Ndị Uweojii Anambra Ejidela Onye Ji Egbe Apụnara Mmadụ Ụgbọala n'Ike

Mar 2, 2021 - 07:05
Mar 2, 2021 - 08:10
 0
Ndị Uweojii Anambra Ejidela Onye Ji Egbe Apụnara Mmadụ Ụgbọala n'Ike

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii steeti Anambra anwụchiela otu nwoke ji égbè apụnara ndị mmadụ ụgbọala n'Awada dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti ahụ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti Anambra, bụ CSP Haruna Mohammed bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ n'Awka, ma bụrụkwa nke o sitere na ya mee ka a mara na ya bụ nwoke bụ Maazị Chidi Anieke gbara ahọ iri atọ ma bụrụkwa onye obodo Mbu dị n'okpuru ọchịchị Isiuzo nke steeti Enugu.

O mere ka a mara na nwoke ahụ nọrọ n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Jenụwarị wee pụnara otu nwoke ụgbọala Toyota Corolla ya na mpaghara 'Independence Layout' dị na steeti Enugu oge onye ahụ bu ụgbọala ahụ ala be ya. O wee buruzie ụgbọala ahụ gaa ebe obibi ya dị n'Awada n'enweghị nsogbu ọbụla, wee ruzie ugbua aka ndị uweojii kpààrà ya.

Maazị Mohammed mere ka a mara na a napụtara nwoke ahụ ụgbọala ahụ (nwéré ákàrà ENU 269 PH), ma napụtakwa ya otu nsụnsụ égbè nwere ọnụ abụọ na mgbọ egbe asaa.

Dịka ọ na-akpọku ndị mmadụ ka ha na-akpọtụrụ ha ha oge ọbụla ha hụtara ọnọdụ ntụmadụ dị añáà, o mere ka a mara na a ka na-eme nnyòcha banyere okwu ahụ, nke mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe.

O kwekwazịrị nkwà na ndị uweojii steeti ahụ dị ezi njikere inye ụmụafọ steeti ahụ ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà, ma rịọkwazie ezi njikọaka ọhaneze.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484