Ndị Uweojii Anambra Ejidela Nwaanyị Chọrọ Ire Nwa Ya N150, 000 Maka Agụụ

Nov 25, 2020 - 16:07
Jan 30, 2021 - 16:07
 0
Ndị Uweojii Anambra Ejidela Nwaanyị Chọrọ Ire Nwa Ya N150, 000 Maka Agụụ

Izunna Okafor

Ndị ọrụ uweojii n'ime steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee nwụchikọọ otu nwaayị maka ịkpa nkàtà ire nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ ego dị otu narị puku naịra na iri ise (N150,000) n'ihi agụụ na ihe isi ike.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ SP Haruna Mohammed, bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti Anambra, bụ onye kụpụrụ ozi na nsonso a bànyere arụrụala ahụ na mnwụchi ahụ a nwụchiri ya bụ nwaanyị.

Dịka o siri kọwaa, nwaanyị ahụ, bụ Emila Sunday (kwúrú na ya dị ahọ iri abụọ na otu) bụ onye steeti Akwa Ibom, ma bụrụkwa onye aka ndị uweojii kpààrà n'Ojoto, dịka ọ na-akpà nkìtà ire obere nwa ya nwoke gbara naanị ọnwa atọ. O mere ka a mara na ọ bụ oge ndị uweojii nwetara ozi banyere nke ahụ, ka ha wụchàrà n'ebe ahụ ma nwụchie ya. 

O kwukwara na oge a gbara ya ajụjụ ọnụ, na ya bụ nwata nwaanyị kwuru na ọ bụ maka ihe isi ike, ụbịam na agụụ ka o jiri chọọ ire nwa ya ahụ, ka o wee hụ ego ọ ga-eji zọọ isi onwe ya ma bàkwárá onwe ya úrù.

Otu ọ dị, ndị uweojii napụtara nwatakịrị ahụ n'aka nne ya, ma ahụ zùkwàrà ya oke. Ha abụọ nọzịkwà n'aka ha bụ ndị uweojii ugbua, ebe nnyòcha ka na-agakwa n'ihu iji chọpụta ihe ndị ọzọ e kwesiri ịma bànyere okwu ahụ, nke mgbe e mechaara ya, a marazie ọnọdụ a ga-edebe ya bụ nwaanyị na nwa ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.