Obiano Agbapeela Okporo Ụzọ Igwe GNC Ezeudo n'Uke

Obiano Agbapeela Okporo Ụzọ Igwe GNC Ezeudo n'Uke

Jan 14, 2021 - 00:00
Jan 19, 2021 - 00:01
 0
Obiano Agbapeela Okporo Ụzọ Igwe GNC Ezeudo n'Uke

By Izunna Okafor

A kpọkuola ndị aka ji akụ n'ime steeti Anambra ka ha nyere gọọmenti aka n'ịkwàlite ọrụ mmepe obodo, site n'ịrụnyegasị ihe dị iche iche na-akwalite ọnọdụ obibindụ na ọnọdụ mmepe n'ime ime obodo dị iche iche na steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ kpọrọ oku a na mmemme ịgbape okporo ụzọ a maara dịka 'Igwe GNC Ezeudo Road' dị n'okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ọ bụ onye ọrụ obi ebere, bụ Maazị Tochukwu Kpajie rụrụ ya.

Ya bụ okporo ụzọ bụ nke ogologo ya dị otu kilomita, ma bụrụkwa nke e tinyesikwara ọkụ okporo ụzọ ji ike si anyanwụ arụ ọrụ na ya, tinyere ihe ndị ọzọ ga-eme ka ya bụ okporo ụzọ nọọ ọdụ etu o kwesiri, ma gharakwa imebì ngwangwa.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ okporo ụzọ, Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ n'isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Emeka Ohuoha kelere nwa amadi ahụ rụrụ ya bụ okporo ụzọ maka inwe mmasị n'ihe gbasaara ọnọdụ mmepe obodo ahụ, ma werekwa ya dịka ihe na-echu ya ụra, bụzị nke mere o jiri rụọ ya bụ okporo ụzọ.

O mere ka a mara na ịkwàlite mmepe bụ ihe dịịrị onye ọbụla, ma kpọkuo ndị Anambra ka ha nyere gọọmenti aka n'ịkwalite mmepe tọrọ atọ na steeti ahụ n'ihi na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja, wee bụrụzie ugbua akụnụba ala Nigeria nọzị na ndaghachiazụ n'ihi ọrịa nje korona nakwa ọdịda nke ọnụ ego na-aba n'akpa gọmeenti.

Gọvanọ Obianọ jikwazịrị ohere ahụ wee chetara ndị Anambra mkpa ọ dị na ha na-echekwa onwe ha ma na-echekwa mmadụ ibé ha site n'iyi uwe mkpuchi imi nakwa site n'irube isi nye ntụziaka niile gọọmenti nyere, iji wee gbanahị ibute maọbụ ikesà ọrịa nje korona, bụ nke chighatara azụ n'àgbà nke abụọ ya ugbua wee na-egbu ma na-agbasàkwa n'iké n'iké ugbua.

N'okwu nke ya, eze ọdịnala obodo Uke bụ Igwe Charles Agbala kèlèrè Maazị Kpajie rụrụ okporo ụzọ ahụ maka ezi ntụnye ahụ ọ tụnyere na mmepe obodo, ma kpọkuo ndị ọzọ bụkwa ndị aka ji akụ ka ha tụnye ụtụ nke ha na mmepe obodo ahụ. O kelekwazịrị Gọvanọ Obianọ maka ụzọ dị iche iche ọchịchị ya sigoro kwàdo mmepe ime-ime obodo nakwa ngalaba dị iche iche na steeti ahụ.

Na nzaghachi, ya bụ nwa amadi bụ isi a hụrụ kwaba okpu na mmemme ahụ, bụ Maazị Tochukwu Kpajie kwuru na o kpebiri ịrụ okporo ụzọ ahụ iji belata ihe mgbu na ihe nhịaahụ ụmụafọ obodo ahụ na-agabiga n'ebe ahụ oge ọbụla mmiri zoro, ma kwuo na ọ gụrụ nna ya lagoro mmụọ, bụ Maazị Linus Kpajie agụụ ịhụ na e tere okporo ụzọ ahụ mgba oge ọ nọ ndụ.

Dịka ọ na-ekele Maazị Kpajie maka ya bụ ezi ọrụ, onyeisioche nchere oge nke 'Uke Development Union', bụ Maazị Chuks Ezeoba, fọkwàrà ekele n'ụkpa ọzọ wee bunye Gọvanọ Obianọ maka ọrụ mmepe ya n'ime steeti ahụ, ọkachasị ọdụ ụgbụelu mba ụwa ahụ ọ na-arụ n'Ụmụeri, nakwa ọrụ mmepe ndị ọzọ o ji n'aka nakwa ndị ọ rụchapụgoro na mpaghara na ngaaba dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.