Obiano Na Aha Echichi Ọdịnala Ya

Aug 9, 2021 - 21:02
 0
Obiano Na Aha Echichi Ọdịnala Ya

Izunna Okafor dere edemede a


Ichi mmadụ echichi ọdịnala so n'otu ụzọ ndị Igbo si akwanyere mmadụ ùgwù, ma n'oge gboo, ma n'oge ugbua.

Tupu e nye mmadụ ọbụla echichi ọdịnala n'ala Igbo, ọ ga-enwerịrị ihe pụrụ iche a hụrụ na ndụ onye ahụ, maọbụ ihe gbara ọkpụrụkpụ onye ahụ mere/na-eme.

Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, ị mara na o nwere ihe pụrụ iche dị na ndụ Gọvanọ Willie Obiano nà ihe gbara ọkpụrụkpụ ọ na-eme, maka na echichi ọdịnala nwa amadi ahụ nwètàgòrò bụzị agụta ọnụ, ma ndị o nwetara n'ala Igbo, ma ndị o nwetara n'ala Yoruba na n'ala Hausa.

Ka ọ dị taa, ndị a bụ ụfọdụ echichi ọdịnala dị iche iche Gọvanọ Obianọ nwetagoro:

Akpọkuodike

Ebubedike Aguleri

Aare Amuogun Ado-Ekiti 

Ọgụgụa Ndị Ọlụsị

Odoziobodo Anaọcha

Ìfè Anambra

Dikejiejemba Ogidi

Odogwu Ọmambala

Dike Ìfè n'Ụga

Dikejiejemba n'Ụmụnya

Ezeudo n'Abagana

Omeokachie Anambra 

Ebube Idemili 

Dikeọra Nnewi Ochie

Otunba Atayese n'Ekiti

DUKE n'Ụka Katọlik

Ogbunaechendo Umueri

Ebubeagu 'Nnewi South'

Agụnechemba Agụata Ochie.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484