Ndị UNIZIK Emeela Ịgụ Arọ, Kpọọ Oku Maka Nkwàlite Omenala Igbo

Aug 18, 2021 - 20:20
 0
Ndị UNIZIK Emeela Ịgụ Arọ, Kpọọ Oku Maka Nkwàlite Omenala Igbo

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ndị Igbo ka ha gbaa mbọ na-echekwaba ma na-akwalite omenala dị iche iche e jiri mara ndị Igbo, ma na-emesikwa ya ike.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Obianọ bụ ya kpọrọ oku a na mmemme Ịgụ Arọ a chịkọbara site n'aka òtù a maara dịka 'Directorate of Igbo Village and Centre for African Civilization' nke mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka, site na njikọaka ya na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe na-eme na mba òfèsi, ihe e ji aka emepụta, omenala na njem nlegharịanya na steeti ahụ.

Nnukwu mmemme ahụ wééré ọnọdụ na nsonso a dọtara ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na steeti ahụ, ndị na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ ihe gbasaara omenala Igbo na-amasị. A nọkwara na mmemme ahụ wee wepute ma kpughee agụmagụ ahọ Ndị Igbo (Igbo calendar) ọhụrụ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Obianọ, nke ọ bụ Kọmaishọna na-ahụ maka ihe na-eme na mba òfèsi, ihe e ji aka emepụta, omenala na njem nlegharịanya na steeti ahụ, bụ Maazị Ken Anịerobi nọchitere anya ya na mmemme ahụ mere ka a mara na ọ bụ ọrụ dịịrị onye Igbo ịkwàlite asụsụ na omenala Igbo.

O kelere ndị chịkọbara mmemme ahụ maka Ógbè Ndị Igbo (Igbo Village) ha na-arụ na mahadum ahụ, kpọpụtasịa uru dị iche iche nke ahụ ga-abà na etu ọ ga-esi nye aka n'ịkwàlite njirimara na omenala Igbo, ma kwe nkwà inye nkwàdo maka nke ahụ.

N'okwu nke ya na-ebe ahụ, eze ọdịnala Enugwu-ukwu, bụ Igwe Ralph Ekpeh kọwara na Ịgụ Arọ bụ ihe nke mmụọ, ma bụrụkwa mmemme a na-eme kwà ahọ ọbụla iji buo amụma maka ahọ ọhụrụ na etu ọ ga-esi wee gaa.

Na mbụ n'okwu mmalite ya, onyeisioche mmemme ahụ, bụ Maazị Rommy Ezeonwuka, nke ọ bụ  Maazị Jude Masscot Obiagwu nọchitere anya ya kọwara mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma mee ka a mara na ụdị ọmarịcha mmemme dị etu ahụ dị oke mkpà n'ihi na ọ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ime ka ụmụ na-eto eto mara maka ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere omenala Igbo.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, onye gbapere amụmà ịchụ nta ego na mmemme ahụ, bụ Dọkịta Godwin Madụka, na onyeisi Mahadum Unizik, bụ Ọkammụta Charles Esimone tinyere olu wee dụọ ndị Igbọ ọdụ ka ha na-echekwaba njirimara ha, ka ha we ghara ifunàhị ha.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi òtù 'Igbo Village and Centre for African Development' bụ Ọkammụta Bonachristus Umeogu kwuru na ọ bụ nke mbụ ha na-eme ụdị mmemme ahụ, ma gosipụtaziekwa olileanya o nwere na ya bụ mmemme ga-eme ka ndị Igbo ihe dị iche iche a na-eme n'ogige ahụ, ma malitekwa ịhụta ya dịka ebe a na-aga njem nlegharịanya na ebe a ngozobe nkà na ihe ọkpụ Igbo.

Ndị ọzọ dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyere nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ, nke ọ bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe metụtara ndị ntorobịa, bụ Oriakụ Maureen Nwakasi nọchitere anya ya; Kọmishọna na-ahụ maka ahụike, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala; onyeisi ụlọ mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service (ABS), bụ Dọkịta Uche Nworah, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

A gbakwara egwu ọdịnala dị iche iche na mmemme ahụ, ma rikwa erimeri dị iche iche e jiri mara ndị Igbo.

Ọ dị mkpa icheta na ịgụ arọ Igbo nwere ọnwa iri na atọ n'ahọ, izuụka asaa n'ọnwa, na ụbọchị anọ n'izuụka, nke bụ ahịa anọ dị n'izu (Eke, Orie, Afọr, and Nkwọ), tinyere otu mkpụrụ ụbọchị na-amapụta n'ọnwa ikpeazụ nke ngwụcha ahọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484