Ndị Ọbụabụ 'Chapel of Redemption' Enweela Ụbọchị Ụka Ukwe Nke Ahọ 2021

Jul 14, 2021 - 20:16
Jul 14, 2021 - 20:19
 0
Ndị Ọbụabụ 'Chapel of Redemption' Enweela Ụbọchị Ụka Ukwe Nke Ahọ 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kọwaala égwú dịka nri nke mkpụrụobi na ọgwụ nke uche nọ na nchekasị. 

Onyeisi ma bụrụkwa Chaplenụ nke ụlọụka 'Chapel of Redemption' nke mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka, na steeti Anambra, bụ Venerebụụl Obiorah Alokwu bụ ya nyere nkọwa a n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere mmemme ụka ndị ọbụabụ ụlọụka ahụ, nke ahọ 2021, bụ nke ha kpọrọ '2021 Choral Festival' ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọụka ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ọnụ agaghị akọchanwu mkpà égwú dị na ndụ mmadụ na uru dị iche iche ọ bàrà, bụkwazị nke mere o jiri dị ezigbo mkpà na a ga na-akwàdo ma na-abụkwa ya oge niile, ọkachasị abụ e ji eto Chineke.

O kelere ndị ọbụabụ ụlọụka ahụ maka ịdị uchu nà nkwụdosiike ha, ya na etu ha siri jiri olu ọma Chineke nyere ha wee na-efe Ya ma na-ejere Ya ozi site n'ịbụrụ Ya abụ. O kèlèkwazịrị ndị ndu òtù ndị ọbụabụ ahụ maka ọrụ nchịkọta ha, ma kelekwazie onye ọbụla tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, iji hụ na ya bụ oke ụbọchị gara nke ọma, ọbụladị dịka o kpere ka Chineke gọzie ma kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji.

Na mbụ n'okwuchukwu ya n'ofufe nro ahụ, Maazị John Ifejika chètààrà ọhaneze bịara ụka ahụ mkpà ọ dị mmadụ ịmụta ma na-agbaso ụzọ nke Chineke, ọkachasị ugbua ihe ọjọọ dị iche iche jupụtazịrị n'ụwa, ya na etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ ugbua.

Dịka ọ na-arụga aka n'akwụkwọ Abụọma, isi nke iri asatọ na isii, amaokwu nke iri na otu; Maazị Ifejika, onye isiokwu ya bụ "Zi M Ụzọ Gị Chineke" katọrọ etu ihe si agazị ugbua na ngalaba dị iche iche n'ala Nigeria, ma kpọkuzie onye ọbụla ka ọ chọọ ihu Chineke ma na-agbaso ụzọ Ya, maka na e nweghịzị ụzọ kacha mma.

N'okwu nke ya, onyeisi ndị ọbụabụ ahụ, bụ Dọkịta Oriakụ Nkechi Ọkpala mere ka a mara na ọ bụ naanị ukwe na ịbụ abụ bụ ihe a ga-emechaa n'ụwa ma mekwa ya n'eligwe; ma kpọkuzie ndị mmadụ, ọkachasị ndị ntorobịa nwere olu ịbụ abụ ka ha sonye n'òtù ndị ọbụabụ, iji site n'ụzọ etu ahụ were olu ya wee fèé ma jeere Chineke ozi.

Dịka ọ na-ekwupụta ezi olileanya o nwere mmemme ahụ nke ahọ na-abịa abịa ga-amakarị nke ahọ a, ya bụ onyeisi ndị ọbụabụ kèlèrè Venerebụụl Alokwu, isi ọchịchị ụlọụka ahụ, ndị òtù ya na ndị ọzọ jere ozi maọbụ tụnye ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ya bụ mmemme gara nke ọma.

Ya bụ mmemme dọtàrà ọtụtụ ndị dị iche iche ịbụ abụ na-amasị, nke gụnyere Ọkammụta Alvan-Ikoku Nwamara nke mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ bịara iji anya ha hụ ka ya bụ óké mmemme siri gaa.

A nọkwazịrị na mmemme ịka ụka ahụ wee bụọ ọtụtụ abụ olu ọma dị iche iche site n'aka ndị ọbụabụ ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484