Ndị Ọrụ Nchekwa Egbochiela Mwakpò Ndị Omekoome Ebe APGA Na-Achụ Nta Nkwàdó

Oct 13, 2021 - 22:47
 0
Ndị Ọrụ Nchekwa Egbochiela Mwakpò Ndị Omekoome Ebe APGA Na-Achụ Nta Nkwàdó


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị omekoome nọrọ ụbọchị Tuzdee  a wee wakpò ụlọakwụkwọ 'Odoata Primary School' dị n'Ihiala, n'okpuruọchịchị ime obodo Ihiala, nke steeti Anambra, bụ ebe ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Grand Alliance (APGA)' zubere ịnọ mee mmemme achụmta nkwàdo ha maka ịzọ ọkwa Gọvanọ steeti ahụ n'ime okpuruọchịchị Ihiala.

Ndị omekoome ahụ bùrù ọtụtụ ọgbaatumtum na ụgbọala atọ, nke gụnyere Toyota Lexus 350 ES (nwere akara EKY 765 EX), ụgbọala Toyota RAV4 (nwere akara JJJ 434FP), na ụgbọala Ford Van (nke a chọpụtàghị akàrà efere ya) n'ihi na ọ màlitere ịgba ọkụ oge ndị ọrụ nchekwa na ndị omekoome ahụ na-akwàrịta mgbọ, wee bịa mwakpò ahụ.
 
Oge ha kwàrà mgbọ ahụ nkeji olenaole, ndị omekoome ahụ enweghịzị ike ịkwụdonwu maọbụ gaa n'ihu n'ịkwà ya bụ mgbọ, n'ihi na ihe ha hụzịrị karịrị ha; ha wee rie mbọmbọ, jiri ọsọ gbakpuo n'ime ogige ụlọ ahụike 'Our Lady of Lourdes Hospital', bụkwa nke dị na ncherịtaihu ebe ahụ a na-achụ nta nkwàdo.

Ndị ọnọmgbeomere kọwakwara na ndị omekoome ahụ buru ọtụtụ mmerụahụ nà àpà mgbọ wee rie mbọmbọ ahụ; ma kọwakwa na ndị ọrụ nchekwa ahụ gaara ịgbatù ha niile ma jiri egbe dulaa ha mmụọ, ma e wezuga na ha gbakpuru ebe ahụ. Ọ dị nghọta na nnukwute ihe izèndụ jupụtara n'ịgba mmadụ maọbụ ndị omekoome egbe n'ime ụlọọgwụ ebe ndị ọrịa nọ, n'ihi ọtụtụ ihe ọjọọ na ọghọm dị icheiche nke ahụ pụrụ iwètà.

Ndị ọrụ nchekwa ahụ bukọtasịkwara ụgbọala atọ na ọgbatumtum niile ndị omekoome ahụ buru wee bịa mwakpò ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu gbàrà akaebe na ihe ahụ mere eme n'eziokwu, ma kọwaa na ọ bụ oge o jiri ọkara wee gata elekere iteghete nke ụtụtụ ka ndị ahụ jiri bịa mwakpò ahụ n'ụlọakwụkwọ 'Odata Central School' dị n'akụkụ 'St. Martin's Church, Ihiala'.
 
Ọ gara n'ihu kọwaa na ihe dị icheiche ndị omekoome ahụ bihapụrụ wee rie mbọmbọ ọsọ gụnyèrè otu egbe AK 47, Magaziinu abụọ ná-ágbá ọnụ 30, otu ụgbọala 'Lexus 350 Jeep', otu ụgbọala 'Rav 4 jeep'; otu ụgbọala 'Mercedes Benz' na otu ụgbọala 'Toyota Corolla'.

O mere ka a mara na ọ bụ ndị omekoome ahụ buru ụzọ màlite ịgba egbe ozigbo ha na-abata n'ogige ebe ahụ, bụkwazị nke mere ka ndị ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ, nke gụnyere ndị uweojii na ndị ọrụ agha ala Nigeria, jiri egbe nke ha za ma gbochie ha ma nyekwa ha ọsọ.

Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ ugbua, bụ CP Echeng nyere ndị bi n'ime na gburugburu Ihiala ahụ, ya na ndị na-arụ n'ụlọ ahụike dị icheiche ndụmọdụ ka ha ledosie anya ike ịchọpụta ma weta mkpesa banyere onye ọbụla nwere mmerụahụ dịka àpà mgbọ n'ahụ ya.

:-D

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484