N'Anambra, Nnukwu Ụgbọala Bu Mmanụ Agbaala Ọkụ, Gbuo Mmadụ Abụọ

Aug 17, 2021 - 20:24
 0
N'Anambra, Nnukwu Ụgbọala Bu Mmanụ Agbaala Ọkụ, Gbuo Mmadụ Abụọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nnukwu ihe ọdachi dị égwù dapụtara n'Ogidi dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra, dịka otu nnukwu ụgbọala bu mmanụ ọkụ dàrà wee binwuru ọkụ, bibisiekwa ọtụtụ ihe.

Dịka akụkọ siri kọọ, ihe mberede ahụ bụ nke dapụtara na mgbede ụbọchị ụka, ma bụrụkwa nke mere na mpaghara nnukwu ahịa mba ụwa ahụ na-ere akụrụngwa e ji arụ ụlọ a maara dịka 'International Building Materials Market, Ogidi' oge nnukwu ụgbọala ahụ bu mmanụ danyere n'olulu, mmanụ ọkụ o bu wee wụfuo n'ala.

Ndị ọnọmgbeomere kwuru na mmadụ abụọ nwụrụ n'ihe mberede ahụ, ebe ọkụ ahụ gbarikọkwara ụgbọala ruru iri na anọ n'ọnụọgụgụ, tinyere ngwaahịa gburu ego ruru nde kwuru nde naịra na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọkụ ahụ gbarikọrọ.

Na nkọwa ya, otu onye bi na mpaghara ebe ahụ, bụ Maazị Uche Michael kwuru na ụgbọala ahụ bu mmanụ ọkụ kwụ akwụ n'ebe ahụ, wee ruo mgbe otu nnukwu ụgbọala ọzọ jiri ọzọ ga suo ya, mpaghara ebe ahụ niile wee ghọọ ọkụ mmụọ ozigbo, nke na ihe niile dị nso ebe ahụ gbara ọkụ. O kwukwara na ọkụọgbụgba ahụ dị ukwuu, nke mezịrị o jiri hịa ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ ahụ ịgbanyụ ha.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi nsọnyụọkụ steeti Anambra, bụ Maazị Martin Agbili gbara akaebe na ihe ahụ mèrè n'eziokwu ma gbakwa akaebe na mmadụ abụọ nwụrụ n'ihi ya bụ ọdachi, ebe ụgbọala iri na anọ gbakwara ọkụ, tinyere ego ruru nde kwuru nde naịra ọkụ bibiri n'ụdị ngwaahịa.

Dịka ọ na-akọwa na o zigara ndị ọrụ ya ozigbo ozigbo ha nwetara ozi bayere ọkụọgbụgba ahụ, o kwuru na ọkụ ahụ kaara imebisikwu ọtụtụ ihe n'ebe ahụ maọbụ nwuru baa n'ime ahịa ahụ, ma e wezuga na ndị ọrụ ya gbatara ọsọ enyemaka n'ebe ahụ wee sọnyụọ ya bụ ọkụ. O kelekwazịrị Chineke na ha mechaara gbanyụọ ọkụ ahụ, ọbụladị dịka ọ jara ndị ọrụ ya ike.

Na ntụnye nke ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Toochukwu Ikenga kwuru na ndị uweojii gbaara ga weghara ọnọdụ ma chekwaa ebe ahụ ngwangwa ya bụ ihe mere, ka ndị omekome wee ghara iji ohere ahụ zuo maọbụ memilaa akụnụba ụmụ mmadụ n'ebe ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484