Ndị Idemili Emeela Emume Ụbọchị Idemili nke Ahọ 2021

Oct 3, 2021 - 20:38
Oct 3, 2021 - 20:41
 0
Ndị Idemili Emeela Emume Ụbọchị Idemili nke Ahọ 2021

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ụmụafọ Idemili jiri oke ọñụ wee mee mmemme Ụbọchị Idemili nke ahọ 2021.

Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ezumezu 'Eziowelle Civic Center' dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a chịkọbara site n'aka òtù Nzuko Ime-obi Idemili, nke jikọtara obodo iri na asaa mejùpụtàrà okpuru ọchịchị 'Idemili North' na 'Idemili South' nke steeti Anambra.

N'okwu ya na mmemme ahụ, eze ọdịnala obodo Ojoto, bụ Igwe Gerald Mbamalụ, kọwara mmemme  dịka oke mmemme pụrụ iche ụmụafọ Idemili na-emerube na mgbe na mgbe ma bụrụkwa nke na-akpọkọlọta ụmụafọ sitere obodo iri na asaa dị n'okpuru ọchịchị abụọ mejupụtara Idemili. 

O mekwara ka a mara na nke ahụ bụ agba nke atọ a na-eme mmemme ahụ, kọwakwa na a na-anọ na ya bụ mmemme wee na-egosipụta ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo, ọkachasị ihe e jiri mara Idemili.

A nọkwara na mmemme ahụ wee nye onyinye nkwanyeugwu dị icheiche na echichi ọdịnala nyegara ụmụafọ Idemili na-eme nke ọma na ngalaba ha dị icheiche nà ndị e nyochagoro ma hụta ha dịka ndị kwesiri ekwesi inye ya bụ nkwanyeùgwù na echichi ọdịnala, n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ ha mere.

Otu onye n'ime ndị e chibere echichi ọdịnala ụbọchị ahụ, bụ Maazị Emmanuel Okafor, bụ onye e nyere echichi dịka Igwulube Idemili, n'ihi ọrụ enyemaka na ọrụ obi ebere dị icheiche ọ rụgoro, ya na ụzọ dị icheiche o sigoro nyere ụmụ mmadụ aka ma tụnyekwa ụtụ na mmepe obodo ya bụ Ojoto, na Idemili n'izugbe.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Maazị Okafor, onye bụ nwa afọ Ojoto ma bụrụkwa onye na-azụ ahịa a mà àma, kelere ndị Idemili na eze ọdịnala obodo iri na asaa dị n'Idemili maka ịhụta ya dịka onye tozuru oke na onye kwesiri ekwesi, wee gbakọọ aka chie ya echichi ahụ.

Dịka ọ na-enyekwa Chineke ekele maka ịgọzi ya na isikwa n'aka ya na-agọzi ndị ọzọ, ya bụ nwa amadi kwere nkwà na ọ ga-aga n'ihu ịkwàdò ụmụ mmadụ na ịtụnye ụtụ nke ya mmepe obodo, site n'inye aka Chineke.

A nọrọ na mmemme ahụ rie ma ñụọ, mee ihe ngosi, ma gbakwa egwu ọdịnala dị icheiche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484