Ọchịchị Obodo: Ndị Ebenator Ahọpụtagharịala Ndị Ndu Ha Ịchị Nke Ugboro Abụọ

Ọchịchị Obodo: Ndị Ebenator Ahọpụtagharịala Ndị Ndu Ha Ịchị Nke Ugboro Abụọ

Jan 18, 2021 - 14:13
Jan 18, 2021 - 14:14
 0
Ọchịchị Obodo: Ndị Ebenator Ahọpụtagharịala Ndị Ndu Ha Ịchị Nke Ugboro Abụọ
Ọchịchị Obodo: Ndị Ebenator Ahọpụtagharịala Ndị Ndu Ha Ịchị Nke Ugboro Abụọ

Igbo sị na ọ na-abụ onye e nyere mara jikwaa, e nye ya ọzọ. Ka ọ dị taa, ndị obodo Ebenator Ozulogu, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South' nke steeti Anambra ahọpụtagharịala ndị ahụ ji ọkwa ọchịchị obodo ahụ ọzọ, ma sị ha chịrị gàá n'ihu.

Nhọpụta ọchịchị ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ama egwuregwu ụlọakwụkwọ 'Central School, Ebenator' ma bụrụkwa nke ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ụmụafọ obodo ahụ sitere na mpaghara ebe dị iche iche n’ala anyị na na mba ofesi wee bata isonye na ya, n’ihi na ha ghọtara mkpa ezi ọchịchị dị n’obodo ma bụrụkwa ụmụafọ ọnọdụ mmepe nke obodo ha na-echu ụra nke ukwuu.

Ndị nnọchianya gọọmenti na ndị nnọchianya òtù ahụ jikọtara ọchịchị obodo dị iche iche na steeti Anambra, bụ òtù 'Anambra State Association of Town Union' (ASATU) sonyekwàrà na ya bụ nhọpụta iji hụ na ya bụ nhọpụta gara etu o siri kwesi nakwa n'ụzọ iwu kwàdòrò.

Na mbụ n'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisioche òtù kọmitii hụrụ maka ịhazi nhọpụta ahụ, bụ Maazị Evaristus Imoh kpọpụtasịrị ọkwa dị iche iche a ga-azọ, nakwa usoro a ga-esi mee ya bụ nhọpụta, dịka o siri dị n'akwụkwọ iwu na-achị obodo ahụ, ma dụọ onye ọbụla ka ọ gbasoo udo ma bubekwa ọdịmma obodo ahụ ụzọ dịka ọ na-esonye na ya bụ nhọpụta, n’ihi na ọganihu nke obodo ahụ dị ha bụ ndị obodo n'aka.

Ka o sila dị, oge e nyere ohere ka a kpọlite ndị a ga-atụrụ akwụkwọ, ụmụafọ obodo ahụ kwekọrịtara n'izùgbe, ma jiri otu olu wee kwuwaa, sị ndị ahụ nọ n'ọkwa ahụ ka ha nọsie ike n'ọkwa ha dị iche iche, n'ihi na ha mere nke ọma n'àgbà nke mbụ nke ọchịchị ha, bụ nke na-egosi na ọchịchị ha dị ha ahụ mma.

Ndị ahụ niile ji ọkwa ọchịchị a họpụtagharịrị ọhụụ gụnyèrè: Maazị Anthony Okechukwu – Onyeisi ọchịchị obodo (President General), Ọkaiwu Francis Ndụbụọgaranya – Osote Onyeisi (Vice President), Maazị Bartholomeo Mbah – Ode Akwụkwọ Izugbe (Secretary General), Maazị Paul Anazodo – Osote Ode Akwụkwọ (Assistant Secretary); Nze Ikenna Okwudile – Odekọ Ego (Financial Secretary); Maazị Cyril Obianụmba – Ojide Ego (Treasurer); Maazị Paulinus Mbah – Onye Mgbasaozi (PRO); Maazị Joachim Adieme – Nnukwu Onye Nchịkọta (Chief Provost).

N'okwu ya n'aha ndị òtù ya, onyeisi ọchịchị obodo ahụ a họpụtagharịrị, bụ Maazị Anthony Okechukwu kèlèrè ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ, ma kelekwa ụmụafọ Ebenatọ n'ụzọ pụrụ ichè maka ịhụtakwa ha dịka ndị tozuru oke site n'ịhọpụtagharị ha ọzọ ịchị obodo ahụ nke ugboro abụọ.

O tòrò ndị obodo ahụ maka ezi nkwàdo dị iche iche ha nyere ya n'agba nke mbụ nke ọchịchị ha, bụ nke mere ha jiri ha jiri rụọ ọrụ ha nke ọma, ma rịọkwazie ha ka ha na-etinye ha n'ekpere ma nyekwa ha nkwàdo karịa n'àgbà nke abụọ a, iji rụọ ọrụ karịa ka ha siri rụọ n'agba nke mbụ.

Maazị Okechukwu, ónyé gbara akaebe na ịchị ọchịchị adịghịkwanụ oferè, rịọrọ ụmụafọ obodo ahụ ka ha jiri ịhụnanya bịakute ma kọwaara ha ihe ọbụla ha emetaghị, ka ha wee mezie ya etu o siri kwesi, maka na ha onwe ha bụkwanụ mmadụ; tinyekwuoro na ọ na-adị mma ikwu amaghị, ibè ezi ya, ka obodo wee na-aga n'ihu.

O kwezịrị nkwa na site n'inye aka Chineke na nkwàdo zuru oke, na ha ga-edu obodo ahụ nke ọma n'ime àgbà nke abụọ a karịa ka ha duru ya n'àgbà nke mbụ.

N'okwu nke ya, onye ndu ndị nnọchianya sitere ụlọọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala na steeti Anambra wee bịa ilekọta ya bụ ntụziaka, bụ Maazị Gerald Akaeze kọwara nhọpụta ọchịchị ahụ dịka nke magburu onwe ya nakwa nke nke gara n'ụzọ udo, ma kpọkuo ndị obodo dị iche iche ka ha ñomie nke ahụ site n'ịgbaso ụzọ udo wee na-eme nhọpụta ọchịchị obodo ha, karịa ime ya n'ụzọ 'tigbuo, zọgbuo'.

Dịka ọ na-ekele ụmụafọ Ebenator maka ijikọta onwe ha ma hụ na ya bụ nhọpụta gara nke ọma, Maazị Akaeze kpọkukwazịrị ha ka ha gaa n'ihu ikpere ndị ndu ahụ ekpere, inye ha nkwàdo kwesiri ekwesi, na iji ịhụnanya kpọkete, ma kọwaara ha ihe oge ọbụla ha emeteghị ya, iji hụ na ọchịchị ahụ gara nke ọma, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ kwàlite ọganihu na ọnọdụ obodo ahụ n'ogoogo dị elu.

Eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Edwin Chinewubeze Ezejiburu kelere isi ọchịchị obodo ahụ, bụ Ebenator Development Union (E.D.U.) nke Maazị Okechukwu nọ n'isi ya, maka ezi ọrụ ha rụrụ n'agba nke mbụ, ma dụkwazie ha ọdụ ka ha mee nke ọma karịa n'agba nke abụọ a.

Ụmụafọ obodo ahụ jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma rịọ Gọvanọ Willie Obianọ ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihe dị iche iche na-echere obodo ahụ aka mgba, nke gụnyere mbize (Ibo Ebenator), enweghị ọkụ latiriiki, enweghị ezi okporo ụzọ, enweghị mmiri ọñụñụ,  nakwa ihe ndị ọzọ na-ebi obodo ahụ aka ọjọọ n'ụzọ dị iche iche ugbua.

By Izunna Okafor

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.