Obianọ Eguzobena Achụmnta Nkwado Maka Ọchịchị Ya Nke Ugboro Abụọ

Oct 7, 2017 - 08:37
Jan 23, 2021 - 23:24
 0
Obianọ Eguzobena Achụmnta Nkwado Maka Ọchịchị Ya Nke Ugboro Abụọ

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ọka bụ isi obodo steeti Anambra deere jii ụbọchị Mọọnde gara aga dịka aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Willie Obianọ nọrọ n'ama egwuregwu Ekwueme wee hibe ma guzobe kpọmkwem amụmà ịchụ nta nkwado ya maka ịzọ ọkwa aka ga-achị steeti ahụ nke ugbo abụọ, n'aha otu pati APGA.

Ọ gwara igwe mmadụ bịara mmeme ahụ na a ga-ahụtawanye ọtụtụ ọrụ mmepe dị iche iche n'ọchịchị ya nke ugboro abụọ, ma kwekwa nkwa ịrụ ọdụ ụgbọ elu. Ọ dụkwara ndị na-atụ akwụkwọ ka ha mezuputa ezi ebumnobi nke Dim Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu lagoro mmụọ, site n'ịtụnyere otu pati APGA.

Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na o webatago mmepe zuru ọnụ na steeti site n'amụmà inye obodo niile dị na ya nde Naịra iri abụọ iji wee họrọ ma rụọ ihe ọbụla masịrị ha, ma kwe nkwa na a ga-ebuli ọnụ ego ahụ ka ọ bụrụzie nde Naịra ise malite n'ahọ na-abịa abịa.

O kwuru na ihe a ga-eme na ngalaba ọrụ ugbo n'ahọ anọ na-abịa abịa ga-adị oke egwu karịa nke e megoro eme, n'ihi na ugbu a, ha na-akọpụta nri dịka osikapa, akpụ, ọkà nyafụ nyafụ, mana n'ahọ ọzọ, na a ga-enye ndị ọrụ ugbo ọkpụrụkpụ ego ka ha wee malite ịzụ ehi, ewu, ọkụkọ na ụmụ akụ ndị ọzọ

N'okwu ya, malite n'ụbọchị ahụ; ọ sị na ịtụ akwụkọ fọdụrụ naanị mkpụrụ ụbọchị iri anọ na asatọ ka o were ọnọdụ, na o kwesikwara ka ndị Anambra họrọ ịtụnyere ọrụ mmepe na-aga n'ihu na steeti ahụ karịa ịhọrọ nlaghachi azụ n'ọnọdụ ihere na ọchịchịrị.

Ọ sị na ya nabatara ndị ya na ha na-azọ ọkwa ahụ ma mee ha ka ha mara na steeti ahụ bụ nke ha niile, maka na nhọpụta ga-abịa ma gaa, mana steeti ga-adịkwa ebe ọ dị. N'ihi ya, ọ kọwara na ịzọ ọchịchị ahụ abụghị nke ọnwụ na ndụ, ka e wee ghara ime ka steeti ahụ bụrụ ọgbọ ọgụ, ma ọ bụ wee si na ya kposaa udo tọrọ àtọ a tara ahụhụ wee webata na steeti ahụ.

Ndị ukwu ndị ukwu bịara mmemme ahụ gụnyere onyeisi ụlọ ọba ego ala anyị n'oge mbụ, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo, onye isi otu ịchụ nta nkwado maka ịhọpụtagharị gọvanọ Obianọ bụ maazị Victọr Umeh, osote aka chịbụrụ steeti ahụ n'oge mbụ, bụ Virgy Etiaba; onye zọbụrụ ọkwa gọvanọ na steeti Abịa n'oge mbụ bụ Dọkịnta Alex Otti; onye minista na-ahụ maka mgbasa ozi n'ala anyị n'oge mbụ bụ maazị Labramn Maku, ọka okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steet ahụ bụ Oriakụ Rita Madụagwụ, tinyere ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.