N'Anambra, RUWASSA Na UNICEF Azọpụla Ụkwụ Ịkwalite Ọnọdụ Adịmọcha

N'Anambra, RUWASSA Na UNICEF Azọpụla Ụkwụ Ịkwalite Ọnọdụ Adịmọcha

Nov 26, 2020 - 00:43
Jan 19, 2021 - 00:44
 0
N'Anambra, RUWASSA Na UNICEF Azọpụla Ụkwụ Ịkwalite Ọnọdụ Adịmọcha

By Izunna Okafor

A kpọọla oku ka a kwụsị ịrụ arụrụ nsị, bụ ịnyụ nsị n'ọhịa nakwa n'ebe ndị ọzọ ghe oghe, ma kọwaa mkpa ọ dị mmadụ ịkwàlite ezi ọnọdụ adịmọcha na gburugburu ya oge niile.

Nke a bụ isi sekpụ ntị ma bụrụkwa okwu a kpụ n'ọnụ na nnukwu ọgbakọ a chịkọbara na nsonso a n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra site n'aka ụlọọrụ 'Anambra State Rural Water Supply and Sanitation Agency' (RUWASSA) na njikọaka òtù 'United Nations International Children’s Emergency Fund' (UNICEF), 

Ya bụ oke mmemme bụkwa nke a nọrọ na ya wee guzobe òtù pụrụ iche maka atụmatụ nkwalite adịmọcha 'Water, Sanitation and Hygiene' (WASH), bụ òtù a kpọrọ 'Interministerial Steering Committee on Water, Sanitation and Hygiene'.

N'okwu ya na mmemme ahụ wééré ọnọdụ nsonso a, Kọmishọna na-ahụ maka ihe e ji enyere ndụ aka na steeti Anambra, bụ Maazị Emeka Ezenwanne mere ka a maragasịa ihe dị iche iche ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ megoro iji kwalite ezi ọnọdụ adịmọcha ma hụkwa na e nwere ezi mmiri ọñụñụ na gburugburu niile nke steeti ahụ, ọkachasị site n'ịgbapu mmiri ọñụñụ na ịrụ ụlọ mposi n'ebe dị iche iche, dịka ahịa, ụlọakwụkwọ, na ebe ndị ọzọ, tinyéré ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ o si akwalite ezi ọnọdụ adịmọcha.

Dịka ọ na-akọwa na inwe ezi mmiri ọñụñụ oge ọbụla ka so n'otu ihe siri ike omume na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria ruo taa, Kọmishọna Ezenwanne mere ka a mara na otu ọrụ ahụ e guzobere nà mwulite ahụ a na-ewulite ihe gbasaara atụmatụ WASH na steeti ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche imezupụte atụmatụ otu mba ụwa ahụ a kpọrọ 'Sustainable Development Goals (SDGs), nke otu n'ime ha bụ ịhụ na a kwụsịrị ịrụ arụrụ nsị, ịnyụ nsị n'ọhịa nakwa n'ebe ndị ọzọ ghe oghe, tupu ahọ 2025.

N'okwu nke ya oge ọ na-eguzobe ndị òtù ọrụ ahụ ma na-agbapekwa ọgbakọ ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kọwara mmemme ahụ na atụmatụ ahụ dịka nke dị oke mkpa n'ihi na adịmọcha bara oke uru ma bụrụkwa ụzọ pụtakarịchara ihè a pụrụ isi gbanahị maọbụ merie ụdị ọrịa dị iche iche, ọkachasị n'ime oge a ọrịa nje korona ka na-ebi ụwa aka ọjọọ.

Ọ kpọkukwazịrị onye ọbụla ka ọ na-edebe gburugburu ya ọcha ma na-akwalitekwa ezi ọnọdụ adịmọcha n'ebe ọbụla ọ hụtara onwe ya, maka na ọ bụ onye dị ọcha na-anọdobe Chineke nso.

Na ntụnye ha n'otu n'otu, onyeisi atụmatụ 'Water, Sanitation and Hygiene' (WASH), bụ Oriakụ Mamita Bora, na otu onye e ji okwu ya agba izu na UNICEF, bụ Maazị Timeyin Uwejamomere kelere ọchịchị Gọvanọ Obianọ maka ntụnye dị iche iche o megoro n'ihe gbasaara adịmọcha, ma kpọọ oku ka e nwekwuo njikọaka n'etiti ụlọọrụ na òtù dị iche iche n'ihe gbasaara nkwalite adịmọcha, ọkachasị n'ime obodo dị iche iche nakwa n'ebe ndị ọzọ mepere emepe, maka na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ.

Oke mmemme ahụ dọtara ọtụtụ Kọmishọna nakwa ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ na mpụga ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.