Nnukwu Ụgbọala Bu Ehi Egbusiela Ndị Mmadụ n'Anambra

Jun 5, 2021 - 16:27
 0
Nnukwu Ụgbọala Bu Ehi Egbusiela Ndị Mmadụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a


Oke ihe ọdachi merennọọ na steeti Anambra, dịka ọtụtụ mmadụ zùtèrè ọnwụ ike ha na nnukwu ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)', ngalaba steeti Anambra, bụ SRC Florence Edor bụ ya mere ka ụwa mara banyere ihe ọdachi ahụ, site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa n'ozi ahụ, ihe mberede okporoụzọ ahụ mèrè n'ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha, na mpaghara ebe ahụ ụgbọala na-agba n'elu na n'ala, dị na njikọụzọ Kwata dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ,ma bụrụkwa nke mere oge ọ gachara elekere abụọ nke ehihie ụbọchị Fraịdee.

Site n'ozi ahụ, ọ kọwàrà na ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara ọtụtụ ụgbọala, nke gụnyere nnukwu ụgbọala gwongworo (nwere akàrà JJN 59 YZ), ụgbọala 'Honda CRV' enweghị akàrà, ụgbọala 'M/Benz 4matic' (nwere ákàrà ABJ 115 DA), ụgbọala 'Toyota Highlander' (nwere akara AWKA 226 HM), na ụgbọala 'Lexus SUV (nwere ákàrà KJA 136 FD).

O mere ka a mara na ọ bụ n'ihi ngharịpụ nke ihe e ji akwụsị ụgbọala bụ breekì kpàtàrà ihe mberede okporoụzọ ahụ jiri dapụta, ma kwuo na ọ bụ mkpokọta mmadụ iri na abụọ ka ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara, nke mmadụ iri na ótù n'ime ha bụ ụmụnwoke, ebe otu onye nke ọzọ bụ nwaanyị.

O kwuru na otu onye n'ime ụmụnwoke ahụ nwètàrà mmerụahụ, ma bụrụkwa onye ndị ọrụ FRSC buru gaa ụlọ ahụike 'Princeton Hospital' maka inye ya ọgwụgwọ; ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ nwetara nnukwu mmerụahụ ma bụrụ ndị e buru gaa ụlọ hụike Mahadum Nkụzi Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu dị n'Awka ahụ, ebe dọkịta nọrọ wee lelechaa ha ahụ, wee kwuo na ha anwụọla.
 
SRC Edor kwùkwàzịrị na a dọnyela ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọọgwụ, ma mekwazie ka a mara na ndị ọrụ ha ebupùsiela ihe dịchigasịrị ụzọ n'ebe ahụ, iji mee ka ụzọ na-aga nke ọma n'ebe ahụ, n'enweghị nsogbu 'a gbakata a kwụsị'.

N'okwu ya banyere nke a, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye A. Irelewuyi katọrọ ụdị ajọ ihe mberede okporoụzọ ahụ, kọwaa ya dịka nnukwu ihe ọdachi jọgburu onwe ya. 

Dịka ọ na-akasì ezinụlọ ndị nke ha nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ obi, CC Irelewuyi kpọkukwàrà ma dụọ ndị na-anya ụgbọala ọdụ ka ha gbaa mbọ na-eleru ụgbọala ha anya nke ọma, ma hụkwa na ihe niile zùrù òkè ma na-arụkwa ọrụ etu o kwesiri, tupu ha eburu ụgbọala ha pụta n'okporoụzọ, iji gbanahị ọdachi dị etu ahụ na ụdị ọdachi ndị ọzọ.

O kpekwazịrị ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakere ma nwere onwe ha oge adịghị anya, ma kpekwa ka Chineke nabàta mkpụrụobi ndị nke nwụrụ anwụ na ndokwa.

Kaosiladị, n'agbanyeghị na ụlọọrụ FRSC kwuru na ọ bụ naanị mmadụ abụọ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ, ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere kwuru na mmadụ nwụrụ n'ebe ahụ ruru asaa n'ọnụọgụgụ, nke gụnyere ma ndị na-anya ụgbọala na ụfọdụ ụmụaka na-ebugharị ahịa mbugharị n'ebe ahụ ma na-asakwara ndị mmadụ ihu ụgbọala ha n'okporoụzọ ahụ.

Ha kọwara na ọ bụ nnukwu ụgbọala gwongworo bu ehi wètàrà ihe mberede ahụ, n'ihi na breeki ya gharịpụrụ ya na mpaghara njikọụzọ Aroma dịkwa n'otu okporoụzọ ahụ, o wee si ebe ahụ wee kwòró ọsọ wee bịa na njikọụzọ Kwata, wee gwerikọọ ma kwọrikọọ ndị mmadụ na ụgbọala kwụ n'ahịrị ebe ahụ wee na-eche ka o ruo oge nke ha iji gafèé.

Ndị ahụ bụ ndị ọnọmgbeomere kwukwàrà na onye na-anya ụgbọala ahụ sarụrụ ma pụọ n'ikùkù, nke na o nweghịzịkwa onye hụrụ ya anya ọzọ ngwangwa ihe mberede okporoụzọ ahụ mere. Nke a, dịka ha siri kọwaa, mèzịrị ka ndị nọ ebe ahụ jiri iwe na ọnụma wee mụnye ma gbaa ụgbọala ahụ ọkụ ozigbo, ya na ehi niile nọ n'ime ya oge ahụ.

Ka onye ntaakụkọ anyị ruzịrị n'ebe ahụ n'echi ya, a hụzịrị ka ndị mmadụ ji mma wee na-egbukara ma na-ebèkara anụ ehi ka ọ gbara gụọ ha, n'ihi na ọkụ agbagbuola ehi niile ahụ; anụ wee dọrọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484