị?
Nke mmiri agaghị amacha amacha?
Ka bụ ọgụ ị lụrụ àlụ dịka nwoke
Ma jiri ndụ gị chụọ àjà
Maka nnwereonwe nke mmadụ.

Nwadibịa loro obi ebule abụghịzị obere dibịa
Gbachibido gbachibido bụ maka anụ ala
Maka na a naghị agbachibido anụ elu agbachibido
Okigbo Ojoto bụ anụ elu
Ụwa apụghị ịgbachibido gị
Ọbụladị ma n'ọnwụ
Ude gị ka na-ede.

Ọ na-abụ akpịrị gụọ mmanwụ
Ọ dị ka a kọrọ ya ọgwụ

Ya dịba
Maka na e bugharịba ozu diochì ebe niile o tere nkwụ
Ị mara na ozu ya ga-ereka n'isi ndị bu ya
Chaị! Isi dike dara
Mana aja danyere n'olulu eruola ikwunne ya
Ncheta ka anyị ji abịa
Ụfọdụ dịkwa ka ha ọkà bù anyammiri n'anya
Mana a gaghị eji na ụtaba na-agba anyammiri wee kwụsị ịkpọ ya akpọ.

Ihe ala rìrì àkárịá
Ya dịba, maka na ụwa a bụ ahịa
Onye zụchaa nke ya, ọ laba
Christopher nwa Okigbo ladị mma
Ụbọchị nkwọ ka anyị zụkọọ ọzọ n'ọhà mmụọ
Maka na ije ọgụ abụrụla ndeeri
Okigbo Ojoto ladị mma.


©Izunna Okafor, 2021.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484