Ndị Uweojii Anambra Anwụchiela Mmadụ Atọ Maka Òtù Nzuzo

Mar 25, 2021 - 08:46
 0
Ndị Uweojii Anambra Anwụchiela Mmadụ Atọ Maka Òtù Nzuzo
Ndị Uweojii Anambra Anwụchiela Mmadụ Atọ Maka Òtù Nzuzo


Izunna Okafor dere akụkọ a

N'ịga n'ihu n'agha ahụ ọ na-ebu megide arụrụala na ndị omèkóòmè, ndị uweojii steeti Anambra anwụchiela mmadụ atọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo n'ime steeti ahụ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ.

O kwuru na ndị otu nzuzo ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo enyo na aka ha dị n'ogbugbu e gburu mmadụ abụọ a maghị ndị ha bụ.

Dịka o siri kọwaa, ọ dị ncheta na ndị otu nzuzo a maghị ndị ha bụ nọrọ n'abalị iri abụọ nke ọnwa Maachị ahọ a wee gbagbuo mmadụ abụọ n'Ọkịjà dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala. N'ihi nke ahụ, ndị uweojii steeti Anambra malitere tinyebe ime nnyocha iji chọpụta ndị ọ bụ ha kpara arụ ahụ, iji nwụchikọọ ha.

N'ịgbasò nke ahụ, ha nwụchikọrọ ndị ahụ, nke gụnyere Ekene Ezeokalo M (gbara ahọ iri na iteghete, ma bụrụ onye Ụkpọr dị n'okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra); Emeka Iwuzor (gbara ahọ iri atọ, ma bụrụ onye obodo Umuduru Ezia Ihiala dị n'okpuru ọchịchị Ihiala) na Chigozie Ohanaziem (gbara ahọ iri abụọ na asaa, ma bụrụ onye obodo Ogboro Umunwaji Ihiala). 

Dịka ọ gara n'ihu kọwaa, DSP Tochukwu mere ka ndị omekoome a ka e kwuru na ha ejirila ọnụ ha sàá asịsà na ha bụ ndị òtù nzuzo, ma bụrụkwa ndị gbagburu mmadụ abụọ ahụ. 


N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, ndị uweojii steeti ahụ nọkwara na nsonso a oge ha na-eme ngagharị n'Abagana dị n'okpuru ọchịchị Njikọka, wee nwụchikọọ ụfọdụ mmadụ ndị ji IEDs agbaghị agba, bụ nke ha chọrọ ire n'ahịa dịka akpakara igwe. Ndị uweojii ahụ jidere ndị ahụ ma napụta ha ihe ahụ, ma nyefèkwazie ha n'aka ngalaba 'Explosives Ordinance Department (EOD)' maka ime nnyocha miri èmì banyere nke ahụ.

Ihe dị iche iche e nwekọtara n'aka ndị ahụ gụnyere otu nsụnsụ égbè na akụrụngwa ogbunigwè ahụ agbaghị agba.

N'okwu ya banyere njide ahụ e jidere ndị ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Monday Kuryas kọwara njide ahụ e jidere ndị ahụ dịka nke dabara adaba n'ezi mbọ ahụ ha na-agba n'ibu agha megide mpụ na arụrụala, ya na ịchụ ndị omekoome ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ.

O kwere Ndị Anambra nkwà na ha ha ga-aga n'ihu inye ha ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà, ọbụladị dịka o kelere ọchịchị steeti ahụ maka ezi nkwàdo ọ na-enye ha bụ ndị ọrụ nchekwa n'ime steeti ahụ iji rụọ ọrụ ha nke ọma.

Ọ kpọrọ òkù ka e jigide ma kwàlite ezi njikọaka ahụ dị n'etiti ndị ọrụ nchekwa na ọhaneze steeti ahụ, ma nye ndụmọdụ ka onye ọbụla hụtara ajọ ọnọdọ a na-enyo enyò maọbụ nwee ihe mberede dakwasara ya, kpọtụrụ ha bụ ndị uweojii n'akara 112 maọbụ 09039194332, ka e wee gbatara ya ọsọ enyemaka aka-ọkụ aka-ọkụ.
 
Ndị omékóòmè ahụ e jidere ka e mere ka a mara na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyòcha banyere arụrụala ha, bụ ebe a ga-anọ wee kpebie ma nye ha ọnọdụ ruru ha, dịka ihe ha mere siri dị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484