Obianọ Agbaala Ndị Ọrụ Nchekwa Ume, Kwenwòó Nkwa Ezi Ọnọdụ Nchekwa

Aug 14, 2021 - 20:49
 0
Obianọ Agbaala Ndị Ọrụ Nchekwa Ume, Kwenwòó Nkwa Ezi Ọnọdụ Nchekwa

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwenwòóla nkwà ịga n'ihu na-enye ụmụafọ steeti Anambra ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà, iji mee ka steeti ahụ gaa n'ihu ịbụ steeti kachara nwee ezi ọnọdụ nchekwa n'ala Nigeria.

Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a na nsonso a, oge ọ gara njem mkpọtụrụ a kaghị àkà na ngalaba ogige ụlọọrụ ndị uweojii a maara dịka 'State CID' dị n'Awkụzụ, n'okpuru ọchịchị Oyi.

Njem mkpọtụrụ ahụ bụ nke Gọvanọ Obianọ gara oge ọ na-aga mmemme n'otu ebe, wee sịzie ka ọ gba ụkwụ n'ogige ụlọọrụ ndị uweojii ahụ oge ọ hụrụ ndị ọrụ ahụ ka ha nọ n'ọrụ ngagharịa na mpaghara ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na ọ bụ nkwà o kwere nà iyi ọ ñụrụ oge ọ batara n'ọkwa na ọ ga-echekwa ndụ na akụnụba Ndị Anambra, ọbụladị dịka o kwupụtanwòrò ezi njikere ya ịga n'ihu na-edebe nkwà ahụ, iji mee ka steeti ahụ bụrụ ebe dị larịị maka ịdọta ndị ji ego achụ ego, ma bụrụkwa ebe ndị mmadụ ga na-azụ ahịa ha ma na-arụkwa ọrụ ha n'enweghị égwù ọbụla.

O kelere ndị ọrụ uweojii ahụ maka ezi ọrụ ha na agbambọ ha n'ịkwàlite ezi nchekwa na steeti ahụ, ma gbakwa akaebe na a na-enweta mmeri n'agha ahụ a na-ebu megide mpụ na arụrụala na ndị omekome n'ime steeti ahụ.
 
Gọvanọ Obianọ gbàrà akaebe na steet Anambra so na steeti kacha nwee ezigbo nchekwa n'ala Nigeria, ma kwe nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ime ka ezi ọnọdụ nchekwa ahụ dịgide, ọbụladị wee ruo mgbe oge ya gwụrụ.

Ọ gbàkwàzịrị ndị ọrụ uweojii ahụ na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọ na steeti ahụ ume ka ha jisie ike n'ọrụ, ọbụladị dịka o kwere nkwa ịga n'ihu na-enye ha nkwàdo kwesiri ekwesi. 

Gọvanọ Obianọ mechaara wee lelee ụgbọala ọgụ ọhụrụ e ziteere ndị uweojii na steeti ahụ na nsonso a, iji kwàlite ọrụ nchekwa ha.

Ọ dị ncheta na a nọrọ na nsonso a wee zitekwuo ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa pụrụ iche n'ime steeti Anambra na nsonso a iji memilaa atụmatụ na akaọrụ ndị omekome na steeti ahụ, bụzị nke mere ka e nwezie ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa na-agagharịzị na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ ugbua, iji chụọ ndị omekome ọsọ ụkwụ erughị ala.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484