Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Ngosipụta Ihe A Kọrọ n'Ugbo, Nye Ihe Nrita

Sep 7, 2021 - 21:47
 0
Ndị Enugwu-Ukwu Emeela Ngosipụta Ihe A Kọrọ n'Ugbo, Nye Ihe Nrita

Izunna Okafor dere akụkọ a


A kpọkuola ma dụọ ọhaneze ka ha na-esonyesi ike n'ịkọ ọrụ ugbo, n'ihi ọtụtụ uru dị icheiche dị na nke ahụ na-eweta.

Eze ọdịnala Enugu-Ukwu, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti Anambra, bụ Igwe Raph Ekpe bụ ya kpọrọ òkù a ma nye ndụmọdụ a na mmemme a chịkọbara na nsonso a n'obodo ahụ, iji gosipụta ihe dị icheiche ụmụafọ obodo ahụ kọpụtara n'ugbo n'ahọ a.

Mmemme ahụ wééré ọnọdụ n'Obu Ụmụnri Enugwu-Ukwu dọtàrà ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee gosipụta ihe dị icheiche ndị ọrụ ugbo obodo ahụ wèpụtasịrị n'ugbo ha, nke gụnyere ji, unèrè/ojoko, akwụkwọnri, ọka, tinyere ọtụtụ mkpụrụosisi ndị ọzọ dị iche iche.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Igwe Ekpeh kọwara na mmemme ahụ bụ nke ha na-eme kwà ahọ ọbụla, ma kọwakwa na ọ bụ mmemme asọmpi ha si na ya wee achọpụta ndị ugbo ha kachara mepụta ihe buru ibu, ma nyekwa ha ihe nrita dị icheiche, dịka ihe agbamume. 

Dịka ọ na-akọwa na nke ahọ a bụ àgbà nke asaa mmemme asọmpi ahụ, o kwukwara na ọ bụ mmemme ahụ ka a na-emechaa tupu e mee Olili Ọnwa Asatọ, bụkwa nnukwu mmemme ọzọ obodo ahụ na-eme, nke eze ọdịnala obodo ahụ ga-emecha tupu ndị mmadụ ebido ime nke ha n'ezinụlọ ya dị iche iche.

Ya bụ eze ọdịnala nọkwazịrị na mmemme ahụ wee bunye onye gbara onye nke mbụ n'asọmpi ahụ kpọchakpọcha ọgbatumtum ọhụrụ, nyekwa ndị ọzọ ihe onyinye dị icheiche dịka ihe nrita. 

N'okwu nke ha n'otu n'otu, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Bonny Ozo Nkwuaku na osote onyeisioche òtù na-ahụ maka mmemme ahụ, bụ Maazị Nze Nwabueze Akabuogu, kelere Chukwu maka etu ya bụ mmemme si aga kemgbe ọtụtụ ahọ, na etu ala Enugwu-Ukwu na ụmụafọ obodo ahụ si emepụta nri gbaanyụụ, ma dụọ ndị ọzọ ka ha ñomie ha.

Ụfọdụ ndị ọrụ ugbo sonyere n'asọmpi ahụ gosipụtara obi ụtọ ya banyere etu o siri gaa, gbaa akaebe banyere ezi ihe dị icheiche ọrụ ugbo megoro na ndụ ha na na ndụ ezinụlọ ha, ọbụladị dịka ha kelèzịkwara eze ọdịnala obodo ahụ na ndị ọzọ nyere aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ n'ịhazi ihe mmemme ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484