Nwoke Kwasoro Ụmụ Ya Iko N'Ogun Abaala n'Aka Ndị Uweojii

May 8, 2021 - 14:45
May 8, 2021 - 14:46
 0
Nwoke Kwasoro Ụmụ Ya Iko N'Ogun Abaala n'Aka Ndị Uweojii

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ na-abụ ụkpala ntị ike meghèrigide, otu ụbọchị, ọ dànyèghị n'ọnụ anụ ala, ọ danye n'ọnụ anụ ufe; maka na otu ihe ga-egburịrị nwoke.

N'ịgbaso nke a, otu nwoke gbara ahọ iri ise na abụọ emeghèrigidela wee danye n'aka ndị uweojii na steeti Ogun, maka ịdakpò ụmụ ya atọ na otu nwatakịrị nwaanyị ọzọ n'ike, wee mazụrịa ha, ka nwaanyị a lụtara ọhụrụ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Ogun, bụ ya kwupụtara nke a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ.

O kwuru na ha bụ ndị uweojii nọrọ na nsonso a wee nweta mkpesa na mpaghara ụlọọrụ ha dị n'Agbado, site n'aka otu nwaanyị, banyere etu ya bụ nwoke, bụ Maazị Kayode Adeniyi (nke bi na mpaghara Abere Ifa, Ijoko, nke steeti Ogun), siri wee jide nwa nwanne ya nwaanyị, wee dakpo ya n'ike ma rie ya ọkọmbọ.

Dịka o siri kọwaa, nwaanyị ahụ gwara ha na nwatakịrị nwaanyị ahụ (gbárá naanị ahọ iri) gàrà ịjụ nwoke ahụ ajụjụ ka ọ mara mà ọ bụ ụmụ ya chịpụrụ ákwà ọ gbasara n'èzí n'amaghị ama (n'ihi na ha bi n'otu ụlọ ma bụrụkwa agbataobi). Ya bụ nwoke wee nwụchikọọ nwata ahụ ebe ahụ ozigbo n'ike, buru ya bàá ime ụlọ, gbaa ya ọtọ, were àkwà nhiriisi bụ 'pillow' wee pịchie ya ọnụ, ma kọrịa ya n'ebe ahụ.

Ka ihe ahụ malitezịrị ịtọ ya ụtọ nke ukwuu, o wepuru 'pillow' ahụ o jiri kpuchi nwatakịrị ahụ ọnụ, ma weta mmà wee yie ya égwù, sị ya emekwala mkpọtụ ọbụla maọbụ tie mkpu, wee ruo mgbe ọ pịajuru ọkụ afọ ka o siri gụọ ya, maọbụkwa o were mma ahụ wee sụgbuo ya ebe ahụ ma o mee mkpọtụ ọbụla. Nwata ahụ wee mechie ọnụ ya n'égwù.

Ọ bụzị oge nwoke ahụ mechara ihe dị ya n'obi ka o siri gụọ ya ka o jiri hapụ nwata nwaanyị ahụ, o wee bere akwa mkpụrụobi wee pụọ, ya na ọbara juru ya n'ahụ. Ọ gwakwara ya ekwekwala ka onye ọbụla mara banyere ihe ahụ o mere ya, belụsọ ma ọ chọrọ iji àlà wee zèré mmiri.

Ka ndị uweojii nwetachara mkpesa ahụ na-asọ ntị oyi, ha gara ozigbo, dịka onyeisi ha na mpaghara Agbado ahụ, bụ CSP Kehinde Kuranga siri nye ntụziaka, wee nwụchikọọ ya bụ oke mkpi na-agbara ọha ewu. 

Ka a gbara ya ajụjụọnụ, nwoke ahụ jiri ọnụ ya wee sàá asịsà na ọ bụ eziokwu na ọ kwasoro nwatakịrị nwaanyị ahụ iko n'íké, ma kwuo na ọ bụ aka ọrụ ekwensu. O kwukwara na ọ bụ eziokwu na o jiri mma wee yie nwata ahụ égwù, sị ya emekwala mkpọtụ maọbụ mee ka onye ọbụla mara banyere nke ahụ, maọbụ o gbuo ya.

Dịka e mekwuzịrị nnyocha banyere ihe dị iche iche iche nwoke ahụ mere n'oge gara aga, a chọpụtazịkwara na o tèélarị o ji akwaso ụmụ ya atọ ọ mụrụ amụ iko n'iké, bụ kịrịkịrị ụmụaka ụmụnwaanyị erubeghị ihe e ji mmadụ eme. Nwoke ahụ kwètakwara, ma gbaa akaebe na nke ahụ bụ eziokwu. Nke a mezịrị ka njọ ya gbagotezi, ma bụrụkwa arụ kwọ nwa n'azụ.

Ka ọ dị ugbua, a kpọrọ nwata nwaanyị ahụ o riri ọkọmbọ na nke ikpeazụ a wee gaa ụlọọgwụ ebe a ga-anọ wee lelee ya ahụ, nye ya ọgwụgwọ ma lerukwa ya anya etu o siri kwesi.

CP Edward Awolowo Ajogun bụ onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ enyela ntụziaka ka e mee nnyòcha miri èmi banyere arụ ahụ nwoke ahụ mere, ma kpụpụkwa ya ụlọikpe ozigbo, ebe a ga-eji usoro iwu wee lee ya ọrụ maka ihe o mere.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484