Obianọ Ekwela Nkwà Ịkwàdo Ndị Ụka, Dịka Dayọsiisi Awka Mere Sinọọdụ

May 10, 2021 - 20:26
May 30, 2021 - 18:58
 0
Obianọ Ekwela Nkwà Ịkwàdo Ndị Ụka, Dịka Dayọsiisi Awka Mere Sinọọdụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwela nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà n'ịkwàdò nà ijikọ aka ọnụ, ha na ndị ụka dị iche iche na steeti ahụ.

Gọvanọ kwupụtara nke a na mmemme sinọọdụ ahọ 2021 nke ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St. Micheal and All Angel's Church, Nawfia' dị n'okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti ahụ, ma bụrụkwa àgbà nke abụọ nke sinọọdụ nke iri abụọ nke dayọsiisi ahụ.

Mmemme sinọọdụ ahụ a malitere ụbọchị Fraịdee bụ nke were mkpụrụ ụbọchị atọ, ma bụrụkwa nke e jiri ofufe nrò ịtụ mmamma pụrụ iche wee chịkọta ụbọchị ụka.

Ya bụ oke mmemme, nke isiokwu ya bụ 'Mbawanye Nke Mgbasa Oziọma: Mpụtara Ya Maka Ndị Ọrụ Ụka E Chiri Echi Na Ndị Na-Eje Ụka' (Expanding Our Ministerial Coast: Implications for the Ordained and the Laity), dọtara ọtụtụ ndị Bishọọpụ na ndị ọrụ ụka sitere ebe dị iche iche na gburugburu ala Nigeria wee bịa; ndị ọrụ gọọmentị, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ, nke Maazị Uzuegbuna Okagbue nọchitere anya ya na mmemme ahụ, mere ka a mara na ya na ndị ụka dị iche iche na steeti ahụ enweela ezi njikọakaọnụ kemgbe ọchịchị ya siri bata n'ọkwa, bụ nke pụtagoro ìhè n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche.

Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ụzọ dị iche iche ọchịchị ya sìgòrò kwàdo ndị ụka, ya na ụzọ dị iche iche ndị ụka sigoro nye ọchịchị ya nkwàdo, ma kwe nkwà na ezi njikọaka ahụ ga-aga n'ihu ịdịgide. Ọ rịọkwazịrị ndị ụka dị iche iche ka ha tinye aka n'ime ka ala Nigeria, ọnọdụ nchekwa ya na ọnọdụ akụnụba ya kawanye mma, site n'ikpere obodo ahụ ekpere na iche ya n'ihu Chineke mgbe niile, ọkachasị n'ihi ihe dị iche iche na-emegasị na mpaghara ebe dị iche iche n'ala ahụ ugbua, tụmadụ n'ihe metụtara ọnọdụ nchekwa.

Na mbụ n'okwuchukwu ya n'ebe ahụ, Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Lagos, Rt. Rev. Humphrey Olumakaiye, bụ onye gbadoro ụkwụ n'isiokwu sinọọdụ ahụ, kpọrọ òkù ka onye ọbụla jiri ọnatarachi ya na akụnụba ya wee jeere Chineke ozi ma kwàdo mmgbasà oziọma Ya.

Dịka ọ na-agba akaebe na ọnọdụ ngalaba dị iche iche n'ala Nigeria amachaghịzị kwụrụ ugbua; ya bụ Bishọọpụ mèkwàrà ka a mara na ndị ụka nwèrè ọtụtụ ọrụ pụrụ iche chere ha n'ihu n'ịkwalite ezi ọnọdụ mmepe bụ ịgbà.

N'ozi pụrụ iche ọ gụpụtara na mmemme ahụ, Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka, onye bụkwa Ashbishọọpụ nke mpaghara Niger, bụ Ashbishọọpụ Alexander Chibuzor Ibezim kpọrọ òkù ka e nwee ezi nchekwa n'ala Nigeria ma kwụsị igbusi mmadụ aghara aghara na mpaghara ebe dị iche iche.

Ọ kpọpụtasịrị ajọ nsogbu dị iche iche na-echere ala Nigeria aka mgba, ma kwuo na etu Nigeria siri dàbere ma tụkwasị obi naanị na mmanụ, dịka ụzọ e si enweta ego, sòkwà na nsogbu kacha ebi ala Nigeria aka ọjọọ, ma kpọọ òkù gọọmenti mee ihe banyere nke ahụ, iji bawanye usoro ego si abata n'àkpà gọọmenti.

Dịka ọ na-ekele Gọvanọ Obianọ maka ezi mmekọrịta dị n'etiti ọchịchị ya na ndị ụka; Bishọọp Ibezim kèlèkwàra Gọvanọ ahụ maka ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ ọ rụrụ ọhụrụ na steeti ahụ, ma kelekwa ya maka etu o si akwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa ngwangwa na steeti ahụ, ma kwezie nkwà na ha bụ ndị ụka ga-aga n'ihu ikpere ọchịchị ya ekpere na ịkwàdò ya mgbe niile.

Ụfọdụ ndị ọzọ sonyere ma kwuo okwu na mmemme ahụ gụnyèrè Bishọọpụ ụka Ktọliiki na dayọsiisi Awka, bụ Bishọọpụ Paulinus Ezeokafor; eze ọdịnala Nnewi, bụ Igwe Kenneth Orizu; onyeisi òtù ọrụ haziri sinọọdụ ahụ, bụ Maazị Obinna Etele, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwela nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà n'ịkwàdò nà ijikọ aka ọnụ, ha na ndị ụka dị iche iche na steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a na mmemme sinọọdụ ahọ 2021 nke ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St. Micheal and All Angel's Church, Nawfia' dị n'okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti ahụ, ma bụrụkwa àgbà nke abụọ nke sinọọdụ nke iri abụọ nke dayọsiisi ahụ.

Mmemme sinọọdụ ahụ a malitere ụbọchị Fraịdee bụ nke were mkpụrụ ụbọchị atọ, ma bụrụkwa nke e jiri ofufe nrò ịtụ mmamma pụrụ iche wee chịkọta ụbọchị ụka.

Ya bụ oke mmemme, nke isiokwu ya bụ 'Mbawanye Nke Mgbasa Oziọma Anyị: Mpụtara Ya Maka Ndị Ọrụ Ụka E Chiri Echi Na Ndị Na-Eje Ụka' (Expanding Our Ministerial Coast: Implications for the Ordained and the Laity), dọtàrà ọtụtụ ndị Bishọọpụ na ndị ọrụ ụka sitere ebe dị iche iche na gburugburu ala Nigeria wee bịa; ndị ọrụ gọọmentị, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ, nke ọ bụ Maazị Uzuegbuna Okagbue nọchitere anya ya na mmemme ahụ, mèrè ka a mara na ya na ndị ụka dị iche iche na steeti ahụ enweela ezi njikọakaọnụ kemgbe ọchịchị ya siri bata n'ọkwa, bụ nke pụtagoro ìhè n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche.

Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ụzọ dị iche iche ọchịchị ya sìgòrò kwàdo ndị ụka, ya na ụzọ dị iche iche ndị ụka sigoro nye ọchịchị ya nkwàdo, ma kwe nkwà na ezi njikọaka ahụ ga-aga n'ihu ịdịgide. Ọ rịọkwazịrị ndị ụka dị iche iche ka ha tinye aka n'ime ka ala Nigeria, ọnọdụ nchekwa ya na ọnọdụ akụnụba ya kawanye mma, site n'ikpere ya ekpere na iche ya n'ihu Chineke mgbe niile, ọkachasị n'ihi ihe dị iche iche na-emegasị na mpaghara ebe dị iche iche ugbua, tụmadụ n'ihe metụtara ọnọdụ nchekwa obodo.

Na mbụ n'okwuchukwu ya n'ebe ahụ, Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Lagos, bụ Rt. Rev. Humphrey Olumakaiye, bụ onye gbadoro ụkwụ n'isiokwu sinọọdụ ahụ, kpọrọ òkù ka onye ọbụla jiri ọnatarachi ya na akụnụba ya wee jeere Chineke ozi ma kwàdo mgbasà oziọma Ya.

Dịka ọ na-agba akaebe na ọnọdụ ngalaba dị iche iche n'ala Nigeria amachaghịzị kwụrụ ugbua; ya bụ Bishọọpụ mèkwàrà ka a mara na ndị ụka nwèrè ọtụtụ ọrụ pụrụ iche chere ha n'ihu n'ịkwalite ezi ọnọdụ mmepe bụ ịgbà n'obodo.

N'ozi pụrụ iche ọ gụpụtara na mmemme ahụ, Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka, onye bụkwa Ashbishọọpụ nke mpaghara Niger, bụ Ashbishọọpụ Alexander Chibuzor Ibezim kpọrọ òkù ka e nwee ezi nchekwa n'ala Nigeria ma kwụsị igbusi mmadụ aghara aghara na mpaghara ebe dị iche iche.

Ọ kpọpụtasịrị ajọ nsogbu dị iche iche na-echere ala Nigeria aka mgba, ma kwuo na etu Nigeria siri dàbere ma tụkwasị obi naanị na mmanụ, dịka ụzọ e si enweta ego, sòkwà na nsogbu kacha ebi obodo Nigeria aka ọjọọ, ma kpọọ òkù ka gọọmenti mee ihe banyere nke ahụ, iji bawanye usoro ego si abata n'àkpà gọọmenti.

Dịka ọ na-ekele Gọvanọ Obianọ maka ezi mmekọrịta dị n'etiti ọchịchị ya na ndị ụka; Bishọọp Ibezim kèlèkwàra Gọvanọ ahụ maka ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ ọ rụrụ ọhụrụ na steeti ahụ, ma kelekwa ya maka etu o si akwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa ngwangwa na steeti ahụ, ma kwezie nkwà na ha bụ ndị ụka ga-aga n'ihu ikpere ọchịchị ya ekpere na ịkwàdò ya mgbe niile.

Ụfọdụ ndị ọzọ sonyere ma kwukwa okwu na mmemme ahụ gụnyèrè Bishọọpụ ụka Katọliiki na dayọsiisi Awka, bụ Bishọọpụ Paulinus Ezeokafor; eze ọdịnala Nnewi, bụ Igwe Kenneth Orizu; onyeisi òtù ọrụ haziri sinọọdụ ahụ, bụ Maazị Obinna Etele, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484