Ndị Nta Akụkọ Agaala Njem Nleta n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Oct 14, 2021 - 21:41
 0
Ndị Nta Akụkọ Agaala Njem Nleta n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ adụọla ndị nta akụkọ ọdụ ka ha bụrụ ndị na-agbaso usoro kwesiri ekwesi wee na-arụ ọrụ ha, site n'itinye ọzụzụ e nyere ha n'ọrụ, ya na ikwu nke bụ eziokwu, ọkachasị dịka o siri metụta ikwupụta ihe dị icheiche ọchịchị ya mepụtagoro na steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ nyere ndụmọdụ a n'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ steeti Anambra oge ha gara njem nleta ịmara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ ọchịchị ya na-arụ ọdụ ụgbọelu mba ụwa Anambra (a maara dịka 'Anambra International Cargo and Passenger Airport'), bụ nke a na-arụ n'Ụmụeri, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East'.

E wezuga ndị òtù ahụ jikọtara ndị nta akụkọ ('Nigeria Union of Journalists, NUJ', ngalabaa steeti Anambra) ndị ọzọ dị icheiche sonyere na njem nleta ahụ gụnyere Kọmishọna ndị uweojii ahụ e wètara ọhụrụ n'Anambra, bụ CP Echeng Echeng; ndị òtù 'Radio Television, Theatre and Arts Workers Union (RATTAWU)' ngalaba steeti Anambra.
 
Ọ bụkwazị Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Marcel Ifejiofor nà ògbò ya nke na-ahụ maka ewumewu ụlọ, bụ Maazị Mike Okonkwo nabàtàrà ma dugharịa ndị ahụ n'ogige ọdụ ụgbọelu ahụ

Ebe dị icheiche e dugharịrị ndị ahụ n'ọdụ ụgbọelu ahụ gụnyere runway, terminal building, tarmac, fire station, trauma center, foyer, main auditorium, na ọtụtụ ebe ndị ọzọ.

N'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ahụ n'ebe obibi ya dị n'Amawbia, Gọvanọ Obianọ dụrụ ha ọdụ ka ha bụrụ ndị na-ekwu eziokwu oge niile site na mgbasaozi ha; ọbụladị dịka o kwere nkwà na ọ ga-arụchapụ ọrụ dị icheiche o ji n'aka na steeti ahụ tupu ọ rịtuo n'ọkwa ọchịchị n'ahọ ọzọ. O kwere nkwa na ọ bụkwa n'ụlọ ezumeezu mba ụwa ahụ ọchịchị ya na-arụkwa n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ ka a ga-anọ wee mee mmemme inyefè ọkwa ọchịchị n'aka onye nke ga-abata abata n'ahọ ọzọ.

Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ ihe dị icheiche ọchịchị ya mepụtasigoro, ma kwupụtakwa olileanya o nwere na Ọkammụta Chukwuma Soludo ga-enweta mmeri na nhọpụta ahụ a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a, bido ebe ọ kwọsịrị, ma mekwa nke ọma karịa ya.

N'okwu nke ha n'otu n'otu n'ebe ahụ, Osote Onyeisi òtù NUJ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, bụ Maazị Emma Ifesinachi; na onyeisi òtù RATTAWU n'ụlọ mgbasaozi ABS, bụ Oriakụ Maureen-stone Enujioke kelekwazịrị ma jaa Gọvanọ Obianọ ike maka agadaga ọrụ ọdụ ụgbọelu ahụ na ọrụ ndị ọzọ ọ rụgoro na ndị nke ọ ka na-arụ arụ n'ime steeti ahụ, bụkwazị nke megoro ka steeti ahụ bụrụzie ejiamaatụ. 

Ụfọdụ ndị nta akụkọ ndị ọzọ kwuru okwu n'ebe ahụ kèlèkwara ma kpọkuzie ya bụ Gọvanọ ka o jisie ike n'ọrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484