Ọgụ Ndị Otu Nzuzo: Ndị Uweojii Ejidela Mmadụ Abụọ n'Anambra

Mar 29, 2021 - 14:32
Mar 30, 2021 - 21:52
 0

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii na steeti Anambra akparala mmadụ abụọ, bụ ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo, ma bụrụkwa ndị na-esonye n'ọgụ ahụ ndị otu nzuzo na-alụ ugbua na mpaghara ebe dị iche iche na gburugburu Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu siri kọwaa, mmadụ abụọ ahụ a nwụchiri bụ ndị e kwuru na aka ha dị n'ọgụ ndị otu nzuzo lụrụ n'ụtụtụ ụbọchị ụka bụ nke wetara mgbagbu na ọnwụ mmadụ abụọ na mpaghara Ifite Awka na 'Zik's Avenue' dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka South'.

DSP Toochukwu mere ka a mara na a dọnyela ozu mmadụ abụọ ahụ a gbagburu n'ụlọ nchekwa ozu, ebe ndị uweojii weghàràzịkwàrà ọnọdụ ugbua, iji wètá ya bụ ọgụ na atụmatụ ndị otu nzuzo ahụ n'isi njedobe. 

Ọ gakwara n'ihu kọwaa na a na-emezị nnyocha ugbua banyere mmadụ abụọ ahụ a nwụchikọrọ, ebe a ka na-agbasikwa mbọ ike iji nwọchikọọ ndị otu nzuzo ndị ọzọ, bụkwa ndị nọ n'ọsọ ugbua.

N'akụkọ dịkwa ka ibe ya, ndị uweojii nọ na mpaghara Okpoko anwụchikọọla mmadụ anọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi na ndị na-ama aka àkpà. Akụkọ si n'aka ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ na-akọwa na ndị ahụ a nwụchiri na-ezu  ụdị ohi dị iche iche, ma na-etiwakwa ụlọ maọbụ ọdụ ahịa mmadụ, ga na-ezukọrọ ihe n'ime ebe ahụ; ma na-ejikwa égbè apụnara mmadụ ekwentị ya, àkpà ya na ihe ndị ọzọ o nwere.

Mmadụ anọ ahụ, nke gụnyere Obumneme Ugwu (gbárá ahọ iri abụọ na anọ), Uchenna Udeh (gbárá ahọ iri abụọ na ise), Ani Amechi (gbárá ahọ iri na iteghete) na Isreal Isaac (gbárá ahọ iri abụọ na otu) ka e kwuru na a nwụchikọrọ na mpaghara Upper Iweka dị n'Ọnịtsha, ma bụrụkwa ndị òtù ohi na-ewu èwù ma na-emekpàkwa ndị mmadụ ahụ na mpaghara gburugburu ahụ niile.

DSP Toochukwu, onye mere ka a mara na a ka na-eme nnyocha iji nwụchikọọ ndị otu ahụ ndị nke nọ n'ọsọ ugbua, kọwàkwara na a ka na-eme nnyocha banyere ndị ahụ a nwụchikọrọ, nke mgbe e mechara ya, a kpụpụ ha niile ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee nye ha ọnọdụ ruru ha.

N'okwu ya banyere njide ahụ e jidere ndị ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Monday Kuryas kọwàrà njide ahụ e jidere ndị ahụ dịka nke dabara adaba n'ezi mbọ ahụ ha na-agba n'ibu agha megide mpụ na arụrụala, ya na ịchụ ndị omekoome ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ.

O kwere Ndị Anambra nkwà na ha ha ga-aga n'ihu inye ha ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà, ọbụladị dịka o kelere ọchịchị steeti ahụ maka ezi nkwàdo ọ na-enye ha bụ ndị ọrụ nchekwa n'ime steeti ahụ iji rụọ ọrụ ha nke ọma.

CP Kuryas gwàkwàzịrị ndị ohi, ndị otu nzuzo na ndị omekoomè ka ha chegharịa maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ na steeti ahụ ugbua, n'ihi na ụlọọrụ ya agaghị ada mbà n'ịcha ha ọkụ na ịchụ ha ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ, ruo mgbe ha gwụchara.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484