N'Anambra, Onye Tipà Akụgbuola Onye Ji Ụkwụ Agara Onwe Ya

Dec 16, 2020 - 16:59
Jan 30, 2021 - 17:00
 0
N'Anambra, Onye Tipà Akụgbuola Onye Ji Ụkwụ Agara Onwe Ya

Izunna Okafor

Anyammiri wàrà na nsonso a na steeti Anambra, dịka ihe mberede okporo ụzọ dapụtara na steeti Anambra ma taa isi otu onye, ọbụladị ugbua ọ fọdụrụ mkpụrụ ụbọchị olenaole ka a gbaa ekeresimeesi.

Dịka ozi si n'aka SRC Florence N Edor bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi n'ụlọọrụ FRSC ngalaba steeti Anambra siri kwuo, ya bụ ihe mberede mèrè n'ụzọ awara-awara ahụ siri Onisha gaa Owerri, ma bụrụkwa nke dapụtàrà oge onye na-anya Tipa gbàrà ụzọ aka ekpe, bụ ebe o kwesighị ịgba; o wee jiri ọsọ kụtuo ma kụgbuo otu nwoke mmadụ ji ụkwụ agara onwe ya.

Ya bụ nwoke Tipa ahụ kụgburu ka e kwuru na o siri na Keke wee rịtuo ozigbo ahụ, ma lechaa anya n'aka nri (o leghị n'aka ekpe, n'ihi na ọ tụghị anya na ụgbọala ọbụla ga-esi ebe ahụ na-abịa, dịka n'iwu na-achị okporo ụzọ siri dị), ọ chọzie ka o jiri ọsọ gbafèé etiti iro ahụ gaa n'ofè nke ọzọ, nnukwu ụgbọala ahụ wee si ebe ahụ a tụghị anya pụta ozigbo, wee pịachara ya, ma pịagbuo ya ozigbo ozigbo ahụ.

Mmadụ atọ ka ya bụ ihe mberede okporo ụzọ metụtara, nke gụnyere nwa amadi ahụ nwụrụ anwụ, bụ onye ndị ọrụ uweojii nọ na mpaghara ebe ahụ bùùrù ozigbo wee gaa n'ụlọ ahụike Toronto dị n'Ọnịsha ahụ, bụ ebe Dọkịta nọrọ lelechaa ya ahụ, wee kwuo na ọ nwụọla; nke bụ ụzụ akwa wee tụọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Andrew A. Kumapayi kasiri ezinụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ obi, ma kpekwa ka Chineke nara mkpụrụ obi ya na ndokwa.

Ọ dọrọ ndị na-anya ụgbọala aka na ntị megide mmadụ ịgba ebe o kwesighị ịgba nà ịgba oke ọsọ, ma dọkwa ndị ji ụkwụ aga aka na ntị ka ha na-esi n'elu ebe e mebeere ndị jị ụkwụ, ma kwụsị isi n'etiti okporo ụzọ were agbafè n'ihi na nke ahụ jupụtara n'ọtụtụ ihe ize ndụ dị iche iche, ma na-ewetekwa ọnwụ ike.

O mekwara ka a mara na onye ọbụla e nwetara ka ọ dàrà iwu ahụ maọbụ iwu ndị ọzọ na-achị okporo ụzọ ga-abụ onye a ga-anwụchikọ ma nye ya ntaramahụhụ kwesiri ya, maka na ọ na-abụ Ụlaga apịaghị ụtarị, ụmụaka anaghị ama na ọ bụ mmanwụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.