Ndị Uwe Ojii Anwụchikọọla Ndị Ntọrọ Mmadụ Atọ n'Anambra

Feb 13, 2020 - 01:31
Jan 24, 2021 - 01:14
 0
Ndị Uwe Ojii Anwụchikọọla Ndị Ntọrọ Mmadụ Atọ n'Anambra

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọ bụrụ na a pịaghị ngwèrè ụtàrị, ọ naghị ama na ọ gbà ọtọ. Ka ọ dị taa, ndị uwe ojii steeti Anambra awakpòla ma nwụchikọọ mmadụ atọ a na-enyo enyò na ha bụ ndị ntọ.
Ọ bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Harụna Mọhammed mèrè ka ụwa mara nke a n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ n'Awka, n'aha onyeisi uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abang.

Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, mmadụ atọ ahụ, bụ Maazị Onyemaechi Anịobi gbara ahọ iri abụọ na atọ; Maazị Elochukwu Okudo gbara ahọ iri abụọ na ise, na Nwaada Pauline Elechi gbara ahọ iri abụọ na anọ tọọrọ ótù nwata nwaanyị gbara ahọ iri na anọ n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Jenụwarị ahọ a, wee buru ya ga dobe n'ebe mmadụ amaghị.

Ha zitèèrè nne na nna nwata ahụ ozi n'abalị iri atọ nke ọnwa Jenụwarị, wee kwuo na a ga-akwụnyere ha nde naịra iri n'akàrà ụlọakụ First Bank 3120904371 tupuu ha atọhapụ ya bụ nwata. Ma ha mechaziere na-amazụrị nwata ahụ, ma na-erikwa ya ọkọmbọ ihu na azụ, wee na-eche mgbe a ga-akwụnyere ha ụgwọ.

Ka o sila dị, okechi dabidòrò ha bụ ndị arụrụala n'abalị asatọ nke ọnwa Febụwarị dịka ndị uwe ojii Anambra wakpòrò ma nwụchikọọ ndị ahụ n'ebe nzuzo ha dị n'Ogidi, n'okpuru ọchịchị ime obodo Idemili North, ma zọpụtakwa nwata ahụ.

Najụjụ ọnụ a gbàrà nne nwata nwaanyị ahụ a tọọrọ, bụ Oriakụ Ụkamaka Onyeji kwùrù na nwa ya nwaanyị làrà ụlọ akwụkwọ ya, bụ ebe o bì ebi n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Jenụwarị; ma, ka o rùrù abalị iri na atọ nke ọnwa ahụ, onye nlekọta nwata ahụ n'ụlọ akwụkwọ ahụ kpọrọ ya n'ekwentị ma gwa ya na nwa ya anọghịzị n'ebe ahụ, nke mezịrị ka ha malitezie chọgharịba ya ọhịa na ụzọ.

Ọ sịkwa na ka ọ gachara ụbọchị ole na ole ndị ahụ zitechaara ya ozi ka ọ kwụnyere ha nde Naịra iri ahụ, na ha zitèkwaara ya ozi ọzọ, sịzie ya kwụnye puku Naịra iri isii, maọbụ ha agbagbuo nwa ya. O kwùrù na ha dọkwàrà ya aka na ntị ka ọ ghara ikwe ka ndị uwe ojii mara bànyere ọnọdụ ahụ ọ nọ na ya oge ahụ, n'ihi na nke ahụ ga-eme ka ọnọdụ kawanyere ya njọ.

Otu ọ dị, o kèlèzịkwara ndị uwe ojii maka ọrụ ha n'ịnwụchikọ ndị omekoome ahụ na n'ịzọpụtarà ya nwa ya na ndụ.

Maazị Mọhammed kọwazịrị na a kpọrọla ya bụ nwata nwaanyị gaa ụlọ ọgwụ bụ ebe a nọrọ wee lelee ya àhụ ma na-enyekwa ya ọgwụgwọ ugbu a.
Ọ sịkwa na a kà na-eme nnyòcha bànyere ya bụ okwu, ma kwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọ ikpe ma were usoro iwu kọwaara ha ihe ọkụ ji ntị oke eme.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.